‘Oge Mweghachi’ Dị Nso!
Oge na-adịghị anya tupu Jisọs arịgoro eluigwe, ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi jụrụ ya, sị: “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ n’oge a ka Ị [na-eweghachi alaeze ahụ n’Israel, NW]?” Azịza Jisọs gosiri na oge ụfọdụ ga-agafe tupu Alaeze ahụ abịa. N’oge ahụ, ụmụazụ ya ga-enwe ọrụ dị ukwuu ịrụ. Ha ga-abụ ndị àmà Jisọs “n’ime Jerusalem, na n’ime Judia na Sameria nile, ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.”—Ọrụ 1:6-8.
A PỤGHỊ ịrụzu ọrụ ahụ n’ime ụbọchị, izu, ma ọ bụ ọnwa ole na ole. Otú ọ dị, n’egbutụghịdị oge, ndị na-eso ụzọ ahụ malitere ime nkwusa. Ma ha nọgidere na-enwe mmasị n’ihe banyere mweghachi. Pita onyeozi gwara ìgwè mmadụ buru ibu nke gbakọtara na Jerusalem banyere ya, sị: “Chegharịanụ, chigharịakwanụ, ka e wee hichapụ mmehie nile unu, ka oge inwe ume ndụ wee si n’ihu Onyenwe anyị bịa otú a; ka O wee zitekwa Kraịst ahụ Onye e buru ụzọ họpụtara unu, bụ́ Jisọs: Onye eluigwe aghaghị ịnara nke ọma ruo [oge a ga-eweghachi ihe nile, NW], bụ́ oge nke Chineke kwuru okwu banyere ha site n’ọnụ ndị amụma Ya dị nsọ ndị sitere ná mmalite oge a.”—Ọrụ 3:19-21.
Oge ‘mweghachi’ ndị a ga-eweta “oge inwe ume ndụ” sitere n’aka Jehova. Mweghachi ahụ e buru n’amụma ga-abịa ná nkebi abụọ. Nke mbụ, a ga-enwe mweghachi ime mmụọ na-enye ume ọhụrụ, bụ́ nke na-ewere ọnọdụ ugbu a. Nke abụọ, iguzobe paradaịs a na-ahụ anya n’elu ala ga-esochi nke a.
Oge Mweghachi Amalite
Dị ka Pita onyeozi gwara ìgwè mmadụ ahụ na Jerusalem, eluigwe ‘naara Jisọs nke ọma.’ Otú ahụ ka ọ dị ruo 1914, bụ́ mgbe Jisọs weere ike ọchịchị ya ma malite ịchị dị ka Eze Chineke họpụtara. Pita buru n’amụma na n’oge ahụ, Jehova ‘ga-ezite’ Ọkpara ya n’echiche bụ́ na Ọ ga-ekwe ka Jisọs rụzuo ọrụ ya dị ka onye bụ́ isi ná nzube Chineke. Bible na-akọwa ihe omume ahụ n’ụzọ ihe atụ, sị: “[Nzukọ eluigwe nke Chineke] wee mụpụta Ọkpara, bụ́ Nwa nwoke [Alaeze Chineke nke dị n’aka Jisọs Kraịst], Onye ga-eji mkpanaka ígwè zụọ mba nile dị ka atụrụ.”—Mkpughe 12:5.
Ma mba dị iche iche enweghị ọchịchọ ọ bụla ido onwe ha n’okpuru ịchịisi Kraịst. N’ezie, ha na-ekwugide ndị ya na-eguzosi ike n’ihe n’ụwa, bụ́ ndị a maara taa dị ka Ndịàmà Jehova. Dị ka ndị ozi bu ha ụzọ, Ndịàmà amalitelarị “ọrụ ịgba àmà banyere Jisọs” n’egbughị oge. (Mkpughe 12:17, NW) Mmegide a na-emegide ọrụ ndị Kraịst a nwere obi eziokwu na-arụ biiri ọkụ site n’otu mba gaa n’ọzọ. Na 1918, a kpụpụrụ ndị ndú so ná ndị na-arụ ọrụ n’isi ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Brooklyn, New York n’ụlọikpe, n’ebubo ndị na-abụghị eziokwu ma maa ha ikpe n’ụzọ na-ezighị ezi ịnọ na mkpọrọ ruo ogologo oge. Ruo oge ụfọdụ, o yiri ka ọrụ ịgba àmà nke oge a ‘ruo ebe ụwa sọtụrụ’ ọ̀ na-aga ịkwụsị.—Mkpughe 11:7-10.
Otú ọ dị, na 1919, a tọhapụrụ ndị ahụ na-arụ n’isi ụlọ ọrụ bụ́ ndị a tụrụ mkpọrọ ma mesịa kwuo na aka ha dị ọcha n’ebubo ụgha ndị ahụ e boro ha. Ha egbughị oge ọ bụla n’ịmaliteghachi ọrụ mweghachi ime mmụọ ahụ. Kemgbe ahụ, ndị Jehova anọwo na-enwe ọganihu ime mmụọ na-enweghị atụ.
A malitere ọrụ mkpọsa sara mbara iji kụziere ndị nke mba nile ime ihe Kraịst nyere ụmụazụ ya iwu ime. (Matiu 28:20) Lee ihe na-enye ume ọhụrụ ọ bụ ịhụ ụfọdụ ndị gosipụtaburu àgwà anụmanụ ka ha na-agbanwe echiche ha! Ha tụpụrụ mmadụ ochie ahụ, bụ́ nke na-arụpụta àgwà ndị dị ka “ọnụma,” “nkwulu,” na “ikwu okwu ihere,” ma yikwasị mmadụ ọhụrụ ahụ, bụ́ “nke a na-eme ya ka ọ dị ọhụrụ ruo ná mmazu dị ka onyinyo nke [Chineke bụ́] Onye kere ya si dị.” N’ụzọ ime mmụọ, a na-emezu ọbụna ugbu a ihe Aịsaịa onye amụma kwuru, sị: “Anụ ọhịa wolf [onye na-akpabu àgwà dị ka anụ ọhịa wolf] na nwa atụrụ [onye dị umeala n’obi] ga-anọkwa, agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa; nwa ehi na nwa ọdụm na nwa anụ e mere ka ọ maa abụba ga-adịkwa n’otu ebe.”—Ndị Kọlọsi 3:8-10; Aịsaịa 11:6, 9.
Mweghachi Ndị Ọzọ Dị Nso!
Tụkwasị ná mweghachi ahụ meworo ka e nwee paradaịs ime mmụọ taa, oge mbara ụwa anyị ga-aghọ paradaịs a na-ahụ anya na-abịa ngwa ngwa. Obere akụkụ nke ụwa bụ paradaịs mgbe Jehova debere nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, n’ogige Iden. (Jenesis 1:29-31) Ọ bụ ya mere anyị pụrụ iji kwuo banyere Paradaịs dị ka nke e weghachiri. Otú ọ dị, tupu nke ahụ emee, a ghaghị ikpochapụ okpukpe ndị na-adịghị ewetara Chineke nsọpụrụ n’ụwa. Òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa a ga-ahụ maka nke a. (Mkpughe 17:15-18) E mesịa, a ga-ebibi òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị na òtù azụmahịa, tinyere ndị na-akwado ha. N’ikpeazụ, a ga-akpọchi ndị iro ikpeazụ nke Chineke—Setan Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya—ruo otu puku afọ—oge ọrụ mweghachi ahụ ga-ewe. N’oge ahụ, “obi ga-atọ ọzara na ala kpọrọ nkụ ụtọ; ala ihe na-adịghị ga-etegharịkwa egwu ọṅụ, gbawaa okooko ọhịa, dị ka rose.” (Aịsaịa 35:1) Ụwa nile agaghị enwe nsogbu ọzọ. (Aịsaịa 14:7) Ọbụna a ga-eweghachi ọtụtụ nde ndị nwụworonụ ná ndụ n’elu ala. Mmadụ nile ga-enweta abamuru na-eweghachi eweghachi nke àjà mgbapụta ahụ. (Mkpughe 20:12-15; 22:1, 2) A gaghị enwe ndị ìsì, ndị ntị chiri, ma ọ bụ ndị ngwụrọ n’ụwa. “Onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” (Aịsaịa 33:24) N’oge na-adịghị anya mgbe Ọchịchị Puku Afọ Kraịst ahụ gasịrị, a ga-atọhapụ Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya ruo nwa oge, ha ga-ahụkwa otú e siworo mezuo nzube Chineke maka ụwa ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ. N’ikpeazụ, a ga-ebibi ha ruo mgbe ebighị ebi.—Mkpughe 20:1-3.
Mgbe ụwa ga-eru ná ngwụsị nke otu puku afọ nke mweghachi ahụ, “ihe ọ bụla nke na-eku ume” ga-eto Jehova, ha ga-emekwa otú ahụ ruo mgbe nile ebighị ebi. (Abụ Ọma 150:6) Ị̀ ga-eso n’ime ha? Ị pụrụ iso.