Anyị Pụrụ Iji Di na Nwunye Mbụ Mụta Ihe
CHINEKE nyochara mbara ala bụ́ Ụwa. Ọ nọ na-akwadebe ya ka ọ bụrụ ebe mmadụ ga-ebi. Ọ hụrụ na ihe nile ọ na-eke dị mma. N’ezie, mgbe ọrụ a gwụsịrị, o kwupụtara na ọ “dị mma nke ukwuu.” (Jenesis 1:12, 18, 21, 25, 31) Otú ọ dị, tupu o ruo ná nkwubi okwu zuru ezu dị otú ahụ, Chineke kwuru banyere otu ihe nke ‘na-adịghị mma.’ N’ezie, ọ dịghị ihe ọ bụla Chineke mere nke na-ezughị okè. Ọ bụ nanị na ihe o kere eke ezubeghị ezu. “Ọ dịghị mma ka mmadụ ahụ nọrọ nanị ya,” ka Jehova kwuru. “M ga-emere ya onye inyeaka kwesịrị ya.”—Jenesis 2:18.
Ọ bụ nzube Jehova ka ụmụ mmadụ dịrị ndụ ebighị ebi nwee ahụ ike, obi ụtọ, na akụ̀ na ụba n’ime paradaịs elu ala. Nna nke ihe nile a kpọrọ mmadụ bụ Adam. Nwunye ya, bụ́ Iv, ghọrọ “nne mmadụ nile nwere ndụ.” (Jenesis 3:20) Ọ bụ ezie na ụwa jupụtara ugbu a n’ọtụtụ ijeri ụmụ ha, ụmụ mmadụ ezughị okè ma ọlị.
Akụkọ banyere Adam na Iv bụ nke a maara nke ọma. Ma olee ezi uru ọ baara anyị? Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ahụmahụ nke di na nwunye mbụ ahụ?
“Nwoke na Nwanyị Ka O Kere Ha”
Mgbe Adam nọ na-agụ anụmanụ dị iche iche aha, ọ hụrụ na ha nwechara ndị ibe nakwa na ya enweghị. Ya mere mgbe ọ hụrụ onye ahụ e kere eke mara mma nke Jehova sitere n’ọgịrịga ya kpụọ, ọ ṅụrịrị ọṅụ. Mgbe ọ ghọtara na nwanyị ahụ bụ akụkụ nke ahụ ya n’ụzọ pụrụ iche, Adam kwuru n’olu dara ụda, sị: “Nke a bụ nnọọ ọkpụkpụ si n’ọkpụkpụ m pụta, na anụ ahụ si n’anụ ahụ m pụta: nke a ka a ga-akpọ Nwanyị, n’ihi na e wepụtara nke a n’ahụ Nwoke.”—Jenesis 2:18-23.
“Onye inyeaka” dị nwoke ahụ mkpa. Ugbu a, o nwere otu nke kwesịrị ya nnọọ. Iv ruru eru nke ọma ịbụ onye inyeaka kwesịrị Adam—n’ilekọta ebe obibi ha bụ́ ubi na anụmanụ dị iche iche, n’ịmụ ụmụ, nakwa n’inye mkpali na nkwado n’ụzọ ọgụgụ isi bụ́ nke ezi onye ibe na-enye.—Jenesis 1:26-30.
Jehova nyere di na nwunye ahụ ihe nile pụrụ ịbụ ọchịchọ ha n’ụzọ ziri ezi. Site n’ịkpọrọ Iv gakwuru di ya, wee sikwa otú ahụ kwadoo ọlụlụ ha, Chineke malitere njikọ bụ́ alụmdi na nwunye na ezinụlọ bụ́ ndị a gaje isite na ha hazie ọha mmadụ. Ihe ndekọ Jenesis ahụ na-ekwu, sị: “Nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya, rapara n’ahụ nwunye ya: ha ewee ghọọ otu anụ ahụ.” Mgbe Jehova gọzikwara di na nwunye mbụ ahụ ma gwa ha ka ha mụọ ọmụmụ, o doro anya na o bu n’obi na a ga-amụbata nwa ọ bụla n’ime ezinụlọ nke hụrụ ya n’anya, nke nwere nne na nna ga-elekọta ya.—Jenesis 1:28; 2:24.
“N’onyinyo Chineke”
Adam bụ nwa Chineke zuru okè, onye e mere ‘n’onyinyo na oyiyi’ Ya. Ma ebe ọ bụ na “Chineke bụ Mmụọ,” iyi ya enweghị ike ịbụ n’ọdịdị elu ahụ. (Jenesis 1:26; Jọn 4:24) Iyi ya bụ n’ihe metụtara àgwà ndị mere ka mmadụ dị nnọọ elu karịa anụmanụ. Ee, site ná mmalite a kụnyere n’ime mmadụ àgwà bụ́ ịhụnanya, amamihe, ike, na ikpe ziri ezi. E nyere ya ikike inwere onwe ya ime nhọrọ nakwa ikike iji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe. Ụkpụrụ omume, ma ọ bụ akọ na uche o bu pụta ụwa, mere ka o nwee ike ịmata ọdịiche dị n’etiti ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. Mmadụ nwere ikike ọgụgụ isi, nke na-eme ka o nwee ike ịtụgharị uche n’ihe mere ụmụ mmadụ ji dịrị ndụ, inweta ihe ọmụma banyere Onye Okike ya, meekwa ka ya na Onye ahụ malite ịdị na-akpachi anya. N’ịbụ onye e si otú ahụ kwadebe, Adam nwere ihe nile dị ya mkpa iji rụzuo ọrụ ya dị ka onye na-elekọta ọrụ aka Chineke n’ụwa.
Iv Emebie Iwu
Obi abụọ adịghị ya na Adam gwara Iv ozugbo banyere otu ihe nke Jehova machibidoworo iwu: Ha nwere ike iri mkpụrụ sitere n’osisi nile dị n’ebe obibi ha bụ́ ubi ma e wezụga otu—osisi nke ịma ezi ihe na ihe ọjọọ. Ha agajeghị iri ya. Ọ bụrụ na ha emee otú ahụ, ha ga-anwụ n’ụbọchị ahụ.—Jenesis 2:16, 17.
N’oge na-adịghị anya, e welitere otu ihe iseokwu banyere mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro iwu. Otu agwọ bịakwutere Iv, bụ́ nke mmụọ a na-adịghị ahụ anya ji mee ihe dị ka ọnụ na-ekwuru ya. N’iyi onye na-amaghị ihe na-aganụ, agwọ ahụ jụrụ, sị: “Ọ̀ ga-abụ ezie na Chineke sịrị, Unu erila mkpụrụ sitere n’osisi ọ bụla nke ubi a a gbara ogige?” Iv zaghachiri na e kwere ka ha na-eri mkpụrụ osisi ọ bụla ma e wezụga otu. Ma agwọ ahụ kwuziri ihe megidere ihe Chineke kwuru, na-agwa nwanyị ahụ, sị: “Ọ dịghị ọnwụ unu na-aghaghị ịnwụ: n’ihi na Chineke maara na n’ụbọchị unu ga-eri mkpụrụ sitere na ya, mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya unu, unu ewee dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.” Nwanyị ahụ wee malite ịhụ osisi ahụ a machibidoro iwu n’ụdị dị iche. “Osisi ahụ dị mma ihe oriri . . . ọ bụkwa ihe na-agụ anya agụụ ile.” N’ịbụ onye a ghọgburu kpam kpam, Iv mebiri iwu Chineke.—Jenesis 3:1-6; 1 Timoti 2:14.
Mmehie Iv ọ̀ bụ ihe a na-apụghị izere ezere? Ọ dịghị ma ọlị! Were ya na ị nọ n’ọnọdụ ya. Ihe agwọ ahụ zọọrọ gwagburu kpam kpam ihe Chineke na Adam kwuworo. Olee otú ọ ga-adị gị ma ọ bụrụ na onye ị na-amabughị ebo onye ị hụrụ n’anya ma tụkwasị obi ebubo na ọ naghị eme ihe n’eziokwu? Iv gaara emeghachiwo omume n’ụzọ dị iche, na-egosi ịkpọasị na iwe, ọbụna jụ ige ntị. E kwuwerị, ònye ka agwọ bụ ịrụ ezi omume Chineke na ihe di ya kwuru ụka? Iji wee kwanyere ụkpụrụ ịbụisi ùgwù, Iv gaara achọ ka a tụọrọ ya aro tupu o kpebie ihe ọ bụla. Otú ahụkwa ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na e nwee mgbe ọ bụla a gwara anyị ihe megidere ntụziaka Chineke nyere. Ma, Iv tụkwasịrị obi n’okwu Onye Ọnwụnwa ahụ, na-enwe ọchịchọ ikpebiri onwe ya ihe bụ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ka ọ nọgidere na-atụgharị nke a n’uche karị, otú ahụ ka ọ na-agụ ya agụụ karị. Lee ụdị ụzọ o hiere site n’ịnọgide na-enwe ọchịchọ ọjọọ, kama iwepụ ya n’obi ya ma ọ bụ ya na onyeisi ezinụlọ ya ekwurịta ya!—1 Ndị Kọrint 11:3; Jemes 1:14, 15.
Adam Egee Ntị n’Olu Nwunye Ya
N’oge na-adịghị anya Iv rabara Adam n’isonyere ya ná mmehie. Olee otú anyị ga-esi kọwaa nkwenye a o ji akwụsighị ike kwenye? (Jenesis 3:6, 17) O siiri Adam ike ịma onye nke ọ ga-adọnyere úkwù. Ọ̀ ga-erubere Onye Okike ya isi, bụ́ onye nyeworo ya ihe nile, tinyere Iv bụ́ nwunye ya ọ hụrụ n’anya? Adam ọ̀ ga-achọ ntụziaka Chineke n’ihe ọ gaje ime ugbu a? Ka nwoke a ọ̀ ga-esonyere nwunye ya? Adam maara nke ọma na ihe Iv tụrụ anya inweta site n’iri mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro iwu adịghịdị adị. E nyere Pọl onyeozi ike mmụọ nsọ ide, sị: “Ọ bụghịkwa Adam ka a ghọrọ aghụghọ, ma ebe a ghọgburu nwanyị, ọ bụ nwanyị ahụ ka a hụworo na ọ nọ n’ime njehie.” (1 Timoti 2:14) Ya mere Adam ma ụma họrọ ileghara Jehova anya. O doro anya na egwu ọ tụrụ ịbụ onye a ga-ekewapụ n’ebe nwunye ya nọ dị ukwuu karịa okwukwe ya n’ikike Chineke nwere idozi ọnọdụ ahụ.
Ihe Adam mere bibiri ihe. Ihe ọ pụtakwara bụ ogbugbu nke ụmụ nile Jehova ji obi ebere hapụ ya ka ọ mụọ, ebe ọ bụ na a mụrụ ha nile n’amamikpe ọnwụ n’ihi mmehie. (Ndị Rom 5:12) Lee ihe dị ukwuu ọ na-efu inupụ isi n’ihi ịchọ ọdịmma onwe onye nanị!
Ihe Mmehie Kpatara
Mmetụta mbụ mmehie wetara bụ mmechuihu. Kama iji ọṅụ gbara ọsọ ga gwa Jehova okwu, di na nwunye ahụ zoro onwe ha. (Jenesis 3:8) Ọbụbụenyi ha na Chineke kụrụ afọ n’ala. Mgbe a jụrụ ha ajụjụ banyere ihe ha meworo, ha egosighị mwute ọ bụla, n’agbanyeghị na ha abụọ maara na ha emebiela iwu Chineke. Site n’iri mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro iwu, ha jụrụ ịdị mma nke Chineke.
N’ihi ya, Chineke mere ka a mata na ịmụ ụmụ ga-eweta ihe mgbu ka ukwuu. Ọchịchọ Iv ga-adị n’ebe di ya nọ, di ya ga-achịkwa ya. Mgbalị o mere inweta nnwere onwe si otú ahụ rụpụta ihe dị nnọọ iche n’ihe ọ chọrọ. Ugbu a Adam ga-eri ihe ala na-emepụta n’ahụ mgbu. Kama imejụ agụụ na-agụ ya n’adọgbughị onwe ya n’ọrụ n’Iden, ọ ghaghị ịdọlịsi ike iji nweta ihe e ji ebi ndụ, ruo mgbe ọ ga-alaghachi n’ala ebe e siworo kpụọ ya.—Jenesis 3:16-19.
N’ikpeazụ, a chụpụrụ Adam na Iv n’ogige Iden. Jehova sịrị: “Lee, mmadụ ahụ aghọwo ihe dị ka otu onye n’ime anyị, n’ịma ezi ihe na ihe ọjọọ; ma ugbu a, ka o wee ghara isetị aka ya, were mkpụrụ sitere n’osisi ahụ nke ndụ, rie, dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi . . . ” “Ahịrịokwu ahụ erughị n’isi,” ka onye ọkà mmụta bụ́ Gordon Wenham na-ekwu, a hapụkwara anyị itinye ihe fọrọ afọ n’ihe Chineke bu n’uche—ikekwe, “ka m chụpụ ya n’ogige a.” Ihe na-emekarị bụ na onye so dee Bible na-akọ echiche Chineke n’ụzọ zuru ezu. Ma n’ebe a, ka Wenham gara n’ihu na-ekwu, “nhapụ a hapụrụ mmechi okwu ahụ na-egosi ịdị ngwa nke ihe Chineke mere. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ ka kpụ okwu n’ọnụ mgbe a chụpụrụ ha n’ubi ahụ.” (Jenesis 3:22, 23) N’ihi nke ahụ, o doro anya na nkwurịta okwu ọ bụla dị n’agbata Jehova na di na nwunye mbụ ahụ kwụsịrị.
Adam na Iv anwụghị n’anụ ahụ n’ime ụbọchị nke awa 24 ahụ. Otú ọ dị, ha nwụrụ n’ụzọ ime mmụọ. N’ịbụ ndị e kewapụrụ n’ụzọ na-enweghị mmekwata n’ebe Isi Iyi nke ndụ nọ, ọnọdụ ha malitere ịka njọ wee ruo mgbe ha nwụrụ. Cheedị echiche otú ọnwụ mbụ ha nwere ahụmahụ ya ga-esiworị wute ha mgbe nwa mbụ ha bụ́ Ken gburu nwa ha nke abụọ, bụ́ Ebel!—Jenesis 4:1-16.
Mgbe nke ahụ gasịrị, e nwechaghị ọtụtụ ihe a maara banyere di na nwunye mbụ ahụ. A mụrụ nwa ha nwoke nke atọ, bụ́ Set, mgbe Adam dị afọ 130. Adam nwụrụ afọ 800 site na mgbe ahụ, n’afọ ndụ 930, mgbe ọ mụsịrị “ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.”—Jenesis 4:25; 5:3-5.
Ihe Mmụta Dịịrị Anyị
E wezụga ime ka a mata ihe kpatara ọnọdụ ọjọọ nke ọha mmadụ nọ na ya taa, ihe ndekọ banyere di na nwunye mbụ ahụ na-akụzi ihe mmụta gbara ọkpụrụkpụ. Ngosipụta ọ bụla nke adabereghị na Jehova Chineke bụ nnọọ nzuzu. Ndị maara ihe n’ezie na-egosipụta okwukwe na Jehova na n’Okwu ya, ọ bụghị n’ihe ọmụma ha chere na ha nwere n’ụzọ zuru ezu. Ọ bụ Jehova na-ekpebi ihe ọma na ihe ọjọọ, ihe ime ihe ọma pụtakwara bụ irubere ya isi. Ime ihe ọjọọ pụtara imebi iwu ya na ileghara ụkpụrụ ya anya.
Chineke nyere ma ka na-enye ihe a kpọrọ mmadụ ihe nile pụrụ ịbụ ọchịchọ ha—ndụ ebighị ebi, nnwere onwe, afọ ojuju, obi ụtọ, ahụ ike, udo, ọganihu, na nchọpụta nke ihe ọhụrụ dị iche iche. Otú ọ dị, anyị ịnụ ụtọ ihe ndị a nile chọrọ anyị ịghọta na anyị ga-adabere kpam kpam ná Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova.—Eklisiastis 3:10-13; Aịsaịa 55:6-13.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 26]
Adam na Iv—Hà Bụ Nanị Ndị A Kọrọ n’Akụkọ Ifo?
Nkweta bụ́ na a tụfuru paradaịs mbụ n’ihi mmehie bụ nke zuru ebe nile n’etiti ndị Babilọn, ndị Asiria, ndị Ijipt oge ochie, nakwa ndị ọzọ. Ihe na-adịkarị n’ọtụtụ akụkọ ndị ahụ bụ otu osisi nke ndụ bụ́ nke mkpụrụ ya ga-enye ndị na-eri ya ndụ ebighị ebi. Ya mere, ihe a kpọrọ mmadụ na-echeta na ihe dị oké njọ mere n’Iden.
Taa, ọtụtụ ndị na-eleghara ihe ndekọ Bible banyere Adam na Iv anya dị ka nanị akụkọ ifo. Ma, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị ọkà mmụta sayensị kwenyere na agbụrụ mmadụ bụ otu ezinụlọ nke si n’otu onye malite. O siiri ọtụtụ ndị ọkà mmụta okpukpe ike ịgọnarị na mmetụta mmehie mbụ ahụ nke nna nna mmadụ nile mere bụ nke e bufeere ihe a kpọrọ mmadụ. Nkweta bụ́ na mmadụ si n’ihe karịrị otu mmadụ pụta ga-amanye ha ikwu na ọ bụ ọtụtụ ndị nna nna mere otu mmehie mbụ ahụ. N’aka nke ya, nke a ga-arụgide ha ịjụ na ọ bụ Kraịst, bụ́ “Adam ikpeazụ,” gbapụtara ihe a kpọrọ mmadụ. Ma Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya anọghị n’ọnọdụ amaghị nke a ga-eso dị otú ahụ. O doro ha anya na ihe ndekọ Jenesis bụ eziokwu.—1 Ndị Kọrint 15:22, 45; Jenesis 1:27; 2:24; Matiu 19:4, 5; Ndị Rom 5:12-19.