“Chebe Obi Gị”
JEHOVA gwara onye amụma bụ́ Samuel, sị: “Jehova adịghị ahụ dị ka mmadụ si ahụ; n’ihi na mmadụ na-ele ihe anya na-ahụ, ma Jehova na-ele obi.” (1 Samuel 16:7) N’ilekwasịkwa anya n’obi ihe atụ, ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid bụrụ, sị: “Ị [Jehova] nwawo obi m; I letawo m n’abalị; Ị nụchawo m, ma Ị dịghị achọpụta ihe.”—Abụ Ọma 17:3.
Ee, Jehova na-eleba anya n’obi iji chọpụta ihe anyị bụ n’ezie. (Ilu 17:3) Mgbe ahụ, e nwere ezi ihe mere Eze Solomọn nke Israel oge ochie ji adụ ọdụ, sị: “Karịa ihe ndebe gị nile chebe obi gị; n’ihi na site na ya ka mpụta nile nke ndụ dị.” (Ilu 4:23) Olee otú anyị pụrụ isi chebe obi ihe atụ anyị? Ilu isi nke 4 na-aza anyị ajụjụ ahụ.
Nụrụnụ Ịdọ Aka ná Ntị nke Nna
Isi nke 4 nke Ilu ji okwu ndị a malite: “Ụmụ m, nụrụnụ ịdọ aka ná ntị nke nna, tọọkwanụ ntị n’ala ịma nghọta: n’ihi na ezi ihe mmụta ka m nyeworo unu; unu ahapụla iwu m.”—Ilu 4:1, 2.
Ndụmọdụ e nyere ndị ntorobịa bụ ka ha gee ntị n’ezi ntụziaka nke ndị mụrụ ha bụ́ ndị na-asọpụrụ Chineke, karịsịa nke nna ha. O nwere ibu ọrụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ igbo mkpa anụ ahụ na nke ime mmụọ nke ezinụlọ ya. (Deuterọnọmi 6:6, 7; 1 Timoti 5:8) E wezụga nduzi dị otú ahụ, lee ka ọ ga-esi siere onye na-eto eto ike karị iru ntozu okè! Ya mere, ọ̀ bụ na nwatakịrị ekwesịghị iji nkwanye ùgwù nabata ịdọ aka ná ntị nke nna ya?
Otú ọ dị, gịnị banyere onye ntorobịa nke na-enweghị nna ọ bụla izi ya ihe? Dị ka ihe atụ, Jason bụ́ onye dị afọ iri na otu, ghọrọ onye na-enweghị nna mgbe ọ dị afọ anọ.a Mgbe otu onye Kraịst bụ́ okenye jụrụ ya ihe kasị enye ya nsogbu ná ndụ, Jason zaghachiri ozugbo, sị: “Agụụ inwe nna na-agụ m. Mgbe ụfọdụ, ọ na-eme ka m nwee nkụda mmụọ n’ezie.” Ma, e nwere ndụmọdụ na-akasi obi nye ndị ntorobịa na-adịghị enweta ntụziaka n’aka ndị mụrụ ha. Jason na ndị ọzọ dị ka ya pụrụ ịchọ ma nweta ndụmọdụ nke nna site n’aka ndị okenye na ndị ọzọ tozuru okè n’ọgbakọ ndị Kraịst.—Jemes 1:27.
N’icheta ọzụzụ e nyere ya onwe ya, Solomọn gara n’ihu, sị: “Nwa ka m bụụrụ nna m, dị nrò, bụrụkwa nwa e nwere nanị ya n’ihu nne m.” (Ilu 4:3) Ihe àmà na-egosi na eze ahụ ji mmasị cheta otú e si zụlite ya. N’ịbụ “nwa” nke na-eburu ndụmọdụ nna ya n’obi, Solomọn na-eto eto aghaghị isowo nna ya, bụ́ Devid, nwee mmekọrịta na-ekpo ọkụ na nke chiri anya. Ọzọkwa, Solomọn bụ “nwa e nwere nanị ya,” ma ọ bụ nke a hụrụ n’anya nke ukwuu. Lee ka o si dị mkpa ka nwatakịrị tolite n’ezinụlọ ebe e nwere ịhụnanya na ebe ụmụaka na ndị mụrụ ha na-enwe nkwurịta okwu!
Nweta Amamihe na Nghọta
N’icheta ndụmọdụ ịhụnanya nke nna ya, Solomọn na-akọ, sị: “O wee zi m ihe, sị m, Ka obi gị jide okwu m nile; debe ihe nile m nyere n’iwu, wee dị ndụ: nweta amamihe, nweta nghọta; echezọla, esikwala n’okwu nile nke ọnụ m wezụga onwe gị: ahapụla ya [amamihe], ọ ga-edebekwa gị; hụ ya n’anya, ọ ga-echebekwa gị. Isi ihe ka amamihe bụ; nweta amamihe: ee, were ihe nile i nwetaworo nweta nghọta.”—Ilu 4:4–7.
N’ihi gịnị ka amamihe ji bụrụ “isi ihe”? Amamihe pụtara itinye ihe ọmụma na nghọta n’ọrụ n’ụzọ na-arụpụta ezi ihe. Ihe ọmụma—ịmara ihe nke ọma site n’ime nchọpụta na inwe ahụmahụ ma ọ bụ site n’ịgụ ihe na ịmụ ihe—dị oké mkpa n’inwe amamihe. Ma, ọ bụrụ na anyị enweghị ikike nke iji ya mee ihe n’ụzọ dị mma, ihe ọmụma anyị agaghị abacha uru. Ọ bụghị nanị na anyị aghaghị ịdị na-agụchi Bible na mbipụta ndị dabeere na Bible bụ́ ndị “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-ewepụta anya, kamakwa anyị aghaghị ịgbalị itinye ihe anyị na-amụta site na ha n’ọrụ.—Matiu 24:45.
Inweta nghọta dịkwa oké mkpa. E wezụga ya, ànyị pụrụ n’ezie ịhụ njikọ ihe nwere n’ebe ibe ya dị ma ghọtazuo ihe a na-atụle? Ọ bụrụ na anyị enweghị nghọta, ànyị pụrụ isi aṅaa mata ihe mere e ji mee ihe dịgasị iche ma nweta nghọta na mmata? Ee, iji nwee ike ịtụle ihe ndị bụ́ eziokwu ma mee mkpebi ziri ezi, nghọta dị anyị mkpa.—Daniel 9:22, 23.
Solomọn gara n’ihu ịkọ ihe nna ya kwuru, na-asị: “Tụkọba ya [amamihe] elu, ọ ga-ebulikwa gị: ọ ga-asọpụrụ gị, mgbe ị na-agbakụ ya obi. Ọ ga-enye isi gị okpu amara: okpueze mara mma ka ọ ga-enye gị n’aka.” (Ilu 4:8, 9) Amamihe Chineke na-echebe onye na-agbakụ ya. Ọzọkwa, ọ na-ewetara ya nsọpụrụ, na-achọkwa ya mma. Mgbe ahụ, ka anyị mee ihe nile anyị pụrụ ime iji nweta amamihe.
“Jide Ịdọ Aka ná Ntị Aka”
N’inyeghachi ndụmọdụ nna ya nyere, eze Israel ahụ na-ekwukwa, sị: “Nụrụ, nwa m, narakwa okwu ọnụ m nile; afọ ndụ ga-abakwara gị ụba. N’ụzọ amamihe ka m ziworo gị ihe; emewo m ka ị zọọ ije n’ụzọ nile nke izi ezi. Mgbe ị na-eje ije, a gaghị akpagide nzọụkwụ gị; ọ bụrụkwa na ị gbaa ọsọ, ị gaghị asụ ngọngọ. Jide ịdọ aka ná ntị aka; ahala ya aka: chebe ya; n’ihi na ya onwe ya bụ ndụ gị.”—Ilu 4:10–13.
Dị ka onye bụụrụ nna ya ezigbo nwa, Solomọn aghaghị ịghọtawo uru ịdọ aka ná ntị ịhụnanya nke na-enye ọzụzụ na mgbazi bara. E wezụga ịdọ aka ná ntị guzoziri eguzozi, ànyị pụrụ isi aṅaa na-atụ anya inwe ọganihu ruo ntozu okè ime mmụọ ma ọ bụ na-enwe olileanya ime ka ndụ anyị ka mma? Ọ bụrụ na anyị adịghị amụta ihe site n’ihie ụzọ anyị ma ọ bụ ọ bụrụ na anyị adịghị edozi echiche ndị na-ezighị ezi, ọganihu ime mmụọ anyị ga-adị nnọọ obere n’ezie. Ịdọ aka ná ntị ezi uche dị na ya na-eduga n’ịkpa àgwà nsọpụrụ Chineke, sikwa otú a na-enyere anyị aka ‘ịzọ ije n’ụzọ nile nke izi ezi.’
Ụdị ịdọ aka ná ntị ọzọ na-edugakwa n’ime ka ‘afọ ndụ baara anyị ụba.’ N’ụzọ dị aṅaa? Jisọs Kraịst kwuru, sị: “Onye kwesịrị ka a tụkwasị ya obi n’ihe dịkarịsịrị nta kwesịkwara ka a tụkwasị ya obi n’oké ihe: onye bụkwa onye ajọ omume n’ihe dịkarịsịrị nta bụkwa onye ajọ omume n’oké ihe.” (Luk 16:10) Inye onwe anyị ọzụzụ n’ihe ndị dị nta ọ́ gaghị eme ka ọ dịkwuoro anyị mfe ime otu ihe ahụ n’ihe ndị dị ukwuu, bụ́ ndị ndụ anyị kpọmkwem pụrụ ịdabere na ha? Dị ka ihe atụ, ịzụ anya anyị ịghara ‘ile nwanyị anya ka agụụ ya wee gụọ anyị’ ga-eme ka o siere anyị ike ịdaba n’omume rụrụ arụ. (Matiu 5:28) Dị ka o kwesịrị, ụkpụrụ a metụtara ma ndị ikom ma ndị inyom. Ọ bụrụ na anyị azụọ uche anyị ‘ịdọta ihe nile ọ bụla a na-echepụta n’agha,’ e nwechaghị ihe ize ndụ na anyị ga-emehie n’ụzọ dị oké njọ n’okwu ma ọ bụ n’omume.—2 Ndị Kọrint 10:5.
N’eziokwu, ịdọ aka ná ntị na-esikarị ike nnakwere, ọ pụkwara iyi ihe na-akpagide mmadụ akpagide. (Ndị Hibru 12:11) Ma, eze ahụ maara ihe na-emesi anyị obi ike na ọ bụrụ na anyị ejide ịdọ aka ná ntị, okporo ụzọ anyị ga-adị mma iji nwee ọganihu. Dị nnọọ ka ọzụzụ kwesịrị ekwesị si eme ka o kwe onye na-agba ọsọ omume ịgbasi ọsọ ike n’adaghị ma ọ bụ merụọ onwe ya ahụ, ijide ịdọ aka ná ntị na-enyere anyị aka ịnọgide na-aga n’akwụsịghị akwụsị n’ụzọ na-eduga ná ndụ, ma ghara ịda. N’ezie, anyị aghaghị ịkpachara anya banyere okporo ụzọ anyị na-ahọrọ.
Zere ‘Okporo Ụzọ Ndị Na-emebi Iwu’
Solomọn ji echiche nke ịdị ngwa na-adọ aka ná ntị, sị: “Abala n’okporo ụzọ ndị na-emebi iwu, agakwala n’ihu n’ụzọ ndị ọjọọ. Zere ya, agabigala n’ime ya; wezụgara ya onwe gị, gabiga. N’ihi na ha adịghị arahụ ụra, ọ bụrụ na ha adịghị eme ihe ọjọọ; a napụwokwa ụra ha n’ike, ọ bụrụ na ha adịghị eme ka mmadụ sụọ ngọngọ. N’ihi na ha eriwo nri nke mmebi iwu, ọ bụkwa mmanya nke ihe ike ka ha na-aṅụ.”—Ilu 4:14–17.
Ndị na-emebi iwu, bụ́ ndị Solomọn chọrọ ka anyị zere ụzọ ha, na-eji omume ọjọọ ha akwado onwe ha. Ime ihe ọjọọ bụụrụ ha ihe oriri na ihe ọṅụṅụ. Ha enweghị ike ihi ụra ọ gwụla ma ha mere ihe ike. Ha onwe ha rụrụ arụ! Ànyị pụrụ ichebe obi anyị n’ezie mgbe anyị na ha na-akpakọrịta? Lee ihe nzuzu ọ bụ ‘ịga n’ihu n’ụzọ ndị ọjọọ’ site n’ikpughepụ onwe anyị nye ihe ike ndị a na-egosi n’ihe ka ọtụtụ n’ihe omume ntụrụndụ ndị e nwere n’ụwa taa! Ịgbalịsi ike inwe obi ọmịiko adịghị ekwekọ n’ikiri ihe ọjọọ ndị na-emebi akọ na uche bụ́ ndị a na-egosi na telivishọn ma ọ bụ n’ihe nkiri sịnịma.
Nọgide n’Ìhè Ahụ
Ka Solomọn ka ji okporo ụzọ na-eme ntụnyere, o kwupụtara, sị: “Ma okporo ụzọ ndị ezi omume dị ka ìhè na-enwu enwu, nke na-amụ aga n’ihu n’ihu ruo mgbe chi bọchara.” (Ilu 4:18) A pụrụ iji ịmụ Bible na ịgbalị itinye ihe ọ na-ekwu n’ọrụ ná ndụ tụnyere ịmalite njem n’ọchịchịrị nke isi ụtụtụ. Ka chi na-abọtụ, ọ pụrụ isiri anyị ike ịhụ ihe ọ bụla. Ma ka chi ji nke nta nke nta na-abọ, anyị na-eji nwayọọ nwayọọ na-amata ihe ndị dị anyị gburugburu. N’ikpeazụ, anyanwụ na-awa nke ọma, anyị na-ahụzukwa ihe nile. Ee, eziokwu ahụ na-eji nke nta nke nta edokwu anyị anya ka anyị na-anọgidesi ike na-eji ndidi na ịdị uchu na-amụ Akwụkwọ Nsọ. Inye obi anyị nri ime mmụọ dị oké mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-echebe ya pụọ n’echiche ụgha.
A na-ejikwa nke nta nke nta ekpughe ihe amụma Bible pụtara ma ọ bụ ịdị mkpa ha. Amụma na-edo anyị anya ka mmụọ nsọ Jehova na-amụkwasị ìhè na ha nakwa ka a na-emezu ha site n’ihe ndị na-eme n’ụwa ma ọ bụ n’ahụmahụ dị iche iche nke ndị Chineke na-enwe. Kama iji enweghị ndidi malite ịkọ nkọ banyere mmezu ha, ọ dị anyị mkpa ichere ka ‘ìhè ahụ mụrụ gawa n’ihu n’ihu.’
Gịnị banyere ndị na-ajụ nduzi Chineke site n’ịjụ ije ije n’ìhè ahụ? “Ụzọ ndị na-emebi iwu dị ka ọchịchịrị,” ka Solomọn na-ekwu. “Ha amaghị ihe ọ bụ ha ji asụ ngọngọ.” (Ilu 4:19) Ndị na-emebi iwu dị ka nwoke na-akpọbi ụkwụ n’ọchịchịrị n’amaghị ihe na-akpọbi ya ụkwụ. Ọbụna mgbe ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke yiri ka hà na-enwe ihe ịga nke ọma n’ihi ajọ omume ha, ihe yiri ihe ịga nke ọma ha na-enwe na-adịru nanị nwa oge. Ọbụ abụ ahụ bụrụ banyere ndị dị otú ahụ, sị: “N’ezie ọ bụ n’ebe nile na-alọ alọ ka Ị na-edo ha: I [Jehova] mewo ka ha daa ruo ntikpọ.”—Abụ Ọma 73:18.
Nọgide Na-eche Nche
Eze Israel ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Nwa m, ṅaa ntị n’okwu m nile; tọọ ntị gị n’ala n’okwu ọnụ m nile. Ekwela ka ha si n’anya gị abụọ wezụga onwe ha; debe ha n’etiti obi gị. N’ihi na ndụ ka ha bụụrụ ndị na-achọta ha, ha bụkwa ihe na-agwọ anụ ahụ ha nile. Karịa ihe ndebe gị nile chebe obi gị; n’ihi na site na ya ka mpụta nile nke ndụ dị.”—Ilu 4:20-23.
Ihe nlereanya Solomọn n’onwe ya na-agba akaebe uru ndụmọdụ nke ichebe obi bara. N’eziokwu, “nwa ka [ọ] bụụrụ” nna ya n’oge ọ bụ onye ntorobịa ma nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova ruo oge o mere nnọọ okenye. Ma, Bible na-akọ, sị: “O ruo, na mgbe agadi Solomọn, na ndị inyom [ala ọzọ] ya wezụgara obi ya ka o soo chi ọzọ: obi ya ezughịkwa okè n’ebe Jehova, bụ́ Chineke ya, nọ, dị ka obi Devid, bụ́ nna ya.” (1 Ndị Eze 11:4) Ma e cheghị ya nche mgbe nile, a pụrụ ịrata ọbụna obi kasị mma ime ihe ọjọọ. (Jeremaịa 17:9) Anyị aghaghị ime ka ihe ncheta ndị dị n’Okwu Chineke dịrị nnọọ n’obi anyị—‘n’etiti ya.’ Nke a na-agụnye nduzi ahụ e nyere n’isi nke 4 nke Ilu.
Nyochaa Ọnọdụ Obi Gị
Ànyị na-echebe obi ihe atụ anyị n’ụzọ na-aga nke ọma? Ànyị pụrụ isi aṅaa mara ọnọdụ nke mmadụ ime anyị? “Ọnụ site n’ihe nke obi nwebigaara ókè na-ekwu okwu,” ka Jisọs Kraịst kwuru. (Matiu 12:34) O kwukwara, sị: “N’obi ka ajọ echiche nile, igbu mmadụ nile, ịkwa iko nile nke ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di, ịkwa iko nile, ohi nile, àmà ụgha nile, nkwulu nile, si apụta.” (Matiu 15:19, 20) Ee, okwu na omume anyị na-egosi ihe dị ukwuu banyere ihe ndị dị anyị n’obi.
N’ụzọ dabara adaba, Solomọn na-adụ anyị ọdụ, sị: “Si n’ebe ị nọ wezụga ọnụ na-ekwu ihe gbagọrọ agbagọ, meekwa ka egbugbere ọnụ nke na-ekwuhie ekwuhie dị anya n’ebe ị nọ. Ka anya gị abụọ legide n’ihu, ka mbubere anya gị leziekwa n’ihu gị. Mee ka okporo ụzọ nke ụkwụ gị abụọ dị larịị, ka e doziekwa ụzọ gị nile. Ewezụgala onwe gị n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe: si n’ihe ọjọọ wezụga ụkwụ gị.”—Ilu 4:24–27.
N’iburu ndụmọdụ Solomọn n’uche, ọ dị anyị mkpa inyocha okwu anyị na omume anyị. Ọ bụrụ na anyị gaje ichebe obi anyị ma na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ, anyị aghaghị izere okwu ụgha na aghụghọ. (Ilu 3:32) Ya mere, anyị kwesịrị iji ekpere na-atụgharị uche n’ihe okwu na omume anyị na-ekpughe banyere anyị. Mgbe ahụ, ka anyị chọọ enyemaka Jehova iji dozie adịghị ike ọ bụla anyị chọpụtara.—Abụ Ọma 139:23, 24.
Karịsịa, ka ‘anya anyị abụọ na-elegide n’ihu.’ Ka anyị na-elekwasị ha n’ihe mgbaru ọsọ nke iji mkpụrụ obi anyị dum na-ejere Nna anyị nke eluigwe ozi. (Ndị Kọlọsi 3:23) Ka ị na-agbaso ụzọ ziri ezi dị otú ahụ n’onwe gị, ka Jehova mee ka i nwee ihe ịga nke ọma ‘n’ụzọ gị nile,’ ka ọ gọziekwa gị n’ụba maka ịṅa ntị na ndụmọdụ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ bụ́ ‘ichebe obi gị.’
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụghị ezigbo aha ya.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 22]
Ị̀ na-ezere ntụrụndụ na-egosi ime ihe ike?
[Foto dị na peeji nke 21]
Rite uru na ndụmọdụ nke ndị nwere ahụmahụ
[Foto dị na peeji nke 23]
Ịdọ aka ná ntị adịghị adọla gị azụ
[Foto dị na peeji nke 24]
Nọgidesie ike n’ọmụmụ Bible gị