Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w01 2/1 p. 3
  • Ibi Ndụ n’Etiti Ihe Ize Ndụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ibi Ndụ n’Etiti Ihe Ize Ndụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịchọta Nchebe n’Ụwa nke Jupụtara n’Ihe Ize Ndụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Azịza Ndị Na-enye Aka!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ụzọ Isi Chebe Ahụ Ike Gị
    Teta!—1999
  • Ndekọ Ọnụ Ọgụgụ Na-awụ Akpata Oyi nke Ọrịa AIDS!
    Teta!—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
w01 2/1 p. 3

Ibi Ndụ n’Etiti Ihe Ize Ndụ

“Ọ dịghị ihe ọ bụla ị pụrụ ime n’ụbọchị—gụnyere ihi ụra—nke na-adịghị ize ndụ ruo n’ókè nke ịbụ ihe ikpeazụ ị ga-eme ná ndụ.”—Magazin bụ́ Discover.

EJIRIWO ndụ tụnyere ịgafe ebe e liri ogbunigwe, n’ihi na ọ pụrụ ịkpata mmerụ ahụ ma ọ bụ ọnwụ mgbe ọ bụla, ọ na-abụkarị n’enyeghị ihe ịdọ aka ná ntị. Ihe ndị na-eweta ihe ize ndụ dịgasị iche site ná mba gaa ná mba. Ha gụnyere ihe mberede okporo ụzọ, agha obodo, ụnwụ nri, ọrịa AIDS, ọrịa cancer, ọrịa obi, nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, ná mba Africa ndị dị na ndịda Sahara, ọrịa AIDS aghọwo ihe kasị egbu ndị mmadụ, n’ime otu afọ na-adịbeghị anya, ‘o gburu nde mmadụ 2.2, ihe ji okpukpu 10 karịa ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ n’agha obodo nile a lụrụ n’Africa,’ ka U.S.News & World Report na-ekwu.

Ka ọ dịgodị, ụwa na-emefu nnukwu ego iji gbatịkwuo ndụ na n’ibelata ihe ize ndụ nke nrịanrịa na nkwarụ. Ọtụtụ n’ime aro ndị a tụrụ ka a na-agbaso, dị ka iri ihe na ịṅụ ihe n’ụzọ ezi uche dị na ha na mmega ahụ, pụrụ ịrụpụta ihe ụfọdụ bara uru. Otú ọ dị, e nwere isi iyi nke ihe ọmụma a pụrụ ịtụkwasị obi n’akụkụ nile nke ndụ bụ́ nke pụrụ inyere gị aka ibi ndụ dị nchebe karị. Isi iyi ahụ bụ Bible. O nwere ụkpụrụ nduzi maka igbo ọtụtụ mkpa ndị metụtara ahụ ike na ọdịmma

anyị. N’ezie, Bible adịghị enye nkọwa zuru ezu banyere nsogbu ọ bụla. Ma, ọ na-enye ụkpụrụ ndị magburu onwe ha iji duzie anyị n’okwu ndị dị ka àgwà iri ihe, mgbasi ike nke ahụ, echiche uche, mmekọahụ, iji mmanya na-aba n’anya, ụtaba, na ihe a sị na ọ bụ ọgwụ ntụrụndụ eme ihe, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

Ndụ ọtụtụ ndị jupụtakwara ná nsogbu nke ejighị akụ̀ ha n’aka. N’ebe a kwa, Bible na-agbatara anyị ọsọ enyemaka. Ọ bụghị nanị na ọ na-enye agbamume banyere ile ego anya n’ụzọ amamihe dị na ya na otú e si achịkwa ego kamakwa ọ na-egosi otú mmadụ pụrụ isi ka mma dị ka onye e were n’ọrụ ma ọ bụ onye were mmadụ n’ọrụ. N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, Bible bụ ihe nduzi bụ́ ịgba, ọ bụghị nanị maka inwe ego zuru ezu na ahụ ike dị mma, kama maka ndụ n’onwe ya. Ọ̀ ga-amasị gị ịhụ otú Bible pụrụ isi dị irè taa? Ọ bụrụ otú ahụ, biko gụrụ gawa.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya