Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w01 1/15 p. 3
  • Gịnị Mere A Ga-eji Zụlite Omume Ọma?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Mere A Ga-eji Zụlite Omume Ọma?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú Anyị Pụrụ Isi Zụlite Omume Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ị̀ Na-achụso Ịdị Mma?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Olee Ụzọ Anyị Pụrụ Isi Nyezuo Ịdị Mma N’okwukwe Anyị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Nara Nkwa Nile Nke Chineke Site N’igosipụta Okwukwe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
w01 1/15 p. 3

Gịnị Mere A Ga-eji Zụlite Omume Ọma?

OTU nwoke katatụrụ ahụ bụ́ onye Japan aha ya bụ Kunihito kwagara United States n’oge na-adịbeghị anya.a N’ime izu ole na ole o rutesịrị, o zutere otu ọnọdụ gaara emebiworo ya ihe ọ na-achụso. Kunihito na-akọ, sị: “Mgbe nna m ukwu jụrụ m ma m̀ pụrụ ịnakwere otu ibu ọrụ, obi kara m nnọọ ịnakwere ya. Ma, ebe a zụliteworo m ile obi umeala anya dị ka omume ọma, azaghachiri m, sị: ‘Amaghị m ma m ga-emeli ya, ma aga m agbalị ike m nile.’ Nye nna m ukwu bụ́ onye America, nke a dara ka a ga-asị na erughị m eru nakwa na obi akaghị m. Mgbe m matara nke ahụ, achọpụtara m na ọ dị m mkpa ime mgbanwe ụfọdụ.”

Maria, bụ́ onye bi na New York City, bụ nwa akwụkwọ maara akwụkwọ nke ọma, nke na-enwe obi ụtọ mgbe nile inyere ụmụ klas ya aka. Juan bụ nwa akwụkwọ ibe ya nke na-abịakwute Maria site n’oge ruo n’oge maka enyemaka. Ma o nwekwara ndọrọ mmekọahụ n’ebe ọ nọ ma gbalịa ịdọrọ mmasị ya. N’agbanyeghị ọchịchọ Maria ịnọgide na-adị ọcha n’omume, o guzogidelighị omume ndọrọ mmekọahụ nke Juan, o wee tinye aka ná mmekọahụ jọgburu onwe ya.

Igosipụta omume ọma n’ụwa taa nke nwere ọdịbendị dịgasị iche na nke rụrụ arụ n’omume bụ ihe ịma aka n’ezie. Ya mere, gịnị mere a ga-eji zụlite omume ọma? Ọ bụ n’ihi na omume ọma na-eme ka obi dị Chineke ụtọ, ihe kakwa ọtụtụ n’ime anyị na-achọ inweta ihu ọma ya n’ezie.

Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-agba ndị na-agụ ya ume ịzụlite omume ọma. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi na-ede, sị: “Ọ bụrụ na [omume ọma, NW] ọ bụla dị, ọ bụrụkwa na otuto ọ bụla dị, na-agụkọnụ ihe ndị a.” (Ndị Filipaị 4:8) Pita onyeozi gbakwara anyị ume itinye ‘mgbalị siri ike n’inyezu omume ọma n’okwukwe anyị.’ (2 Pita 1:5) Ma, gịnị bụ omume ọma? À pụrụ ịkụzi ya n’ọnụ ụlọ klas? Olee otú anyị pụrụ isi zụlite ya?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a A gbanwewo aha ụfọdụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya