Iso Onye Nche ahụ Na-eje Ozi
“Onyenwe anyị, n’elu ụlọ nche ka mụ onwe m na-eguzo mgbe nile n’ehihie, na nche m ka a na-eme ka mụ onwe m guzo n’abalị nile.”—AỊSAỊA 21:8.
1. Olee nkwa ndị dị ebube Jehova n’onwe ya na-agbara àmà?
JEHOVA bụ Onye Nzube Ukwu. Ọ dịghị ihe mmụọ ozi ahụ na-enupụ isi bụ́ onye ghọrọ Setan Ekwensu pụrụ ime iji gbaghaa nzube ukwu Ya bụ́ ido aha aka Ya nsọ ma guzobe ọchịchị Alaeze dị ebube nke ga-achị ụwa paradaịs. (Matiu 6:9, 10) N’okpuru ọchịchị ahụ, a ga-agọzi ihe a kpọrọ mmadụ n’ezie. Chineke “[ga-eloda] ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi; Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu nile.” Ụmụ mmadụ na-enwe obi ụtọ ma dị n’otu ga-enwe udo na ọganihu ruo mgbe nile ebighị ebi. (Aịsaịa 25:8; 65:17-25) Jehova na-agbara onwe ya àmà banyere nkwa ndị a dị ebube!
2. Olee ndị àmà bụ́ mmadụ Jehova meworo ka ha bilie?
2 Otú ọ dị, Onye Okike Ukwu nwekwara ndị àmà bụ́ mmadụ. Tupu oge ndị Kraịst, “oké ìgwè ndị àmà,” malite n’Ebel, gbara ọsọ nke ntachi obi, ọtụtụ mgbe n’agbanyeghị oké ihe ịma aka. Ihe nlereanya ha ndị magburu onwe ha na-agba ndị Kraịst na-eguzosi ike n’ihe ume taa. Kraịst Jisọs bụ ihe nlereanya na-enweghị atụ nke onye àmà nwere obi ike. (Ndị Hibru 11:1–12:2) Dị ka ihe atụ, cheta akaebe ikpeazụ ọ gbara n’ihu Pọntiọs Paịlet. Jisọs kwupụtara, sị: “A mụwo Mụ onwe m ime ihe a, abịawokwa m n’ime ụwa ime ihe a, ka M wee gbaara eziokwu àmà.” (Jọn 18:37) Site na 33 O.A. ruo n’afọ a bụ́ 2000 O.A., ndị Kraịst na-anụ ọkụ n’obi agbasowo ihe nlereanya Jisọs, ha anọgidewokwa na-agba àmà, jiri obi ike na-ekwupụta “oké ọrụ nile nke Chineke.”—Ọrụ 2:11.
Ịrọ Òtù nke Babilọn
3. Olee otú Setan siworo megide àmà ahụ a gbara banyere Jehova na uche ya?
3 N’ime narị afọ iri ndị gafeworonụ, Onye Iro ukwu ahụ, bụ́ Setan Ekwensu, ejirila obi ọjọọ chọọ ime ka e lelịa akaebe ndị àmà Chineke na-agba. Dị ka ‘nna ụgha,’ “dragon ukwu [a], bụ́ agwọ ochie ahụ,” anọwo “na-eduhie ụwa nile mmadụ bi.” O selatabeghị aka n’agha ọ na-alụso ndị “na-edebe ihe nile Chineke nyere n’iwu,” karịsịa na mgbe ikpeazụ a.—Jọn 8:44; Mkpughe 12:9, 17.
