Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w01 1/15 p. 31
  • Ọkwà Pụrụ Iche

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọkwà Pụrụ Iche
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụzọ Òtù Na-achị Isi Si Dị Iche n’Ebe Ụlọ Ọrụ Iwu Kwadoro Dị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Inye Òtù Na-achị Isi Nkwado n’Oge A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ọrụ “Ohu ahụ Kwesịrị Ntụkwasị Obi, Onye Nwekwara Uche” Na-arụ
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Ịkwụsi Ike n’Akụkụ Kraịst na Ohu Ya Na-ekwesị Ntụkwasị Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
w01 1/15 p. 31

Ọkwà Pụrụ Iche

NÁ MMECHI nke nzukọ kwa afọ nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania n’October 7, 2000, onyeisi oche ya bụ́ John E. Barr nke so n’Òtù Na-achị Isi mara ọkwa pụrụ iche. Ọkwa a mesikwuru ike okwu ndị Theodore Jaracz na Daniel Sydlik bu ụzọ kwuo n’ụbọchị ahụ.—Lee peeji nke 12-16 na 28-31 nke magazin a.

N’ikwu otu ihe dị nnọọ ịrịba ama, Nwanna Barr kwuru, sị: “‘Ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche’ na Òtù Na-achị Isi ya abụwo ndị e nyefere ọrụ ndị ka elu bụ́ ndị gụnyekwara nnọọ ọtụtụ ihe karịa ndị e nyere ụlọ ọrụ ndị iwu kwadoro. E nwere ihe ndị a kpara ókè na ha n’akwụkwọ ụkpụrụ ọrụ nke ụlọ ọrụ nke ọ bụla dị otú ahụ. Otú ọ dị, Onyenwe anyị, bụ́ Jisọs Kraịst, emewo òtù ohu ahụ onyeisi nke ‘ihe nile o nwere,’ ma ọ bụ nke ọdịmma Alaeze ya n’elu ụwa ebe a.”—Matiu 24:45-47.

Banyere ụlọ ọrụ Pennsylvania, Nwanna Barr gbakwụnyere, sị: “Kemgbe e debanyere ya n’akwụkwọ n’ụzọ iwu kwadoro na 1884, Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania arụwo ọrụ dị mkpa n’akụkọ ihe mere eme anyị nke oge a. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ ụlọ ọrụ nkịtị iwu kwadoro bụ́ nke ‘ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche’ na-eji eme ihe mgbe ọ dị mkpa.”

N’okwu ha, Nwanna Sydlik na Nwanna Jaracz kọwara na eziokwu ahụ bụ́ na e nyefere “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” ihe nile Onyenwe anyị nwere n’ụwa adịghị egbochi òtù ohu ahụ ikwe ka ndị ikom ruru eru n’etiti “atụrụ ọzọ” ahụ buru ibu ọrụ ụfọdụ metụtara nhazi. (Jọn 10:16) Ọ dịghịkwa ihe dabeere n’Akwụkwọ Nsọ mere a ga-eji sie ọnwụ na ndị nduzi nile nke ụlọ ọrụ iwu kwadoro bụ́ ndị Ndịàmà Jehova ji eme ihe ga-abụ ndị Kraịst e tere mmanụ.

Nwanna Barr gwara ndị na-ege ntị na na nso nso a, ndị so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova bụ́ ndị nọworo na-eje ozi dị ka ndị nduzi na ndị isi ji aka ha hapụ ọkwá ha nwere na bọọdụ ndị nduzi nke ụlọ ọrụ nile “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” ji eme ihe na United States. A họpụtara ụmụnna ndị a pụrụ ịtụkwasị obi bụ́ ndị sitere n’ìgwè atụrụ ọzọ ahụ iji nọchie ha.

Mkpebi a bara uru n’ezie. Ọ ga-enye ndị so n’Òtù Na-achị Isi ohere itinye oge ka ukwuu n’ịkwadebe nri ime mmụọ ma sikwa otú ahụ na-elekọta mkpa ime mmụọ nke òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ.

Ná mmechi, onyeisi oche ahụ gwara ndị na-ege ya ntị nwere obi ụtọ, sị: “Ọ bụ ezie na e nyewo ndị nlekọta nwere ahụmahụ ọrụ dịgasị iche iwu kwadoro na ndị metụtara nhazi, . . . ha nile na-eje ozi n’okpuru nduzi ime mmụọ nke Òtù Na-achị Isi. . . . Anyị nile ji ekpere na-elegara Jehova anya maka ngọzi ya ná mgbalị anyị gbakọrọ aka na-eme n’ime uche ya, iji wetara aha ukwu ya nsọpụrụ na otuto.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya