Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w02 3/1 p. 20-25
  • Iji Mmụọ Ịchụ Onwe Onye n’Àjà Na-eje Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iji Mmụọ Ịchụ Onwe Onye n’Àjà Na-eje Ozi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Itinye Mmụọ Ịchụ Onwe Onye n’Àjà n’Ọrụ
  • Oge Ime Mkpebi
  • Ịsụ Ụzọ n’Oge Agha
  • Ọrụ Ndị E Kenyere M n’Ala Ọzọ
  • Saịprọs na Izrel
  • Ime Ihe Iji Na-ekwekọ n’Ọnọdụ Ndị Na-agbanwe Agbanwe
  • Oge Nsogbu
  • Ịgbanwekwu Ọrụ Ndị E Kenyere M
  • Saịprọs na Ịlaghachi Gris
  • Ịkwado Nwanne M Nwanyị M Hụrụ n’Anya
  • Ikele Jehova—Site n’Ozi Oge Nile!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Enwere M Obi Ụtọ Maka Òkè M Keere ná Nkụzi Bible Zuru Ụwa Ọnụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ụjọ Atụghị Anyị n’Ihi na Jehova Nọnyeere Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Iji Ọṅụ Na-eje Ozi n’Agbanyeghị Ọrịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
w02 3/1 p. 20-25

Akụkọ Ndụ

Iji Mmụọ Ịchụ Onwe Onye n’Àjà Na-eje Ozi

DỊ KA DON RENDELL SI KỌỌ

Mama m nwụrụ na 1927 mgbe m dị nanị afọ ise. N’agbanyeghị nke ahụ, okwukwe ya nwere mmetụta dị ukwuu ná ndụ m. Nke ahụ si aṅaa kwe omume?

MAMA m bụ ezigbo onye òtù Chọọchị England mgbe papa m, bụ́ ọkachamara n’ọrụ agha, lụrụ ya. Nke ahụ mere tupu Agha Ụwa Mbụ. Agha Ụwa Mbụ tiwapụrụ na 1914, mama m ekwenyeghịkwara onye ụkọchukwu ya maka ojiji o ji ikpo okwu chọọchị ya mere ebe a nọ edeba aha ndị mmadụ n’ọrụ agha. Gịnị ka ụkọchukwu ahụ zara ya? “Lawa, enyezila onwe gị nsogbu banyere ajụjụ ndị dị otú a!” Nke ahụ ejughị ya afọ.

Na 1917, mgbe agha ahụ nọ n’uju ya, mama m gara kirie “Photo-Drama of Creation.” N’ịbụ onye kwenyesiri ike na ọ chọtawo eziokwu ahụ, ọ hapụrụ chọọchị ya ozugbo iji soro Ndị Mmụta Bible, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova n’oge ahụ. Ọ gara nzukọ n’otu ọgbakọ dị na Yeovil, bụ́ obodo kasị nso n’obodo nta anyị bụ́ West Coker, nke dị n’ógbè England bụ́ Somerset.

N’oge na-adịghị anya, mama m sooro ụmụnne ya ndị nwanyị atọ kerịta ihe o kweere ọhụrụ. Ndị nọteworo aka n’ọgbakọ Yeovil akọworo m otú mama m na nwanne ya nwanyị bụ́ Millie si jiri ịnụ ọkụ n’obi jiri ịnyịnya ígwè gbagharịa gburugburu ókèala sara mbara nke obodo nta anyị, na-ekesa akwụkwọ ndị e ji amụ Bible bụ́ Studies in the Scriptures. Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, n’ime ọnwa 18 ndị ikpeazụ nke ndụ ya, mama m dinara n’ute ọrịa n’ihi ụkwara nta, bụ́ nke na-enweghị ọgwụgwọ n’oge ahụ.

Itinye Mmụọ Ịchụ Onwe Onye n’Àjà n’Ọrụ

Nwanne mama anyị bụ́ Millie, bụ́ onye anyị na ya bi n’oge ahụ, lekọtara mama m mgbe ọ na-arịa ọrịa, lekọtakwa mụ na nwanne m nwanyị dị afọ asaa, bụ́ Joan. Mgbe mama m nwụrụ, nwanne mama anyị bụ́ Millie wepụtara onwe ya ozugbo ilekọta anyị bụ́ ụmụaka. Papa m, n’ịbụ onye obi dị ụtọ na a napụla ya ibu ọrụ a, kwetara ozugbo ka nwanne mama anyị bụ́ Millie sorozie anyị biri.

Anyị bịara hụ nwanne mama anyị a n’anya, obi dịkwa anyị ụtọ na ọ gaje iso anyị biwezie. Ma gịnị mere o ji mee mkpebi dị otú ahụ? Ọtụtụ afọ mgbe e mesịrị, nwanne mama anyị bụ́ Millie gwara anyị na ya maara na ọ bụ ọrụ dịịrị ya iwukwasị ihe na ntọala mama m tọrọ—ịkụziri mụ na Joan eziokwu Bible—ihe ọ ghọtara na papa anyị agatụghị eme, ebe ọ bụ na o nweghị mmasị n’okpukpe.

Mgbe nke ahụ gasịrị, anyị matakwara na nwanne mama anyị bụ́ Millie mere mkpebi onwe onye ọzọ. Iji lekọta anyị nke ọma, ọ gajeghị ịlụ di ma ọlị. Lee ịchụ onwe onye n’àjà ọ bụ! Mụ na Joan nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji na-enwe ekele miri emi n’ebe ọ nọ. Ihe nile nwanne mama anyị bụ́ Millie kụziiri anyị na ihe nlereanya magburu onwe ya o setịpụrụ adịgidewo n’obi anyị.

Oge Ime Mkpebi

Mụ na Joan gụrụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ Chọọchị England wetara n’obodo nta anyị bụ́ ebe nwanne mama anyị bụ́ Millie gwasiri nwanyị bụ́ onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ okwu ike banyere ọzụzụ okpukpe anyị. Mgbe ụmụaka ndị ọzọ zọọrọ njem gawa chọọchị, anyị na-ala n’ebe obibi anyị, mgbe ụkọchukwu bịakwara n’ụlọ akwụkwọ ahụ ikwu okwuchukwu, anyị na-anọpụ iche, a na-enyekwa anyị akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị anyị ga-eburu n’isi. Nke a mere ka m gbanyesie mkpọrọgwụ ike, ebe ọ bụ na adịghị m echefu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a echefu.

Ahapụrụ m ụlọ akwụkwọ mgbe m dị afọ 14 iji mụọ ọrụ ruo afọ anọ n’otu ụlọ ọrụ na-emepụta cheese n’ógbè anyị. Amụtakwara m ịkpọ piano, egwú na ịgba egwú ghọkwara ihe ndị m ji atụrụ ndụ. Ọ bụ ezie na eziokwu Bible gbanyere mkpọrọgwụ n’obi m, ọ kwalibeghị m ime ihe. Mgbe e mesịrị, n’otu ụbọchị na March 1940, otu Onyeàmà merela agadi kpọrọ m ka m soro ya gaa otu mgbakọ e mere na Swindon, nke dị ihe dị ka kilomita 110 site n’ebe anyị bi. Albert D. Schroeder, bụ́ onye nlekọta nke Ndịàmà Jehova nọ na Britain, kwuru okwu ihu ọha. Mgbakọ ahụ ghọọrọ m oge oké mgbanwe.

Agha Ụwa nke Abụọ nọ na-akpọtụ. Gịnị ka m ji ndụ m na-eme? Ekpebiri m ịlaghachi azụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ dị na Yeovil. Ná nzukọ mbụ m gara, e mere ka a mata banyere ịgba àmà okporo ámá. N’agbanyeghị na ihe ọmụma m nwere pere mpe, ewepụtara m onwe m ikere òkè n’ọrụ a, nke a juru nnọọ ọtụtụ ndị sị na ha bụ ndị enyi m anya bụ́ ndị mere m akaje ka ha na-agafe n’ụzọ!

Na June 1940, e mere m baptizim n’obodo Bristol. N’ime otu ọnwa, edenyere m aha m dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile—onye na-ezisa ozi ọma oge nile. Lee ka obi si dị m ụtọ mgbe, ntakịrị oge ka e mesịrị, nwanne m nwanyị gosipụtakwara nraranye ya site na baptizim ime mmiri!

Ịsụ Ụzọ n’Oge Agha

Otu afọ mgbe agha ahụ malitesịrị, enwetara m akwụkwọ ndị e ji deba aha m n’òtù ndị agha. Ebe ọ bụ na edebawo m aha m na Yeovil dị ka onye jụrụ ije agha n’ihi akọ na uche ya, a kpụpụrụ m n’ụlọikpe dị na Bristol. Esorowo m John Wynn sụọ ụzọ na Cinderford, Gloucestershire, e mesịakwa na Haverfordwest nakwa Carmarthen, Wales.a Mgbe e mesịrị, n’ikpe e kpere m na Carmarthen, a mara m ikpe ịga mkpọrọ ọnwa atọ n’ụlọ nga dị na Swansea, riekwa m nhá £25—ego buru ibu n’oge ahụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, a tụrụ m mkpọrọ ọnwa atọ ọzọ n’ihi akwụlighị ego ahụ.

Mgbe a na-ekpe m ikpe nke ugboro atọ, a jụrụ m, sị: “Ị́ maghị na Bible sịrị, ‘Nyeghachi Siza ihe nke Siza’?” “Ee,” ka m zaghachiri, “Amaara m, ma ọ ga-amasị m ikwucha ihe amaokwu ahụ kwuru: ‘nyeghachikwa Chineke ihe nke Chineke.’ Ọ bụ ihe m na-eme.” (Matiu 22:21, King James Version) Izu ole na ole mgbe e mesịrị, enwetara m akwụkwọ ozi na-agwa m na iwu ejighịzi m ije ozi agha.

Ná mmalite 1945, a kpọrọ m isonyere ezinụlọ Betel nke London. N’oge oyi na-esonụ, Nathan H. Knorr, bụ́ onye ndú n’ịhazi ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ, na odeakwụkwọ ya, bụ́ Milton G. Henschel, letara London. E debara aha ụmụnna asatọ na-eto eto si Britain na klas nke asatọ nke Watchtower Bible School of Gilead maka inweta ọzụzụ ozi ala ọzọ, esokwa m n’ime ha.

Ọrụ Ndị E Kenyere M n’Ala Ọzọ

Na May 23, 1946, anyị bara n’ụgbọ mmiri Liberty nke oge agha, si n’ọdụ ụgbọ mmiri Fowey nke dị na Cornwall kwọpụ. Onyeisi ọdụ ụgbọ mmiri ahụ, bụ́ Captain Collins, bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ka anyị sikwa n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ kwọpụ, o gburu opi siren. Dị ka o sikarị adị, obi erughị anyị nile ala ka anyị nọ na-ele ka ọdụ ụgbọ mmiri England ahụ pụrụ n’anya. Njem ahụ anyị mere n’Osimiri Atlantic dị egwu, ma ụbọchị 13 mgbe e mesịrị, anyị rutere United States n’udo.

Ịga mgbakọ ahụ were ụbọchị asatọ bụ́ Mgbakọ Ọchịchị Chineke nke Mba Ndị Nwere Ọṅụ e mere na Cleveland, Ohio, site n’August 4 ruo 11, 1946, bụ ahụmahụ kwesịrị ncheta. Mmadụ 80,000 bịara ya, gụnyere mmadụ 302 si mba 32 ọzọ. Ná mgbakọ ahụ, e wepụtaara ìgwè mmadụ ahụ nwere oké ọṅụ magazin bụ́ Teta!b na akwụkwọ e ji amụ Bible bụ́ “Kwe Ka Chineke Buru Onye-Ezi-Okwu.”

Anyị gụsịrị akwụkwọ na Gilead na 1947, e kenyekwara mụ na Bill Copson ọrụ n’Ijipt. Ma tupu anyị apụọ, eritere m uru nke inweta ọzụzụ dị mma banyere ọrụ ọfịs site n’aka Richard Abrahamson na Betel nke Brooklyn. Anyị rutere Aleksandria, n’oge na-adịghịkwa anya, emere m mgbanwe iji kwekọọ n’ụzọ ndụ nke Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. Otú ọ dị, ịmụta asụsụ Arabic bụụrụ m ihe ịma aka, aghaghịkwa m iji kaadị ịgba àmà na-eme ihe n’asụsụ anọ.

Bill Copson nọgidere ruo afọ asaa, ma apụghị m ịgbanwe visa m mgbe afọ mbụ gasịrị, n’ihi ya, aghaghị m isi ná mba ahụ pụọ. Ana m eleghachi anya azụ n’afọ ahụ m ji jee ozi ala ọzọ dị ka nke m kasị rụpụta ihe na ya ná ndụ m. Enwere m ihe ùgwù nke iduzi ihe karịrị ọmụmụ Bible ebe obibi 20 kwa izu, ụfọdụ n’ime ndị mụtakwara eziokwu ahụ n’oge ahụ ka na-etosi Jehova ike. E si Ijipt kenye m ọrụ na Saịprọs.

Saịprọs na Izrel

Amalitere m ịmụ asụsụ ọhụrụ, Grik, na ịmara ire okwu nke ógbè m nọ na ya. N’oge na-adịchaghị anya mgbe e mesịrị, mgbe a gwara Anthony Sideris ka ọ gaa Gris, a họpụtara m ilekọta ọrụ ahụ na Saịprọs. N’oge ahụ, alaka ụlọ ọrụ Saịprọs na-elekọtakwa Izrel, esokwa m ụmụnna ndị ọzọ nweta ihe ùgwù nke ileta Ndịàmà ole na ole nọ n’ebe ahụ site n’oge ruo n’oge.

Na njem mbụ m mere gaa Izrel, anyị nwere mgbakọ nta n’otu ụlọ nri dị na Haifa, bụ́ nke mmadụ 50 ma ọ bụ 60 bịara. Site n’ikewa ígwè dị iche iche nke mba ahụ, anyị ji asụsụ isii duzie usoro ihe omume ahụ! N’oge ọzọ, anọ m na Jeruselem gosi otu film Ndịàmà Jehova mepụtara, ekwukwara m okwu ihu ọha nke akwụkwọ akụkọ Bekee e nwere n’ebe ahụ kwuru okwu ọma banyere ya.

E nwere ihe dị ka 100 Ndịàmà na Saịprọs n’oge ahụ, ha aghaghịkwa ịlụsi ọgụ ike maka okwukwe ha. Ìgwè ndị na-eme ihe ike nke ndị ụkọchukwu Chọọchị Ọtọdọks Gris na-edu na-etisasị mgbakọ anyị dị iche iche, ọ bụkwaara m ahụmahụ ọhụrụ ịbụ onye a tụrụ nkume ka m na-agba àmà n’ógbè ndị dị n’ime ime obodo. Aghaghị m ịmụta ịgbapụ ngwa ngwa! Ka e nwere mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ otú ahụ, ọ bụ ihe na-ewusi okwukwe ike izitekwu ndị ozi ala ọzọ n’àgwàetiti ahụ. Dennis na Mavis Matthews tinyere Joan Hulley na Beryl Heywood sonyeere m na Famagusta, ebe Tom na Mary Goulden nakwa Nina Constanti, bụ́ onye Saịprọs a mụrụ na London, gara Limassol. N’otu mgbe ahụ, e zigara Bill Copson na Saịprọs, Bert na Beryl Vaisey sonyekwaara ya mgbe e mesịrị.

Ime Ihe Iji Na-ekwekọ n’Ọnọdụ Ndị Na-agbanwe Agbanwe

Ka ọ na-erule ọgwụgwụ 1957, adara m ọrịa, enweghịkwa m ike ịga n’ihu n’ọrụ e kenyere m n’ala ọzọ. Eji m mwute kpebie na ka ahụ́ wee dịghachi m mma, aga m alaghachi England, bụ́ ebe m nọ gaa n’ihu n’ọrụ ọsụ ụzọ ruo 1960. Nwanne m nwanyị na di ya ji obiọma sị ka mụ na ha biri, ma ihe adịghịzi otú ọ dịbu. Ihe na-esiri Joan ike nke ukwuu. E wezụga ilekọta di ya na nwa ya nwanyị, n’ime afọ 17 ahụ m na-anọghị ya, o jiriwo ịhụnanya lekọta papa anyị na nwanne mama anyị bụ́ Millie, bụ́ ndị kaworo nká ma na-arịa ọrịa n’oge ahụ. Mkpa ọ dị ịgbaso ihe nlereanya nke ịchụ onwe onye n’àjà nke nwanne mama m setịpụrụ bịara pụta ìhè, n’ihi ya, anọnyeere m nwanne m nwanyị ruo mgbe ma nwanne mama m ma papa m nwụrụ.

Ọ gaara adịworo m nnọọ mfe ibiwezi n’England, ma mgbe m zusịrị ike ruo nwa oge, ọ bịara dị m ka iwu o ji m ịlaghachi n’ebe e kenyere m ọrụ. E kwuwerị, ọ̀ bụ na nzukọ Jehova emefubeghị ego dị ukwuu n’ịzụ m? N’ihi ya, na 1972, eji m ego m gbaa ụgbọ laghachi Saịprọs iji sụọ ụzọ n’ebe ahụ ọzọ.

Nathan H. Knorr bịarutere ka ọ hazie maka mgbakọ a ga-enwe n’afọ na-esonụ. Mgbe ọ chọpụtara na m alọghachila, ọ tụrụ aro maka ịhọpụta m dị ka onye nlekọta sekit maka àgwàetiti ahụ dum, bụ́ ihe ùgwù nke m nwere ruo afọ anọ. Otú ọ dị, ọ bụ ọrụ siri ike, ebe ọ bụ na ọ chọrọ n’aka m ịdị na-asụ Grik ọtụtụ mgbe.

Oge Nsogbu

Mụ na Paul Andreou, bụ́ Onyeàmà bụ́ onye Saịprọs nke na-asụ Grik bi n’otu ụlọ dị n’obodo nta bụ́ Karakoumi, nke dị nnọọ n’ebe ọwụwa anyanwụ Kyrenia n’ebe ugwu nke ụsọ oké osimiri. Alaka ụlọ ọrụ Saịprọs dị na Nicosia, n’ebe ndịda nke Ugwu Kyrenia. Ná mmalite July 1974, anọ m na Nicosia mgbe a chụturu President Makarios n’ọchịchị, ahụkwara m obí ya ka ọ na-agba ọkụ. Mgbe ime njem bịara dịtụ nchebe, eji m ọsọ gaghachi Kyrenia, bụ́ ebe anyị nọ na-akwadebe maka mgbakọ sekit. Ụbọchị abụọ mgbe e mesịrị, anụrụ m ka a tụrụ bọmbụ mbụ n’ọdụ ụgbọ mmiri, ahụkwara m ka helikọpta jupụtara n’elu bụ́ ndị nọ na-ebubata ndị agha si Turkey.

Ebe m bụ nwa amaala Britain, ndị agha Turkey kpọgara m ná mpụga Nicosia, bụ́ ebe onye ọrụ òtù Mba Ndị Dị n’Otu bụ́ onye kpọtụụrụ alaka ụlọ ọrụ, nọ gbaa m ajụjụ ọnụ. Mgbe e mesịrị, abịara m nwee nsogbu nke iji ụkwụ si n’ebe ọtụtụ waya telifon na nke eletrik tụhịkọtajuru garuo n’ebe obibi ndị e si na ha gbapụ bụ́ ndị dị n’ebe nke ọzọ a na-azọ azọ. Lee aṅụrị m nwere na a pụghị imebi ụzọ m si agwa Jehova Chineke okwu! Ekpere m kwagidere m n’oge m nwere otu n’ime ahụmahụ ndị kasị nye m nsogbu ná ndụ.

Ihe nile m nwere funahụrụ m, ma obi dị m ụtọ inweta nchebe n’alaka ụlọ ọrụ. Otú ọ dị, ọnọdụ a adịteghị aka. N’ime ụbọchị ole na ole, ndị agha ahụ si esi bịa weghaara otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ebe ugwu àgwàetiti ahụ. Anyị aghaghị ịgbahapụ Betel, anyị kwagakwara Limassol. Obi dị m ụtọ inwe ike iso otu kọmitii e guzobere ilekọta ụmụnna 300 ọgba aghara ahụ metụtara, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha na-enweghịzi ebe obibi, rụkọọ ọrụ n’ebe ahụ.

Ịgbanwekwu Ọrụ Ndị E Kenyere M

Na January 1981, Òtù Na-achị Isi gwara m ka m gafee Gris iji sonyere ezinụlọ Betel dị n’Atens, ma ka ọ na-erule ngwụsị afọ ahụ, alaghachiri m Saịprọs, a họpụtakwara m ịbụ onye nhazi Kọmitii Alaka. Andreas Kontoyiorgis na nwunye ya, bụ́ Maro, bụ́ ndị Saịprọs e si London zite, bụụrụ m ‘ndị enyemaka mere ka m dị ike.’—Ndị Kọlọsi 4:11.