4. Olee otú Babilọn Ukwu ahụ si malite?
4 Ihe dị ka afọ 4,000 gara aga, mgbe Iju Mmiri nke ụbọchị Noa gasịrị, Setan mere ka Nimrọd, bụ́ “dike n’ịchụ nta n’ihu Jehova,” bilie. (Jenesis 10:9, 10) Obodo kasị ukwuu nke Nimrọd, bụ́ Babilọn (Bebel), ghọrọ ebe bụ́ isi nke okpukpe ndị mmụọ ọjọọ. Mgbe Jehova ghagburu asụsụ ndị na-ewu ụlọ elu Bebel, ndị ahụ gbasasịrị gburugburu ụwa, ha jikwa okpukpe ụgha ha gbasaa. N’ụzọ dị otú a, Babilọn ghọrọ isi iyi nke alaeze zuru ụwa ọnụ nke okpukpe ụgha, nke a kpọrọ Babilọn Ukwu ahụ n’akwụkwọ Mkpughe. Akwụkwọ ahụ na-ebu amụma banyere mbibi nke usoro okpukpe ochie a.—Mkpughe 17:5; 18:21.
Mba nke Ndị Àmà
5. Olee mba Jehova haziri ịbụ onye àmà ya, ma gịnị mere o ji kwere ka a dọrọ ya n’agha?
5 Ihe dị ka afọ 500 mgbe oge Nimrọd gasịrị, Jehova haziri ụmụ nke Abraham kwesịrị ntụkwasị obi ịbụ mba Israel iji jee ozi dị ka onye àmà Ya n’ụwa. (Aịsaịa 43:10, 12) Ọtụtụ ndị so ná mba ahụ ji iguzosi ike n’ihe jeere Jehova ozi. Otú ọ dị, n’ime ọtụtụ narị afọ gaferenụ, nkwenkwe ụgha nke mba ndị ya na ha gbara agbata obi merụrụ Israel, ndị ha na Jehova gbara ndụ wezụgakwara onwe ha n’ebe ọ nọ iji fee chi ụgha dị iche iche. N’ihi ya, na 607 T.O.A., usuu ndị agha Babilọn, bụ́ ndị Eze Nebukadneza na-edu, bibiri Jerusalem na ụlọ nsọ ya ma dọrọ ihe ka ọtụtụ ná ndị Juu n’agha laa Babilọn.
6. Ozi ọma dị aṅaa ka onye nche Jehova nke e buru n’amụma kpọsara, oleekwa mgbe o mezuru?
6 Lee mmeri nke ahụ bụụrụ okpukpe ụgha! Otú ọ dị, ịchịisi Babilọn adịteghị aka. Ihe dị ka afọ 200 tupu ihe omume ahụ, Jehova nyere iwu, sị: “Jee, guzo onye nche: ihe ọ ga-ahụ ka ọ ga-egosi.” Olee ozi onye nche a nwere izi? “Ọ dawo, Babilọn adawo; ọzọ, arụsị nile a pịrị apị nke chi ya nile ka e tipịaruworo ala.” (Aịsaịa 21:6, 9) Otú ahụ ka o mere, na 539 T.O.A., okwu amụma ahụ mezuru. Babilọn dị ike dara, ndị ha na Chineke gbara ndụ lọghachikwara n’ala nna ha n’oge na-adịghị anya.
7. (a) Gịnị ka a kụziiri ndị Juu site n’ịdọ aka ná ntị Jehova? (b) N’ọnyà ndị dị aṅaa ka ndị Juu dabara na ha mgbe ndọrọ n’agha ahụ gasịrị, gịnịkwa si na ya pụta?
7 A kụziworo ndị Juu ahụ na-alọghachinụ ihe n’ụzọ zuru ezu ịgbahapụ ikpere arụsị na okpukpe ndị mmụọ ọjọọ. Otú ọ dị, n’ime ọtụtụ afọ gaferenụ, ha dabara n’ọnyà ndị ọzọ. Ụfọdụ bụ ndị nkà ihe ọmụma ndị Gris matara n’ọnyà. Ndị ọzọ bịara na-emesi ọdịnala mmadụ ike karịa Okwu Chineke. Ma ịhụ mba n’anya rafuru ndị ọzọ. (Mak 7:13; Ọrụ 5:37) Ka ọ na-erule oge ahụ a mụrụ Jisọs, mba ahụ esiwo n’ezi ofufe wezụga onwe ha ọzọ. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị Juu nabatara ozi ọma ahụ Jisọs ziri, mba ahụ n’ozuzu ya jụrụ ya, n’ihi ya kwa, Chineke jụrụ mba ahụ. (Jọn 1:9-12; Ọrụ 2:36) Israel abụghịzi onye àmà Chineke, n’afọ 70 O.A. kwa, e bibiri Jerusalem na ụlọ nsọ ya ọzọ, n’oge a site n’aka usuu ndị agha Rom.—Matiu 21:43.
8. Olee onye ghọrọ onye àmà Jehova, n’ihi gịnịkwa ka ịdọ aka ná ntị Pọl nyere onye àmà a ji bụrụ nke bịara n’ezi oge?
8 Ka ọ dị mgbe ahụ, a mụọla “Israel nke Chineke” nke ndị Kraịst, nke a jeziri ozi dị ka onye àmà Chineke nye mba dị iche iche. (Ndị Galetia 6:16) N’egbughị oge ọ bụla, Setan kpara nkata imerụ mba ime mmụọ ọhụrụ a. Ka ọ na-erule n’ọgwụgwụ narị afọ mbụ, a hụrụ mmetụta ịrọ òtù n’ọgbakọ dị iche iche. (Mkpughe 2:6, 14, 20) Ịdọ aka ná ntị Pọl bịara n’ezi oge: “Lezienụ anya ka onye ọ bụla ghara iwere ịhụ amamihe n’anya na aghụghọ efu nke ya bụrụ onye na-ezu unu n’ohi, ịhụ amamihe n’anya nke dị ka ihe ozizi mmadụ nyere idebe, dị ka ozizi mbụ nke ụwa, ma ọ dịghị ka Kraịst si dị.”—Ndị Kọlọsi 2:8.
9. Dị nnọọ ka Pọl dọrọla aka ná ntị, olee ihe omume ndị dugara ná mpụta nke Krisendọm?
9 N’ikpeazụ, nkà ihe ọmụma ndị Gris, echiche okpukpe ndị Babilọn, nakwa mgbe e mesịrị, “amamihe” mmadụ ndị dị ka ozizi evolushọn na oké nkatọ Bible merụrụ okpukpe ọtụtụ ndị bụ́ ndị zọọrọ na ha bụ ndị Kraịst. Ọ dị nnọọ ka Pọl buworo n’amụma: “Mụ onwe m matara na mgbe m lasịrị agụ jọgburu onwe ha ga-aba n’etiti unu, ghara imere ìgwè atụrụ ebere; ndị ikom ga-esitekwa n’etiti unu onwe unu bilie, na-ekwu ihe dị iche iche na-eduhie mmadụ ụzọ, ka ha dọpụ ndị na-eso ụzọ Jisọs iso ha n’azụ.” (Ọrụ 20:29, 30) Krisendọm malitere ịdị adị n’ihi ndapụ n’ezi ofufe a.
10. Olee ihe omume ndị mere ka ọ pụta ìhè na ọ bụghị mmadụ nile feworo ofufe rụrụ arụ a na-efe na Krisendọm?
10 Ndị raara onwe ha n’ezie nye ofufe dị ọcha aghaghị “[ịgbasi] mgba ike n’ihi okwukwe ahụ nke e nyere ndị nsọ n’aka nanị otu mgbe idebe.” (Jud 3) Àmà ahụ a na-agba banyere ofufe dị ọcha na nke a na-agbara Jehova ọ̀ ga-emi ala n’ụwa? Ee e. Ka oge na-akpụdewe nso maka ibibi onye nnupụisi ahụ bụ́ Setan na ọrụ ya nile, ọ pụtara ìhè na ọ bụghị mmadụ nile feworo ofufe nke ndị si n’ezi ofufe dapụ bụ́ nke a na-efe na Krisendọm. N’akụkụ ikpeazụ nke narị afọ nke 19, na Pittsburgh, Pennsylvania, U.S.A., e guzobere otu ìgwè ndị mmụta Bible nwere obi eziokwu, ha ghọkwara ntọala nke òtù onye àmà Chineke nke oge a. Ndị Kraịst a dọọrọ uche gaa n’ihe àmà Akwụkwọ Nsọ nke na-egosi na ọgwụgwụ nke usoro ihe ụwa dị ugbu a dị nso. Ná mmezu amụma Bible, “ọgwụgwụ” ụwa a malitere na 1914, ntiwapụ nke agha ụwa mbụ kakwara ya akara. (Matiu 24:3, 7) E nwere ihe àmà siri ike nke na-egosi na e si n’eluigwe chụpụ Setan na ìgwè ndị mmụọ ọjọọ ya mgbe afọ ahụ gasịrị. Narị afọ nke 20 nke jupụtara ná nsogbu egosiwo ihe àmà doro anya banyere ọrụ Setan nakwa banyere mmezu pụtara ìhè nke ihe ịrịba ama nke ọnụnọ Jisọs dị ka eze n’ike Alaeze eluigwe.—Matiu, isi nke 24 na 25; Mak, isi nke 13; Luk, isi nke 21; Mkpughe 12:10, 12.
11. Gịnị ka Setan gbalịrị ime, ma olee otú mgbalị ya si kụọ afọ n’ala?
11 Na June 1918, Setan ji obi nkoropụ gbalịa ikpochapụ ndị ahụ na-amụ Bible, bụ́ ndị na-eme nkwusa n’ọtụtụ mba n’oge ahụ. Ọ nwakwara ibibi ụlọ ọrụ ha iwu kwadoro, bụ́ Watch Tower Bible and Tract Society. A tụrụ ndị ikom nwere ibu ọrụ nke Society mkpọrọ, na-ebo ha ebubo ụgha nke ịgba ọchịchị mgba okpuru, dị ka e boworo Jisọs na narị afọ mbụ. (Luk 23:2) Ma na 1919, a tọhapụrụ ndị ọrụ a, nke mere ka ha nwee ike ịga n’ihu n’ozi ha. Mgbe e mesịrị, a kachapụrụ ebubo nile e boro ha.
“Onye Nche” nke Nọ na Nche
12. Ole ndị taa mejupụtara òtù onye nche nke Jehova, oleekwa àgwà ha nweworo?
12 Ya mere, mgbe “mgbe ọgwụgwụ” malitere, Jehova wepụtara onye nche ọzọ, na-eme ka ndị mmadụ mara banyere ihe omume ndị metụtara mmezu nke nzube Ya. (Daniel 12:4; 2 Timoti 3:1) Ruo taa, òtù onye nche ahụ—ndị Kraịst e tere mmanụ, Israel nke Chineke—anọwo na-eme omume n’ụzọ kwekọrọ ná nkọwa Aịsaịa nyere onye nche ahụ e buru n’amụma: “Ọ ga-aṅa ntị na-aṅasi ntị ike nke ukwuu. O wee kpọọ dị ka ọdụm: sị, Onyenwe anyị, n’elu ụlọ nche ka mụ onwe m na-eguzo mgbe nile n’ehihie, na nche m ka a na-eme ka mụ onwe m guzo n’abalị nile.” (Aịsaịa 21:7, 8) Nke a bụ onye nche nke ji ọrụ ya kpọrọ ihe!
13. (a) Ozi dị aṅaa ka onye nche Jehova kpọsaworo? (b) À pụrụ isi aṅaa kwuo na Babilọn Ukwu ahụ adawo?
13 Gịnị ka onye nche a na-ahụ? Ọzọkwa, onye nche Jehova, bụ́ òtù onye àmà ya, na-ama ọkwa, sị: “Ọ dawo, Babilọn adawo; ọzọ, arụsị nile a pịrị apị nke chi ya nile ka e [Jehova] tipịaruworo ala.” (Aịsaịa 21:9) N’oge a, mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị, ọ bụ Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, ka e si n’ọkwá ịchịisi ya kwatuo. (Jeremaịa 50:1-3; Mkpughe 14:8) Ọ bụghị ihe ijuanya! Agha Ukwu ahụ, dị ka a na-akpọ ya n’oge ahụ, malitere na Krisendọm, bụ́ ebe ndị ụkọchukwu nọ n’akụkụ abụọ ahụ mere ka esemokwu ahụ biri ọkụ site n’ịgba ụmụ okorobịa ha ndị kasị mma ume ịga agha. Lee ihe ihere ọ bụ! Na 1919, Babilọn Ukwu ahụ apụghị igbochi Ndị Mmụta Bible, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, isi n’ọnọdụ arụghị ọrụ ha pụta na ịmalite ọrụ ịgba àmà zuru ụwa ọnụ bụ́ nke ka na-aga n’ihu. (Matiu 24:14) Nke ahụ gbara ama ọdịda nke Babilọn Ukwu ahụ, dị nnọọ ka ntọhapụ nke Israel na narị afọ nke isii T.O.A. si gbaa àmà ọdịda nke Babilọn oge ochie.
14. Olee magazin òtù onye nche Jehova jiworo mee ihe n’ụzọ pụtara ìhè, oleekwa otú Jehova siworo gọzie ojiji e ji ya eme ihe?
14 Òtù onye nche ahụ ejiwo ịnụ okụ n’obi na ọchịchọ siri ike nke ime ihe ziri ezi na-arụ ọrụ ya mgbe nile. Na July 1879, Ndị Mmụta Bible malitere ibipụta magazin a, bụ́ nke a maara mgbe ahụ dị ka Zion’s Watch Tower and Herald of Christ’s Presence. Mbipụta nke ọ bụla site na 1879 ruo December 15, 1938, bu n’ihu ya, okwu ndị bụ́ “‘Onye Nche, Kedụ Maka Abalị?’—Aịsaịa 21:11.”a N’ụzọ a pụrụ ịdabere na ya, ruo afọ 120 Ụlọ Nche anọwo na nche n’ihe omume ụwa na ihe ha pụtara n’ụzọ amụma. (2 Timoti 3:1-5, 13) Òtù onye nche Chineke na ndị ibe ya bụ́ “atụrụ ọzọ” ahụ ejiriwo magazin a mee mkpọsa siri ike gwa ihe a kpọrọ mmadụ na oge iwepụ ọbụbụeze Jehova n’ụta site n’Alaeze Kraịst dị nso. (Jọn 10:16) Jehova ọ̀ gọziwo onye àmà a? Site ná mbipụta mbụ ya nke dị 6,000 na 1879, Ụlọ Nche arịala elu ruo ná nkesa zuru ụwa ọnụ nke ihe karịrị 22,000,000 n’asụsụ 132—a na-ebipụta 121 n’ime ndị a ugbo abụọ n’ọnwa. Lee ka o si kwesị ekwesị na magazin okpukpe a kasị ekesa n’ụwa ga-abụ nke na-ebuli aha ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, elu!
Nsacha Na-aga n’Ihu
15. Nsacha dị aṅaa nke ka na-aga n’ihu malitere ọbụna tupu 1914?
15 N’ime ihe dị ka afọ 40 tupu ịchịisi eluigwe nke Kraịst amalite na 1914, e meela ka Ndị Mmụta Bible nwere onwe ha pụọ n’ọtụtụ n’ime ozizi Krisendọm bụ́ ndị na-adịghị na Bible, dị ka baptism ụmụ ọhụrụ, anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi mmadụ, pọgatrị, mmekpa ahụ n’ọkụ ala mmụọ, na Chi Atọ n’Ime Otu. Ma o wekwuru oge iji wepụ echiche nile na-ezighị ezi. Dị ka ihe atụ, n’afọ ndị 1920, ọtụtụ Ndị Mmụta Bible na-adụnye ihe oyiyi obe na okpueze n’uwe ha, ha na-emekwa ememe Krismas na ezumike ndị ọzọ nke ndị na-ekpere arụsị. Otú ọ dị, ka ofufe wee dị ọcha, a ghaghị iwepụ ihe nile metụtara okpukpe ụgha na ya. Okwu Chineke, bụ́ Bible Nsọ, aghaghị ịbụ nanị ihe ndabere nke nkwenkwe na ụzọ ndụ ndị Kraịst. (Aịsaịa 8:19, 20; Ndị Rom 15:4) Ọ bụ ihe na-ezighị ezi itinye ihe n’Okwu Chineke ma ọ bụ iwepụ ihe ọ bụla na ya.—Deuterọnọmi 4:2; Mkpughe 22:18, 19.
16, 17. (a) Echiche ụgha dị aṅaa ka òtù onye nche ahụ nwere ruo iri afọ ụfọdụ? (b) Gịnị bụ nkọwa ziri ezi nke “ebe ịchụàjà” ahụ na “ogidi” ahụ dị ‘n’Ijipt’?
16 Otu ihe atụ ga-emesi ókè ụkpụrụ a dịruru ná mkpa ike. Na 1886 mgbe C. T. Russell bipụtara akwụkwọ a kpọrọ The Divine Plan of the Ages, akwụkwọ a nwere chaatị nke na-ejikọta ọgbọ dị iche iche nke ihe a kpọrọ mmadụ na Pyramid Ukwu nke Ijipt. E chere na ihe ncheta a nke Fero Khufu bụ ogidi ahụ e zoro aka na ya n’Aịsaịa 19:19, 20: “N’ụbọchị ahụ ebe ịchụàjà ga-adịrị Jehova n’etiti ala Ijipt, otu ogidi n’akụkụ ókèala ya ga-adịkwara Jehova. Ọ ga-abụkwara Jehova nke usuu nile nke ndị agha ihe ịrịba ama na ihe àmà n’ala Ijipt.” Olee njikọ pyramid ahụ na Bible pụrụ inwe? Dị ka ihe atụ, e kwuru na ịdị ogologo nke paseeji ụfọdụ dị na Pyramid Ukwu ahụ na-egosi oge “mkpagbu ukwu” ahụ e kwuru okwu ya na Matiu 24:21 ga-amalite, dị ka e si ghọta ya n’oge ahụ. Ụfọdụ Ndị Mmụta Bible mikpuru onwe ha n’ịtụ akụkụ dị iche iche nke pyramid ahụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ iji mata ihe ndị dị ka ụbọchị ha ga-aga eluigwe!
17 E ji ihe a a sịrị na ọ bụ Bible n’Ụdị Nkume kpọrọ ihe ruo ọtụtụ iri afọ, ruo mgbe mbipụta Ụlọ Nche nke November 15 na December 1, 1928, mere ka o doo anya na Jehova agaghị eji ihe ncheta nke ndị fero na-ekpere arụsị ji nkume wuo ma see akara ịgụ kpakpando nke ndị mmụọ ọjọọ na ya, mee ka àmà a gbara n’ime Bible sikwuo ike. Kama nke ahụ, a ghọtara amụma Aịsaịa ịbụ nke a pụrụ ịkọwa n’ụzọ ime mmụọ. Dị ka ọ dị ná Mkpughe 11:8, “Ijipt” bụ ihe atụ nke ụwa Setan. “Ebe ịchụàjà ga-adịrị Jehova” na-echetara anyị àjà ndị a na-anara nke ọma nke ndị Kraịst e tere mmanụ na-achụ ka ha na-ebi nwa mgbe nta n’ụwa a. (Ndị Rom 12:1; Ndị Hibru 13:15, 16) Ogidi ahụ nke dị “n’akụkụ ókèala [Ijipt]” na-ezo aka n’ọgbakọ ndị Kraịst e tere mmanụ, nke bụ́ “ide na ntọala nke eziokwu ahụ,” nke na-eguzokwa dị ka ihe àmà ‘n’Ijipt,’ bụ́ ụwa nke ha na-aga isi na ya pụọ.—1 Timoti 3:15.
18. (a) Olee otú Jehova siworo nọgide na-eme ka ihe na-edo ndị mmụta Bible nwere obi eziokwu anya? (b) Ọ bụrụ na onye Kraịst ahụta otu nkọwa Akwụkwọ Nsọ dị ka ihe siri ike nghọta, gịnị bụ àgwà amamihe dị na ya inwe?
18 Ka afọ na-agafe, Jehova anọgidewo na-eme ka eziokwu ahụ na-edo anyị anya karị, gụnyere nghọta dokwuru anya nke okwu amụma ya. (Ilu 4:18) N’afọ ndị na-adịbeghị anya, a gbaala anyị ume iji nghọta mikwuru emi leghachi anya ọzọ n’ọgbọ ahụ nke na-agaghị agabiga tupu ọgwụgwụ eruo, ilu atụrụ na ụmụ ewu ahụ, ihe arụ ahụ na mgbe ọ ga-eguzo n’ebe nsọ, ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, nnwogha ahụ, na ọhụụ ụlọukwu nke akwụkwọ Ezikiel—tinyere ihe ndị ọzọ. Ọ pụrụ isi ike mgbe ụfọdụ ịghọta nkọwa ọhụrụ ndị dị otú ahụ, ma ihe ndị mere e ji nye ha na-edo anya mgbe oge ha ruru. Ọ bụrụ na onye Kraịst aghọtaghị nkọwa ọhụrụ nke otu akụkụ akwụkwọ nsọ nke ọma, ọ ga-eme nke ọma iji obi umeala kwughachi ihe ahụ Maịka onye amụma kwuru: “M ga-echere Chineke nke nzọpụta m.”—Maịka 7:7.
19. Olee otú ihe ahụ fọdụrụnụ e tere mmanụ na ndị enyi ha bụ́ atụrụ ọzọ ahụ siworo gosipụta obi ike yiri nke ọdụm na mgbe ikpeazụ a?
19 Cheta na onye nche ahụ “[kpọrọ] dị ka ọdụm: sị, Onyenwe anyị, n’elu ụlọ nche ka mụ onwe m na-eguzo mgbe nile n’ehihie, na nche m ka a na-eme ka mụ onwe m guzo n’abalị nile.” (Aịsaịa 21:8) Ihe ahụ fọdụrụnụ e tere mmanụ egosipụtawo obi ike yiri nke ọdụm n’ịgba okpukpe ụgha ọtọ na n’igosi ndị mmadụ ụzọ na-eduga ná nnwere onwe. (Mkpughe 18:2-5) Dị ka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” ha ewepụtala Bible, magazin, na akwụkwọ ndị ọzọ n’ọtụtụ asụsụ—‘nri n’oge ya.’ (Matiu 24:45) Ha ebutewo ụzọ n’ịchịkọta “oké ìgwè mmadụ . . . ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta.” A na-emekwa ka ndị a dị ọcha site n’ọbara mgbapụta Jisọs, ha na-egosipụtakwa onwe ha ịbụ ndị nwere obi ike n’ife Chineke “ofufe ehihie na abalị.” (Mkpughe 7:9, 14, 15) Gịnị ka ìgwè nta a nke Ndịàmà Jehova e tere mmanụ na ndị enyi ha, bụ́ oké ìgwè mmadụ ahụ, rụpụtaworo n’afọ a gara aga? Isiokwu anyị na-esonụ ga-ekwu nke a.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Site na January 1, 1939, a gbanwere nke a ịbụ “‘Ha gamara na Mụ Onwem bụ Jehova.’—Ezikiel 35:15.”
Ị̀ Na-echeta?
• Ndị àmà dịgasị aṅaa ka Jehova meworo ka ha bilie n’ime afọ ndị gafeworonụ?
• Olee otú Babilọn Ukwu ahụ si malite?
• N’ihi gịnị ka Jehova ji kwere ka e bibie Jerusalem, bụ́ isi obodo nke mba ndị àmà ya, na 607 T.O.A.? na 70 O.A.?
• Mmụọ dị aṅaa ka òtù onye nche nke Jehova na ndị enyi ya gosipụtaworo?
[Foto dị na peeji nke 7]
“Onyenwe anyị, n’elu ụlọ nche ka mụ onwe m na-eguzo mgbe nile”
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
Òtù onye nche nke Jehova ji ọrụ ha akpọrọ ihe