Nzukọ Jehova Dị Anyị Mkpa
Ị̀ NỤTỤWO ka mmadụ sịrị, “Ekwere m na Chineke ma ọ bụghị ná njikọ okpukpe”? Ndị jibu ịnụ ọkụ n’obi na-aga chọọchị ma mesịa ghọọ ndị nwere nkụda mmụọ n’ihi ọdịda okpukpe ha dara igbo mkpa ime mmụọ ha, na-ekwupụtakarị echiche yiri nke a. Ọ bụ ezie na ha nwere ndakpọ olileanya n’ebe òtù okpukpe n’ozuzu ha dị, ọtụtụ na-ekwusi ike na ha ka chọrọ ife Chineke ofufe. Otú ọ dị, ha kwere na ọ ka mma ife ya n’ụzọ nke ha karịa isoro chọọchị ma ọ bụ òtù ọzọ mee otú ahụ.
Gịnị ka Bible na-ekwu? Chineke ọ̀ chọrọ ka ndị Kraịst sonye n’otu nzukọ?
Ndị Kraịst Oge Mbụ Ritere Uru Site n’Ịbụ Ndị A Haziri Ahazi
Na Pentikọst 33 O.A., Jehova wụsara mmụọ nsọ ya, ọ bụghị n’isi mmadụ ole na ole kwere ekwe bụ́ ndị nọsasịrị anọsasị, kama n’isi otu ìgwè ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị bịakọrọ ọnụ “n’otu ebe,” ya bụ, n’otu ọnụ ụlọ nke ụlọ elu dị n’obodo Jerusalem. (Ọrụ 2:1) N’oge ahụ, e guzobere ọgbakọ ndị Kraịst, bụ́ nke ghọrọ nzukọ zuru ụwa ọnụ. Nke a ghọrọ ezigbo ngọzi nye ndị na-eso ụzọ oge mbu ahụ. N’ihi gịnị? Otu ihe bụ na e nyewo ha otu ọrụ dị mkpa—nke ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke “n’elu ụwa dum mmadụ bi.” (Matiu 24:14) N’ọgbakọ, ndị a tọghatara ọhụrụ pụrụ ịmụta otú ha ga-esi na-arụ ọrụ nkwusa site n’aka ndị kwere ekwe ibe ha nwere ahụmahụ.
N’oge na-adịghị anya, ozi Alaeze ahụ gbasara gabiga nnọọ mgbidi Jerusalem. N’agbata 62 na 64 O.A., Pita onyeozi degaara ndị Kraịst bụ́ ndị ‘gbasara n’ime Pọntọs, Galetia, Kapadọsia, Esia, na Bitinia,’ bụ́ ndị dịcha na Turkey nke oge a, akwụkwọ ozi mbụ ya. (1 Pita 1:1) E nwekwara ndị kwere ekwe nọ na Palestine, Lebanọn, Siria, Saịprọs, Gris, Krit, na Itali. Dị ka Pọl kwuru n’akwụkwọ o degaara ndị Kọlọsi na 60-61 O.A., ‘e kwusawo ozi ọma ahụ n’etiti ihe nile e kere eke nke dị n’okpuru eluigwe.’—Ndị Kọlọsi 1:23.
Abamuru nke abụọ dị n’iso otu nzukọ na-akpakọrịta bụ agbamume ndị Kraịst pụrụ inye ibe ha. Site n’iso ọgbakọ na-akpakọrịta, ndị Kraịst pụrụ ịnụ okwu ndị na-akpali akpali, ịmụkọ Akwụkwọ Nsọ ọnụ, ikerịta ahụmahụ ndị na-ewusi okwukwe ike, na isonyere ndị kwere ekwe ibe ha n’ekpere. (1 Ndị Kọrint, isi nke 14) Ndị ikom tozuru okè pụkwara ‘ịzụ ìgwè atụrụ nta Chineke.’—1 Pita 5:2.
Dị ka ndị òtù nke ọgbakọ, ndị Kraịst matara ibe ha, bịakwa hụ ibe ha n’anya. Kama inwe mmetụta nke ịbụ ndị e boro ibu dị arọ site n’iso ọgbakọ na-akpakọrịta, o wuliri ndị Kraịst oge mbụ elu ma wusie ha ike.—Ọrụ 2:42; 14:27; 1 Ndị Kọrint 14:26; Ndị Kọlọsi 4:15, 16.
Ihe ọzọ mere ọgbakọ, ma ọ bụ nzukọ ahụ dị n’otu nke zuru ụwa ọnụ ji dị mkpa bụ iji kwalite ịdị n’otu. Ndị Kraịst mụtara “[ikwu] otu ihe.” (1 Ndị Kọrint 1:10) Nke a dị mkpa. Ndị òtù nke ọgbakọ nwere mmụta na nzụlite dịgasị iche. Ha sụrụ asụsụ dịgasị iche, ha nwekwara àgwà dịrịtara iche n’ụzọ pụtara ìhè. (Ọrụ 2:1-11) Mgbe ụfọdụ, e nwere ndịrịta iche nke echiche bụ́ ndị sitere n’ezi obi. Otú ọ dị, e nyeere ndị Kraịst aka idozi ndịrịta iche dị otú ahụ n’ime ọgbakọ.—Ọrụ 15:1, 2; Ndị Filipaị 4:2, 3.
E wegaara ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị tozuru okè, dị ka Pọl, ajụjụ ndị siri ike bụ́ nke ndị okenye ọgbakọ na-apụghị ịhụ maka ha. E wegaara òtù na-achị isi nọ na Jerusalem okwu ndị dị mkpa metụtara ozizi. Ọ bụ ndị ozi Jisọs Kraịst mejupụtara òtù na-achị isi ahụ na mbụ ma e mesịrị gbasawanye ya ịgụnye ndị okenye nke ọgbakọ dị na Jerusalem. Ọgbakọ nke ọ bụla nakweere ikike sitere n’aka Chineke nke òtù na-achị isi na ndị nnọchianya ya nwere ịhazi ozi, ịhọpụta ndị ikom n’ọnọdụ ije ozi, na ime mkpebi n’okwu ndị metụtara ozizi. Mgbe òtù na-achị isi doziri otu okwu, ọgbakọ ndị ahụ nakweere mkpebi ahụ ma “ṅụrịa n’ihi nkasi obi dị ya.”—Ọrụ 15:1, 2, 28, 30, 31.
Ee, Jehova ji nzukọ mee ihe na narị afọ mbụ. Ma gịnị banyere oge a?
Nzukọ Dị Anyị Mkpa n’Oge A
Dị ka ogbo ha nke narị afọ mbụ, Ndịàmà Jehova ji ọrụ ahụ bụ́ ikwusa ozi ọma nke Alaeze kpọrọ ihe n’oge a. Otu ụzọ ha si arụ ọrụ a bụ site n’ikesa Bible na ihe ndị e ji amụ Bible, bụ́ nke chọrọ nhazi.
Mbipụta ndị Kraịst aghaghị ịbụ nke e ji nlezianya kwadebe, nyochaa maka izi ezi, bipụta, ma bugazie n’ọgbakọ dị iche iche. N’aka nke ha, ndị Kraịst n’otu n’otu aghaghị inye onwe ha n’afọ ofufo iji were akwụkwọ ndị ahụ wegara ndị chọrọ ịgụ ha. Ozi Alaeze ahụ esiwo n’ụzọ dị otú a ruo ọtụtụ nde mmadụ aka. Ndị nkwusa nke ozi ọma ahụ na-agbalị iji ụzọ a haziri ahazi na-eme nkwusa ha, na-ejide n’aka na ọ dịghị akụkụ nke ókèala ahụ a na-arụ ọrụ gabiga ókè na ya ma na-eleghara akụkụ ndị ọzọ anya. Ihe a nile chọrọ nhazi.
Ebe ọ bụ na “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu,” a ghaghị ịsụgharị Bible na akwụkwọ ndị dabeere na Bible. (Ọrụ 10:34) Magazin a dị ugbu a n’asụsụ 132, a na-ebipụtakwa nke ya na ya na-agakọ, bụ́ Teta!, n’asụsụ 83. Nke ahụ chọrọ ìgwè ndị nsụgharị a haziri nke ọma gburugburu ụwa.
Ndị òtù nke ọgbakọ na-enweta agbamume mgbe ha jere nzukọ na mgbakọ dị iche iche nke ndị Kraịst. N’ebe ahụ, ha na-anụ okwu ndị na-akpali akpali sitere na Bible, na-amụkọ Akwụkwọ Nsọ ọnụ, na-ekerịta ahụmahụ ndị na-ewuli elu, na-esonyekwara ndị ofufe ibe ha n’ekpere. Dịkwa ka ụmụnna ha ndị Kraịst nke narị afọ mbụ, ha na-anụ ụtọ nleta na-ewusi okwukwe ike nke ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị bụ́ ndị na-ahụ n’anya. N’ihi ya, ndị Kraịst taa na-enwe “otu ìgwè atụrụ . . . otu Onye ọzụzụ atụrụ.”—Jọn 10:16.
N’ezie, Ndịàmà Jehova ezughị okè, dị nnọọ ka ndị ogbo ha nke oge mbụ na-ezughị. N’agbanyeghị nke ahụ, ha na-agbalị ịrụkọ ọrụ ọnụ n’ịdị n’otu. N’ihi ya, a na-arụzu ọrụ nkwusa Alaeze ahụ n’ụwa nile.—Ọrụ 15:36-40; Ndị Efesọs 4:13.
[Foto dị na peeji nke 31]
Ndị Kraịst taa nwere “otu ìgwè atụrụ . . . otu Onye ọzụzụ atụrụ”