Mgbe Theodore Jaracz mesịrị nleta zoonu o mere na 1984, enwetara m akwụkwọ ozi si n’aka Òtù Na-achị Isi bụ́ nke kwuru nnọọ, sị: “Mgbe o mesịrị, ọ ga-amasị anyị ka i soro Nwanna Jaracz gaa Gris.” E kwughị ihe kpatara ya, ma mgbe anyị rutere Gris, a gụọrọ Kọmitii Alaka akwụkwọ ozi ọzọ sitere n’aka Òtù Na-achị Isi, nke e ji na-ahọpụta m ịbụ onye nhazi Kọmitii Alaka ná mba ahụ.

Ka ọ na-erule n’oge ahụ, anyị nọ na-eche ntiwapụ nke ndapụ n’ezi ofufe ihu. A nọkwa na-ebo anyị ọtụtụ ebubo banyere ime ntọghata n’ụzọ iwu na-akwadoghị. Kwa ụbọchị, a na-ejide ndị Jehova ma na-akpụpụ ha n’ụlọikpe. Lee ihe ùgwù ọ bụ ịmata ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị guzosiworo ike n’ezi ihe n’ule dị iche iche! E mesịrị nọrọ n’Ụlọikpe Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Europe kpee ụfọdụ n’ime ikpe ha, ha rụpụtakwara ihe ndị magburu onwe ha bụ́ ndị nweworo mmetụta dị mma n’ọrụ nkwusa ahụ na Gris.c

Mgbe m na-eje ozi na Gris, agara m mgbakọ ndị m na-adịghị echefu echefu n’Atens, Tesalonaịka, nakwa n’àgwàetiti ndị dị na Rods na Krit. Ha bụ afọ anọ nyere m obi ụtọ ma mịpụta mkpụrụ, ma a na-aga ịgbanwere m ọrụ ọzọ—ịlaghachi Saịprọs na 1988.

Saịprọs na Ịlaghachi Gris

Mgbe m na-anọghị na Saịprọs, ụmụnna nwetara alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ na Nissou, nke dị kilomita ole na ole site na Nicosia, Carey Barber nke si n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, kwukwara okwu nraranye ya. Ihe dịtụ mma n’àgwàetiti a ugbu a, obi dịkwa m ụtọ ịlọtaghachi—ma ọ gajeghị ịdịte aka.

Òtù Na-achị Isi akwadowo atụmatụ a na-eme iwu ebe obibi Betel ọhụrụ na Gris, ihe dị ka kilomita ole na ole n’ebe ugwu Atens. Ebe ọ bụ na m pụrụ ịsụ ma Bekee ma Grik, a kpọrọ m na 1990 ịlọghachi iji rụọ ọrụ n’ebe ahụ a na-ewu ụlọ ọhụrụ dị ka onye ntụgharị okwu nye ezinụlọ ahụ ndị ozi si mba ọzọ bụ́ ndị na-arụ ọrụ n’ebe ahụ mejupụtara. Aka m na-echeta ọṅụ m na-enwe ịnọ n’ebe ahụ a na-arụ ọrụ n’elekere anya isii n’ụtụtụ nke oge okpomọkụ, na-anabata ọtụtụ narị ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị bụ́ ndị Gris bụ́ ndị wepụtara onwe ha n’afọ ofufo iso ezinụlọ ahụ na-ewu ihe owuwu rụkọọ ọrụ! Aga m anọgide na-echeta obi ụtọ na ịnụ ọkụ n’obi ha.

Ndị ụkọchukwu Ọtọdọks Gris na ndị na-akwado ha nwara ịbata n’ebe ahụ a na-arụ ọrụ ma tisasịa ọrụ anyị, ma Jehova nụrụ ekpere anyị, e chebekwara anyị. Anọgidere m n’ọrụ ihe owuwu ahụ iji hụ ka a raara ebe obibi Betel ọhụrụ ahụ nye n’April 13, 1991.

