Ntiwapụ nke Ịkpọasị
“Ndị mmadụ adịghị aghọta ndị ha kpọrọ asị ma ọlị.”—JAMES RUSSELL LOWELL, ONYE EDEMEDE NA ỌKÀ N’IDOZI OKWU.
O YIRI ka ịkpọasị ọ̀ gbara anyị gburugburu taa. Aha ndị dị ka East Timor, Kosovo, Liberia, Littleton, na Sarajevo—nakwa Nazi nke oge a, onye na-eme ihe ike, na onye kwere na ndị ọcha ka ndị isi ojii mma—enwewo mmetụta dị njọ n’obi anyị, tinyere onyinyo nke ebe ndị e ji ọkụ laa n’iyi, ili ìgwè mmadụ bụ́ ndị a ka gwuru ọhụrụ, na ozu ndị mmadụ, bụ́ ndị na-adịghị apụ apụ n’obi anyị.
Atụmanya a na-enwe maka ọdịnihu, nke ịkpọasị, esemokwu, na ihe ike na-agaghị adị na ya, akụwo afọ n’ala. Danielle Mitterand, bụ́ nwunye president ndị France nke nwụrụ anwụ, chetara oge ọ bụ agbọghọbịa, sị: “Ndị mmadụ nwere atụmanya ibi n’ahụ iru ala n’etiti ọha mmadụ dị n’otu bụ́ nke ha pụrụ ịtụkwasị obi; inwe obi iru ala ibi n’etiti ndị ọzọ na iso ha biri; ha nwere atụmanya nke ibi ndụ ezi ahụ ike, nke udo, na nke dị ùgwù n’ụwa nke kwụsiri ike ma na-emesapụ aka bụ́ nke ga-elekọta ha.” Gịnị meziri ihe mgbaru ọsọ ndị ahụ? Ọ kwara arịrị, sị: “N’eziokwu, iri afọ ise gasịrị, e yiri atụmanya anyị egwu.”
A pụghị nnọọ ileghara mmaliteghachi nke ịkpọasị n’oge a anya. Ọ na-agbasawanye ebe nile, a na-ahụkwa ya n’ụdị na-ajọwanye njọ. Ntiwapụ nke omume ịkpọasị na-enweghị isi, nke nke ọ bụla na-eyikwa ka ọ ka nke bu ya ụzọ njọ, emewo ka echiche ịnọ ná nchebe onwe onye, nke ọtụtụ nde mmadụ na-ejighị akpọrọ ihe belata. Ọ bụrụgodị na a kpọghị anyị asị n’ebe obibi anyị ma ọ bụ ná mba anyị, a ga-akpọ anyị asị n’ebe ọzọ. Ikekwe anyị na-ahụ ihe àmà ya kwa ụbọchị na telivishọn n’oge akụkọ ụwa na okwu ndị a kpụ n’ọnụ. E si ọbụna n’Internet agbasa ụfọdụ n’ime ya. Tụlee ihe atụ ole na ole.
N’afọ iri gara aga, e nwere ịrị elu nke ịhụ mba n’anya n’ụdị a na-enwetụbeghị mbụ. “Ịhụ mba n’anya,” ka Joseph S. Nye, Jr., bụ́ onye nduzi nke Ụlọ Ọrụ Harvard Maka Ihe Ndị Na-eme ná Mba Ọzọ, kwuru, “na-aghọ ihe na-agbawanye mkpọrọgwụ n’akụkụ ka ukwuu n’ụwa, ọ bụghị ihe na-ebelata ebelata. Kama inwe otu obodo nta zuru ụwa ọnụ, e nwere obodo nta dị iche iche gburugburu ụwa bụ́ ndị na-akpa ókè n’etiti ha na ibe ha karị. N’aka nke ya, nke ahụ na-amụba ohere maka ịlụ ọgụ.”
Ụdị ndị ọzọ nke ịkpọasị apụtaghị nnọọ ìhè, ha dị ná mba ma ọ bụ ọbụna n’agbata obi, n’ụzọ zoro ezo. Mgbe mmadụ ise na-eme ihe ike gburu otu agadi nwoke bụ́ onye Sikh na Canada, ihe omume a “mesiri ike ihe ụfọdụ ndị lere anya dị ka mmaliteghachi nke mpụ ịkpọasị ná mba a na-ajakarị mma maka ikwe agbụrụ ọzọ nọrọ.” Na Germany, mgbe mwakpo ndị na-emebiga ihe ókè na-awakpo ndị na-esighị n’agbụrụ ha belatasịrị n’esepụghị aka n’afọ ndị bu ụzọ, ọ rịkwara elu ruo pasenti 27 na 1997. “Ọ bụ ihe omume na-akụda mmụọ,” ka Minista Na-ahụ Maka Ihe Ndị Na-eme n’Ime Mba bụ́ Manfred Kanther, kwuru.
N’ebe ugwu Albania, otu akụkọ na-ekpughe na ihe karịrị ụmụaka 6,000 fọrọ nke nta ka ha bụrụ ndị a tụrụ mkpọrọ n’ebe obibi ha n’ihi egwu nke ịbụ ndị ndị iro ezinụlọ ha ga-agbagbu. Ụmụaka ndị a na-ata ahụhụ n’ihi ibu iro dị n’etiti ezinụlọ ha na ezinụlọ ndị ọzọ, “bụ́ nke tisasịworo ndụ nke ọtụtụ puku ezinụlọ.” Na United States, dị ka Ụlọ Ọrụ Etiti nke Na-eme Nchọpụta (FBI) si kwuo, “ajọ mbunobi agbụrụ kpaliri ihe karịrị mpụ ịkpọasị 7,755 e mere na 1998 bụ́ ndị a kọọrọ ụlọ ọrụ FBI.” Ihe ụfọdụ e bu n’obi wee mee mpụ ịkpọasị ndị ọzọ gụnyere ajọ mbunobi banyere okpukpe, agbụrụ ma ọ bụ mba a mụrụ mmadụ, na nkwarụ.
Ọzọkwa, isi akụkọ ndị na-agba n’akwụkwọ akụkọ kwa ụbọchị na-arụtụ aka ná ntiwapụ nke ịkpọ ndị si mba ọzọ asị, bụ́ nke a na-egosipụta n’ụzọ bụ́ isi n’ebe ndị gbara ọsọ ndụ nọ, bụ́ ndị ọnụ ọgụgụ ha karịrị nde mmadụ 21 ugbu a. Ọ dị mwute ikwu na ihe ka ọtụtụ ná ndị na-egosipụta ịkpọasị n’ebe ndị si mba ọzọ nọ bụ ndị na-eto eto, ndị ndị ọchịchị na-adịghị eji ihe akpọrọ ihe na ndị ọzọ bụ́ ndị na-achọ onye ha ga-ebulara ụta ya, kpaliri. Ihe àmà ndị na-apụtachaghị ìhè nke otu omume ahụ, na-agụnye enweghị ntụkwasị obi, ekweghị ibe nọrọ, na inwe echiche na-ezighị ezi banyere onye ọ bụla dị iche.
Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị na-akpata ntiwapụ nke ịkpọasị a? Gịnịkwa ka a pụrụ ime iji wepụ ịkpọasị? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 2]
Ihu akwụkwọ, n’elu: UN PHOTO 186705/J. Isaac
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
Daud/Sipa Press