Otu Ihe Dị Ịrịba Ama Nye Ndị Hụrụ Okwu Chineke n’Anya
Nye ndị nile hụrụ okwu chineke n’anya, a rụzuru otu ihe dị ịrịba ama na 1998. N’afọ ahụ, e bipụtara nke mere ya 100 nde nke “New World Translation of the Holy Scriptures.” O siwo otú a ghọọ otu n’ime ndị a kasị kesaa n’ime Bible ndị e bipụtara na narị afọ a!
ỌRỤ a dị nnọọ ịrịba ama karịsịa n’iburu n’uche na mgbe e wepụtara nsụgharị a, a katọrọ ya nke ukwuu. Ma, ọ bụghị nanị na ọ dịgidewo kamakwa o nweela ihe ịga nke ọma, na-abanye n’ime ọtụtụ nde ebe obibi—na obi—n’ụwa nile! Olee otú nsụgharị a pụrụ iche si malite? Ònye sụgharịrị ya? Ị̀ pụkwara isi aṅaa rite uru site n’iji ya eme ihe?
N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Enwe Nsụgharị Ọhụrụ?
Ruo ihe karịrị otu narị afọ, Watch Tower Bible and Tract Society, bụ́ ụlọ ọrụ iwu kwadoro nke na-anọchite anya Ndịàmà Jehova, ekesawo Bible dị iche iche. Otú ọ dị, n’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova ji hụta ya dị ka ihe dị mkpa imepụta nsụgharị ọzọ nke Okwu Chineke? Akwụkwọ bụ́ So Many Versions?, nke Sakae Kubo na Walter Specht dere, na-ekwu, sị: “Ọ dịghị nsụgharị Bible nke a pụrụ iwere dị ka nke ikpeazụ ma ọlị. Nsụgharị aghaghị iso ọganihu a na-enwe na nkà mmụta Bible na mgbanwe ndị a na-enwe n’asụsụ na-aga ụkwụ na ụkwụ.”
Narị afọ a ahụla ọganihu dị ukwuu ná nghọta nke Hibru, Grik, na Aramaic—asụsụ ndị mbụ e ji dee Bible. Ọzọkwa, a chọtawo ihe odide Bible ndị ka ochie ma zie ezie karịa nke ndị nsụgharị Bible nke ọgbọ ndị bu ụzọ ji mee ihe. N’ihi ya, a pụrụ ịsụgharị Okwu Chineke n’ụzọ ka zie ezie taa karịa mgbe ọ bụla ọzọ! Mgbe ahụ, e nwere ezi ihe mere e ji guzobe Kọmitii Nsụgharị Bible Ụwa Ọhụrụ iji malite nsụgharị Bible gaa n’asụsụ nke oge a.
Na 1950, e bipụtara nsụgharị Bekee nke New World Translation of the Christian Greek Scriptures. Isiokwu ya n’onwe ya dịpụrụ iche n’ihe a na-emekarị, na-ajụ ịkọwa Bible dị ka nke agba “Ochie” na agba “Ọhụrụ” mejupụtara. N’ime afọ iri sochirinụ, e bipụtara akụkụ ụfọdụ nke Akwụkwọ Nsọ Hibru ná nkebi ná nkebi. Na 1961 e wepụtara Bible zuru ezu n’asụsụ Bekee n’otu mpịakọta.
Olee nnọọ ndị sụgharịrị Bible a dị ịrịba ama? Ụlọ Nche (Bekee) nke September 15, 1950, kwuru, sị: “Ndị ikom mejupụtara kọmitii nsụgharị ahụ egosipụtawo ọchịchọ ha . . . ịnọ n’ekwughị aha ha, ha achọtụghịkwa ka e bipụta aha ha n’oge ha nọ ndụ ma ọ bụ mgbe ha nwụsịrị. Nzube nke nsụgharị ahụ bụ ibuli aha ezi Chineke ahụ dị ndụ elu.” Ụfọdụ ndị nkatọ kwuru na e kwesịrị nnọọ iwere ọrụ a dị ka ihe ndị na-amaghị nke a na-akọ rụrụ, ma ọ bụghị mmadụ nile nwere echiche a ezi uche na-adịghị na ya. Alan S. Duthie na-ede, sị: “Ọ bụrụ na anyị amara ndị sụgharịrị ma ọ bụ bipụta otu nsụgharị Bible kpọmkwem, ọ̀ na-enyere anyị aka ikpebi ma nsụgharị ahụ ọ dị mma ma ọ bụ dị njọ? Ọ dịchaghị enye. Ọ dịghị ihe a ga-eji dochie anya inyocha ọdịdị nke nsụgharị nke ọ bụla n’onwe ya.”a
Akụkụ Ndị Pụrụ Iche
Ọtụtụ nde ndị na-agụ New World Translation emewo nnọọ otú ahụ ma chọpụta na ọ bụghị nanị na o kwere ọgụgụ kamakwa o ziri nnọọ ezi. Ndị sụgharịrị ya si n’asụsụ Hibru, Aramaic, na Grik mbụ sụgharịa ya, na-eji akụkụ ihe odide kasị mma dịnụ mee ihe.b E jikwa nlezianya pụrụ iche mee ihe iji sụgharịa akụkụ ihe odide ochie ahụ n’ụzọ nkịtị ruo ókè o kwere mee kama bụrụ n’asụsụ a ga-aghọta n’ụzọ dị mfe. N’ihi ya, ụfọdụ ndị ọkà mmụta toro nsụgharị a maka ikwu eziokwu na izi ezi ya. Dị ka ihe atụ, Andover Newton Quarterly nke January 1963 kwuru, sị: “Nsụgharị nke Agba Ọhụrụ bụ ihe àmà na-egosi na òtù ahụ nwere ndị ọkà mmụta ruru eru iji ọgụgụ isi dozie ọtụtụ nsogbu a na-enwe n’ịsụgharị Bible.”
Ndị nsụgharị ahụ kpughere akụkụ ọhụrụ nke nghọta Bible. Akụkụ ihe odide Bible ndị a na-aghọtabughị nke ọma ghọrọ ihe doro nnọọ anya nke ọma. Dị ka ihe atụ, a sụgharịrị akụkụ ihe odide ahụ dị mgbagwoju anya dị na Matiu 5:3, bụ́ “ngọzi na-adịrị ndị bụ́ ogbenye n’ime mmụọ” (King James Version), n’ụzọ amamihe dị na ya: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.” New World Translation jikwa nnọọ otu ụzọ sụgharịa okwu ndị bụ́ isi. Dị ka ihe atụ, a sụgharịrị okwu Grik ahụ bụ́ psy·kheʹ ịbụ “mkpụrụ obi” n’ebe ọ bụla ọ pụtara. N’ihi ya, ndị na-agụ ya pụrụ ịghọta ngwa ngwa na n’ụzọ megidere nchepụta echiche okpukpe, mkpụrụ obi abụghị ihe na-adịghị anwụ anwụ!—Matiu 2:20; Mak 3:4; Luk 6:9; 17:33.
Iweghachi Aha Chineke
Akụkụ pụtara ìhè nke New World Translation metụtara iweghachi aha Chineke, bụ́ Jehova. Na Bible Hibru ndị ochie, mgbochiume anọ ahụ a pụrụ idegharị dị ka YHWH ma ọ bụ JHVH n’asụsụ ọzọ na-anọchi anya aha Chineke. Aha a pụrụ iche pụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ugboro 7,000 nanị n’ime ihe ahụ a sị na ọ bụ Agba Ochie. (Ọpụpụ 3:15; Abụ Ọma 83:18) N’ụzọ doro anya, Onye Okike anyị zubere ka ndị na-efe ya mara aha ahụ ma jiri ya na-eme ihe!
Otú ọ dị, egwu nkwenkwe ụgha mere ka ndị Juu kwụsị iji aha Chineke na-eme ihe. Mgbe ndị ozi Jisọs nwụsịrị, ndị ndepụtaghachi nke Akwụkwọ Nsọ Grik malitere iji okwu Grik ndị bụ́ Kyʹri·os (Onyenwe Anyị) ma ọ bụ The·osʹ (Chineke) na-edochi aha aka Chineke. Ọ dị mwute ikwu na ndị nsụgharị nke oge a ejigidewo ọdịnala a na-akparị Chineke, na-ewepụ aha Chineke n’ihe ka n’ọtụtụ Bible, ọbụnakwa na-ezochi na Chineke nwere aha. Dị ka ihe atụ, na Jọn 17:6 ka e nwere okwu Jisọs bụ́: “Emewo m ka aha gị pụta ìhè.” Otú ọ dị, ihe Today’s English Version sụgharịrị ya bụ: “Emewo m ka a mara gị.”
Ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-akwado mwepụ e wepụrụ aha Chineke n’ihi na a maghị kpọmkwem otú e si akpọpụta ya. Otú ọ dị, mgbe nile, a na-asụgharị ụfọdụ aha ndị a maara nke ọma bụ́ ndị dị na Bible dị ka Jeremaịa, Aịsaịa, na Jisọs, n’ụzọ na-eyichaghị otú e si akpọpụta ha n’olu Hibru mbụ. Ebe ọ bụ na okwu ahụ bụ́ Jehova bụ ụzọ dabara adaba isi na-asụgharị aha Chineke—bụrụkwa nke ọtụtụ ndị maara—ịjụ iji ya eme ihe yiri ihe na-enweghị isi.
Kọmitii Nsụgharị Bible Ụwa Ọhụrụ weere nzọụkwụ ahụ pụtara ìhè nke iji aha ahụ bụ́ Jehova mee ihe ma n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ Hibru ma na nke Grik. Ha nwere ebe ha dabeere mee otú ahụ ná nsụgharị ndị ozi ala ọzọ mbụ mere maka ndị nọ n’Etiti Kọntinent America, n’Ebe Ndịda Pacific, nakwa n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. Otú ọ dị, iji aha Chineke na-eme ihe n’ụzọ dị otú ahụ abụghị nanị ihe gbasara nkà mmụta. Ịmara aha Chineke dị oké mkpa iji mara ya dị ka onye. (Ọpụpụ 34:6, 7) New World Translation agbawo ọtụtụ nde ndị na-agụ ya ume iji aha ya eme ihe!
Irute Ndị Na-adịghị Agụ Asụsụ Bekee
N’agbata afọ 1963 na 1989, e wepụtara New World Translation, n’ozuzu ya ma ọ bụ n’akụkụ ya ụfọdụ, n’asụsụ iri ọzọ. Otú ọ dị, ọrụ nsụgharị ya bụ oké ọrụ, ụfọdụ n’ime ha na-ewekwa afọ 20 ma ọ bụ karịa. E mesịa, na 1989, e guzobere Ngalaba Ije Ozi Maka Nsụgharị n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova. N’okpuru nduzi nke Kọmitii Ihe Odide nke Òtù Na-achị Isi, ngalaba a malitere ime ka nsụgharị Bible dịkwuo ngwa. E mepụtara usoro nsụgharị nke jikọtara ihe ọmụmụ okwu Bible na nkà na ụzụ kọmputa. Olee otú usoro a si arụ ọrụ?
Ozugbo Kọmitii Ihe Odide kwadoro ịsụgharị Bible gaa n’asụsụ ọhụrụ, ọ na-ahọpụta otu ìgwè ndị Kraịst raara onwe ha nye, ije ozi dị ka ìgwè nsụgharị. Ìgwè pụrụ imepụta nsụgharị ka zie ezie karịa onye na-arụ nanị ya. (Tụlee Ilu 11:14.) Dị ka ọ na-adịkarị, onye ọ bụla so n’ìgwè ahụ enweela ahụmahụ n’ịsụgharị mbipụta Society. Mgbe ahụ, ìgwè ahụ na-anata ọzụzụ zuru ezu n’ụkpụrụ ndị na-achịkwa nsụgharị Bible nakwa n’otú e si eji usoro ihe omume kọmpụta ndị e mere n’ụzọ pụrụ iche eme ihe. Kọmputa adịghị eme nsụgharị n’onwe ya, ma ọ pụrụ ime ka ìgwè ahụ nweta ihe ọmụma ndị dị mkpa ma nyere ha aka idekọ mkpebi ndị ha mere.
Ọrụ nsụgharị Bible nwere nkebi abụọ. Ná nkebi mbụ, a na-enye ndị nsụgharị ahụ ndepụta nke okwu ndị e ji mee ihe na New World Translation Bekee. A na-edekọta okwu ndị yiri ibe ha na Bekee, dị ka “kpuchie mmehie,” “mkpuchi mmehie,” na “ihe na-ekpuchi mmehie” n’otu ìgwè, na-eme ka ndị nsụgharị mụrụ anya banyere ọdịiche ndị dị n’ihe ha pụtara bụ́ ndị na-apụtachaghị ìhè. Ha na-edepụta ihe a na-akpọ ha n’asụsụ ha. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, onye nsụgharị pụrụ inwe ihe isi ike n’ịsụgharị otu amaokwu. Usoro nnyocha kọmputa na-enye onye nsụgharị ahụ ihe ọmụma banyere okwu Grik na Hibru, na-emekwa ka o nwee ike inyocha akwụkwọ ndị Watch Tower bipụtara.
Mgbe ọrụ ahụ gafere ná nkebi nke abụọ ya, a na-etibanye okwu asụsụ ógbè ndị ahụ a họpụtara ozugbo n’ime akụkụ ihe odide Bible ahụ. Nke a na-eme ka e nwee izi ezi na nkwekọ dị ịrịba ama ná nsụgharị ahụ. Otú ọ dị, ọ na-esi ike ịgụ akụkụ ihe odide e depụtara site n’usoro “a chọta e dochie” a. A ghaghị ịrụ ọrụ dị ukwuu iji hazie ma dezigharịa amaokwu Bible ka e wee nwee ike ịgụ ha were were.
Usoro nsụgharị a egosipụtawo na ọ dị irè n’ụzọ dị ịrịba ama. Otu ìgwè ji nanị afọ abụọ sụgharịa Akwụkwọ Nsọ Hibru dum. Jiri nke a tụnyere otu ìgwè nke rụrụ ọrụ n’asụsụ yiri ya, n’enweghị enyemaka kọmputa. O were ha afọ 16. Ka ọ dị ugbu a, e bipụtala Akwụkwọ Nsọ Grik n’asụsụ 18 ọzọ kemgbe 1989. E nwere New World Translation ugbu a, n’ozuzu ya ma ọ bụ n’akụkụ ya ụfọdụ, n’asụsụ 34. N’ụzọ dị otú a, ihe karịrị pasent 80 nke Ndịàmà Jehova nwere ma ọ dịghị ihe ọzọ, Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’asụsụ ala nna ha.
Ndị United Bible Societies na-akọ na n’ime asụsụ 6,500 e nwere n’ụwa, akụkụ ụfọdụ nke Bible dị nanị n’asụsụ 2,212.c N’ihi ya, ihe dị ka 100 ndị nsụgharị na-arụ ọrụ iji sụgharịa New World Translation nke Akwụkwọ Nsọ Hibru na Grik n’asụsụ 11 na 8 n’otu n’otu. Uche Chineke bụ “ka a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu.” (1 Timoti 2:4) Obi abụọ adịghị ya na New World Translation ga-anọgide na-ekere òkè bụ́ isi n’akụkụ a.
Ya mere anyị na-aṅụrị ọṅụ na e bipụtala nsụgharị a gafee ọnụ ọgụgụ ahụ dị ịrịba ama bụ́ 100 nde, anyị na-ekpekwa ekpere ka e bipụtakwuo ọtụtụ nde ọzọ n’ọdịnihu. Anyị na-agba gị ume inyocha ya n’onwe gị. Ị ga-anụ ụtọ ọtụtụ ihe ndị pụrụ iche: mkpụrụ akwụkwọ a na-ahụ nke ọma, isiokwu ndị dị n’elu peji, ndepụta ntụaka nke pụrụ inyere gị aka ịchọta amaokwu ndị ị maara nke ọma, map zuru ezu, na ntụaka isiokwu na-adọrọ adọrọ. Nke ka mkpa bụ na ị pụrụ ịgụ Bible a, na-enwe obi ike na ọ na-ekwu kpọmkwem ihe Chineke kwuru, n’asụsụ gị.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a N’ụzọ na-akpali mmasị, mkpo nke New American Standard Bible nke 1971 Nwere Ntụaka, kwuru ihe yiri nke ahụ, sị: “Anyị ejighị aha ọkà mmụta ọ bụla mee ihe dị ka ihe izo aka ma ọ bụ ihe ịtụ aro n’ihi na anyị kweere na Okwu Chineke kwesịrị ịkwụrụ n’onwe ya.”
b The New Testament in the Original Greek, nke Westcott na Hort dere, rụrụ ọrụ dị ka akụkụ ihe odide Grik bụ́ isi. Biblia Hebraica nke R. Kittel dere, bụ akụkụ ihe odide bụ́ isi maka Akwụkwọ Nsọ Hibru.
c Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị na-asụ asụsụ abụọ, e kweere na a sụgharịwo Bible, n’ozuzu ya ma ọ bụ n’akụkụ ya ụfọdụ, n’asụsụ zuoro ihe karịrị pasent 90 nke ndị bi n’ụwa ịgụ ya.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 29]
“Nsụgharị nke Agba Ọhụrụ bụ ihe àmà na-egosi na òtù ahụ nwere ndị ọkà mmụta ruru eru iji ọgụgụ isi dozie ọtụtụ nsogbu a na-enwe n’ịsụgharị Bible.”—ANDOVER NEWTON QUARTERLY, JANUARY 1963
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 30]
“Nsụgharị aghaghị iso ọganihu a na-enwe na nkà mmụta Bible na mgbanwe ndị a na-enwe n’asụsụ na-aga ụkwụ na ụkwụ”
[Igbe/Foto dị na peeji nke 31]
NDỊ ỌKÀ MMỤTA ETOO NEW WORLD TRANSLATION
BANYERE New World Translation of the Christian Greek Scriptures, Edgar J. Goodspeed, bụ́ onye sụgharịrị “Agba Ọhụrụ” nke Grik na An American Translation, dere n’akwụkwọ ozi akara ụbọchị ya bụ December 8, 1950, sị: “Enwere m mmasị n’ọrụ okpukpe nke ndị unu na-arụ, nakwa n’ozuzu o zuru ụwa ọnụ, nweekwa obi ụtọ ná nsụgharị ahụ na-aga were were, nke na-ezoghị ọnụ ma doo anya. Ọ na-egosi ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke mmụta bụ́ ịgba, dị ka m pụrụ ịgba akaebe ya.”
Ọkà mmụta Hibru na Grik bụ́ Alexander Thomson dere, sị: “O doro anya na nsụgharị ahụ bụ ọrụ ndị ọkà mmụta nwere nkà ma dị nkọ rụrụ, bụ́ ndị gbalịrị ịsụgharị ihe akụkụ ihe odide Grik pụtara nnọọ ruo n’ókè asụsụ Bekee pụrụ ikwupụtaru ya.”—The Differentiator, April 1952, peji nke 52-57.
Prọfesọ Benjamin Kedar, bụ́ ọkà mmụta Hibru nke nọ n’Israel, kwuru na 1989, sị: “Ná nnyocha asụsụ m na-eme n’ihe banyere Bible Hibru na nsụgharị dị iche iche, ana m ezokarị aka ná mbipụta Bekee nke ihe a maara dị ka New World Translation. N’ime otú ahụ, a na-emesi m obi ike ugboro ugboro na mbipụta a na-egosipụta mgbalị e ji ezi obi mee iji nweta nghọta ziri ezi nke akụkụ ihe odide ahụ ruo n’ókè o kwere mee.”