Ịkwado Nwanne M Nwanyị M Hụrụ n’Anya

N’afọ na-esonụ, alaghachiri m England maka ezumike, na-anọnyere nwanne m nwanyị na di ya. N’ụzọ dị mwute, ka m ka nọ ebe ahụ, di nwanne m nwanyị nwere nkụchi obi ugboro abụọ ma nwụọ. Joan akwadowo m nke ukwuu n’oge m nọ ozi ala ọzọ. O siri nnọọ ike otu izu agafee ya aghara idere m akwụkwọ ozi agbamume. Lee ngọzi mmekọrịta dị otú ahụ bụụrụ onye ozi ala ọzọ ọ bụla! Ugbu a, ọ bụ nwanyị di ya nwụrụ nke ahụ́ na-esighị ike, ma chọọ nkwado. Gịnị ka m ga-eme?

Nwa Joan, bụ́ Thelma, na di ya anọworị na-elekọta nwanyị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi nọ n’ọgbakọ ha nke di ya nwụrụ, bụ́ nwa nwanyị nke nwanne mama anyị nke nwoke, bụ́ onye na-arịasi ọrịa ike. N’ihi ya, mgbe m kpesichara ekpere ike, ekpebiri m na m ga-anọrọzi iji nye aka lekọta Joan. Mgbanwe ahụ adịghịrị m mfe omume, ma enwere m ihe ùgwù nke ije ozi dị ka onye okenye na Pen Mill, bụ́ otu n’ime ọgbakọ abụọ dị na Yeovil.

Ụmụnna ndị mụ na ha jekọrọ ozi ná mba ofesi nọgidere na-akpọtụrụ m mgbe nile site na telifon na akwụkwọ ozi, obi dịkwa m nnọọ ụtọ banyere ya. Ọ bụrụ na mụ ekwuo na m chọrọ ịlaghachi Gris ma ọ bụ Saịprọs mgbe ọ bụla, amaara m na a ga-ezitere m tiketi njem ozugbo. Ma adị m afọ 80 ugbu a, ma anya m ma ahụ́ ike m adịghịzikwa otú ha dịbu. Ọ bụ ihe na-akụda mmụọ ịbụ onye na-apụghịzi ịrụ ọrụ otú o sibu arụ, ma afọ ndị m jere ozi na Betel nyeere m aka ịzụlite ọtụtụ àgwà ndị mere ka m kwụrụ chịm taa. Dị ka ihe atụ, ana m eme ihe mmụta dịịrị ụbọchị mgbe nile tupu m rie nri ụtụtụ. Amụtakwara m iso ndị mmadụ na-akpakọrịta na ịhụ ha n’anya—isi ihe na-eduga n’inwe ihe ịga nke ọma n’ozi ala ọzọ.

Ka m na-eleghachi anya azụ n’ihe dị ka afọ 60 magburu onwe ha m ji too Jehova, amaara m na ozi oge nile bụ ihe nchebe kasịnụ ma na-enye ọzụzụ kasịnụ. Apụrụ m iji obi m dum kwughachi ihe Devid gwara Jehova, si: “Ị bụworo m ụlọ elu, na ebe mgbalaga n’ụbọchị mkpagbu dịịrị m.”—Abụ Ọma 59:16.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Akụkọ ndụ John Wynn, “Obi M Jupụtara n’Ekele,” dị n’Ụlọ Nche, September 1, 1997, peeji nke 25-28.

b Nke a mabu dị ka Consolation.

c Lee Ụlọ Nche, December 1, 1998, peeji nke 20-21, na September 1, 1993, peeji nke 27-31; Teta! (Bekee), January 8, 1998, peeji nke 21-22, na Teta!, March 22, 1997, peeji nke 16-17.

[Map ndị dị na peeji 24]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

GRIS

Atens

SAỊPRỌS

Nicosia

Kyrenia

Famagusta

Limassol

[Foto dị na peeji nke 21]

Mama m na 1915

[Foto dị na peeji nke 22]

Na 1946, ka mụ (onye nke anọ site n’aka ekpe) na ụmụnna ndị ọzọ so na klas nke asatọ nke Gilead nọ n’elu ụlọ Betel nke Brooklyn

[Foto dị na peeji nke 23]

Ka mụ na nwanne mama anyị bụ́ Millie nọ mgbe m lọtara England na nke mbụ ya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya