Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w02 12/15 p. 26-29
  • Na-egosipụta Mmetụta Na-ekpo Ọkụ n’Ime Ezinụlọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-egosipụta Mmetụta Na-ekpo Ọkụ n’Ime Ezinụlọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Oge Pụrụ Iche nke Siri Ike Obibi”
  • Mmekọrịta Ezinụlọ Kwesịrị Nṅomi
  • Mmetụta Na-ekpo Ọkụ n’Ime Ezinụlọ—N’ụzọ Dị Aṅaa?
  • Ị Pụrụ Ịchọta Enyemaka
  • “Na-enwenụ Mmetụta Dị Nro Maka Ibe Unu”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Otú Di na Nwunye Ga-esi Egosi na Ha Hụrụ Ibe Ha n’Anya
    Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka
  • Ịchọta Ụzọ E Si Enweta Ịhụnanya Ụmụnna
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Na-enwere Ụmụnna Gị Ọmịiko
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
w02 12/15 p. 26-29

Na-egosipụta Mmetụta Na-ekpo Ọkụ n’Ime Ezinụlọ

“GBAA ya ọkụ ma ọ bụrụ na ị ga-emeli ya! Gbaa ya ọkụ!” ka Tohru ji anyaike gwa nwunye ya, bụ́ Yoko.a “Aga m agbarịrị ya ọkụ,” ka ọ zaghachiri ma kpaa mkpá ọkụ iji gbaa foto ha abụọ sere ọkụ. Yoko ejiri iwe kwuokwa, sị: “Aga m agba ụlọ a ọkụ!” Tohru emeghachi omume site n’ịma nwunye ya ụra, na-eji ihe ike emechi esemokwu ahụ.

Afọ atọ tupu mgbe ahụ, Tohru na Yoko malitere ndụ ha dị ka di na nwunye nwere obi ụtọ. Gịnịzi bụ nsogbu ha? Ọ bụ ezie na Tohru yiri ezigbo mmadụ, ọ dị nwunye ya ka o nweghị mmetụta na-ekpo ọkụ n’ahụ́ ya nakwa na ọ dịkebeghị achọ ịma otú obi dị ya. O yiri ka di ya apụghị ịnabata mmetụta na-ekpo ọkụ ọ na-egosi ya. Ebe Yoko na-apụghị ịnagide nke a, obi jọwanyere ya njọ, iwe ya rịwanyekwara elu. Ọ malitere inwe nsogbu ndị dị ka ehighị ụra nke ọma, nchekasị, enweghị agụụ maka iri nri, ahụ́ mgbakasị, na ịda mbà n’obi nakwa ọbụna nkụja. N’agbanyeghị nke ahụ, o yiri ka Tohru achọghị ịma banyere ọnọdụ ọjọọ ahụ dị n’ime ezinụlọ ya. Ọ dị ya nnọọ ka ọ̀ bụ otú o kwesịrị ịdị.

“Oge Pụrụ Iche nke Siri Ike Obibi”

Nsogbu ndị dị otú ahụ juru ebe nile taa. Pọl onyeozi buru n’amụma na a ga-eji mmadụ “ndị na-enweghị obi mmadụ” mara oge anyị. (2 Timoti 3:1-5) Okwu Grik mbụ a sụgharịrị n’ebe a ịbụ “na-enweghị obi mmadụ” na okwu na-egosi mmetụta na-ekpo ọkụ e bu pụta ụwa nke dị n’etiti ndị òtù ezinụlọ nwere njikọ chiri anya. N’ezie, mmetụta dị otú ahụ kọrọ ụkọ n’oge anyị a. A sịgodị na mmetụta na-ekpo ọkụ dị, ndị òtù ezinụlọ nwere ike ghara ịdị na-egosipụta ya mgbe nile n’ebe ibe ha nọ.

Ọtụtụ ndị nne na nna taa amaghị otú e si egosipụta ịhụnanya na mmetụta na-ekpo ọkụ n’ebe ụmụ ha nọ. Ụfọdụ etolitewo n’ime ezinụlọ a na-enweghị mmetụta na-ekpo ọkụ, ha nwekwara ike ghara ịchọpụta na ndụ pụrụ ịdịkwu ụtọ ma dị mma karị nanị ma ọ bụrụ na a na-enwe ma na-egosipụta mmetụta na-ekpo ọkụ. O yiri ka ọ bụ ihe mere Tohru. Mgbe ọ bụ nwata, nna ya na-ejikarị ọrụ n’aka n’ụlọ ọrụ ha ma na-alọta n’ime abalị. Ọ dịkebeghị agwa Tohru okwu, mgbe ọ ga-agwa ya agwa, ọ na-agwa ya okwu ọjọọ. Nne Tohru rụkwara ọrụ oge nile, o wepụtaghịkwa oge hiri nne iji soro ya nọkọọ. Ọ bụ telivishọn ka ọ na-ekiri mgbe nile. E nweghị ma ịja mma ma mkparịta ụka n’ime ezinụlọ ahụ.

Ọdịbendị pụkwara ịbụ ihe ọzọ na-akpata ya. N’akụkụ ụfọdụ nke Latin America, nwoke aghaghị ime ihe megidere omenala a na-agbasokarị iji gosipụta mmetụta na-ekpo ọkụ o nwere n’ebe nwunye ya nọ. N’ọtụtụ mba ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa na n’Africa, mmadụ iji okwu ọnụ ma ọ bụ omume na-egosipụta mmetụta na-ekpo ọkụ bụ ihe megidere ọdịnala. Ọ pụrụ ịkpọ ndị bụ́ di ọgwụ n’ọnụ ịgwa nwunye ma ọ bụ ụmụ ha, sị, “Ahụrụ m gị n’anya.” Otú o sina dị, anyị pụrụ ịmụta ihe site ná mmekọrịta ezinụlọ kasịnụ, bụ́ nke dịgideworo eri oge.

Mmekọrịta Ezinụlọ Kwesịrị Nṅomi

A na-achọta ihe nlereanya kasị mma ezinụlọ ga-agbaso ná mmekọrịta chiri anya nke dị n’etiti Jehova Chineke na Ọkpara ọ mụrụ nanị ya. Ha na-egosirịta onwe ha ịhụnanya n’ụzọ zuru okè. N’ime ọtụtụ puku afọ a na-apụghị ịgụta ọnụ, mmụọ ahụ e kere eke nke mesịrị ghọọ Jizọs Kraịst na Nna ya nwere mmekọrịta na-enye obi ụtọ. O si otú a kọwaa nkekọ ahụ: “M wee bụrụ ihe na-atọ Ya ụtọ kwa ụbọchị, na-egwuri egwu n’ihu Ya mgbe nile.” (Ilu 8:30) Ọkpara ahụ ji nnọọ n’aka na Nna ya hụrụ ya n’anya nke na ọ bịara nwee ike ịgwa ndị ọzọ na ya bụ ihe na-atọ Jehova ụtọ kwa ụbọchị. O nwere obi ụtọ n’ihu nna ya mgbe nile.

Ọbụna mgbe Ọkpara Chineke nọ n’ụwa dị ka nwoke ahụ bụ́ Jizọs, e mesighachiri ya obi ike na Nna ya hụrụ ya n’anya nke ukwuu. Mgbe e mesịrị Jizọs baptizim, ọ nụrụ olu Nna ya: “Nke a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye m nwapụtaworo.” (Matiu 3:17) Lee okwu ịhụnanya na-agba ume nke a bụ ná mmalite nke ozi Jizọs n’ụwa! Ọ ghaghị imetụwo ya n’obi ịnụ nnwapụta nke Nna ya ka ọ na-echeta ihe nile banyere ndụ o biri n’eluigwe.

N’ụzọ dị otú a, Jehova na-esetịpụ ihe nlereanya kasị mma n’igosipụta ịhụnanya n’ebe ezinụlọ eluigwe na ala ya nọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị zuo ezuo. Ọ bụrụ na anyị anakwere Jizọs Kraịst, Jehova pụkwara inwe mmetụta na-ekpo ọkụ n’ebe anyị nọ. (Jọn 16:27) Ọ bụ ezie na anyị agaghị anụ olu sitere n’eluigwe, anyị ga-ahụ ka e gosipụtara ịhụnanya Jehova n’ihe e kere eke, n’onyinye o nyere àjà mgbapụta Jizọs, nakwa n’ụzọ ndị ọzọ. (1 Jọn 4:9, 10) Ọbụna Jehova na-aṅa ntị n’ekpere anyị ma na-aza ha n’ụzọ kasị abara anyị uru. (Abụ Ọma 145:18; Aịsaịa 48:17) Ka anyị na-eso Jehova enwe mmekọrịta chiri anya, anyị na-eme ka ekele anyị na-enwe maka nlekọta ịhụnanya ya mikwuo emie.

Jizọs si n’aka Nna ya mụta otú e si egosi ndị ọzọ ọmịiko, nchebara echiche, obiọma, na nchegbu miri emi. Ọ kọwara, sị: “Ihe ọ bụla nke [Nna ahụ] na-eme, ihe ndị a ka Ọkpara ahụ na-emekwa n’ụzọ yiri nke ahụ. N’ihi na Nna m nwere mmetụta na-ekpo ọkụ n’ebe Ọkpara ya nọ, na-egosikwa ya ihe nile ya onwe ya na-eme.” (Jọn 5:19, 20) Anyị onwe anyị kwa pụrụ ịmụta nkà nke igosipụta mmetụta na-ekpo ọkụ site n’ịtụle ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ mgbe ọ nọ n’ụwa.—Ndị Filipaị 1:8.

Mmetụta Na-ekpo Ọkụ n’Ime Ezinụlọ—N’ụzọ Dị Aṅaa?

Ebe “Chineke bụ ịhụnanya,” e keekwa anyị “n’onyinyo Ya,” anyị nwere ma ikike nke inwe ma nke igosipụta ịhụnanya. (1 Jọn 4:8; Jenesis 1:26, 27) N’agbanyeghị nke ahụ, ikike ahụ adịghị amalite ọrụ na mberede. Iji na-egosipụta mmetụta na-ekpo ọkụ, anyị aghaghị ibu ụzọ nwee mmetụta na-ekpo ọkụ n’ebe onye òtù ọlụlụ anyị na ụmụ anyị nọ. Na-eleru anya ma na-arịba àgwà ọma ndị ha nwere ama, na-echebakwara ha echiche, n’agbanyeghị otú ha pụrụ isi yie ihe dị nnọọ nta na mbụ. ‘Ọ dịghị ihe na-amasị m n’ahụ́ di m [nwunye m ma ọ bụ ụmụ m],’ ka ị pụrụ ikwu. Ndị onye ọzọ họtaara di ma ọ bụ nwunye nwere ike ha agaghị enwecha mmetụta na-ekpo ọkụ n’ebe onye òtù ọlụlụ ha nọ. Ọ pụkwara ịbụwo na ụfọdụ achọghị ịmụ ụmụ. N’agbanyeghị nke ahụ, tụlee mmetụta Jehova nwere n’ahụ́ nwunye ihe atụ ya, bụ́ mba Izrel, na narị afọ nke iri T.O.A. Ka onye amụma ya bụ́ Ịlaịja kpebisịrị na e nwekwaghị ndị ọzọ na-efe Jehova n’etiti ndị nọ n’ebo iri nke mba Izrel, Jehova ji nlezianya nyochaa ha ma hụ ọnụ ọgụgụ mmadụ hiri nne—7,000—bụ́ ndị nwere àgwà na-amasị ya. Ị̀ pụrụ iṅomi Jehova site n’ịchọpụta ebe ndị òtù ezinụlọ gị na-eme nke ọma?—1 Ndị Eze 19:14-18.

Otú ọ dị, ka o wee dị ndị ọzọ so n’ezinụlọ gị ka i nwere mmetụta na-ekpo ọkụ n’ebe ha nọ, ị ghaghị ime mgbalị igosipụta ya. Mgbe ọ bụla ị chọpụtara ihe kwesịrị ịja mma, kwupụta ya ekwupụta. Ka Okwu Chineke na-akọwa nwanyị na-ejide onwe ya nke ọma, o kwuru banyere àgwà ọma nke ezinụlọ ya: “Ụmụ ya ebiliwo, kpọọ ya nwanyị ihe na-agara nke ọma; di ya kwa, ọ na-etokwa ya.” (Ilu 31:28) Rịba ama otú ndị òtù ezinụlọ ahụ si gosipụta ekele ha nwere n’ebe ibe ha nọ n’ezoghị ọnụ. Site n’iji okwu ọnụ na-eto nwunye ya, nna na-esetịpụrụ nwa ya nwoke ezi ihe nlereanya, na-agba ya ume ịdị na-aja nwunye ya mma mgbe nile mgbe ọ ga-alụ nwanyị.

Ndị nne na nna kwesịkwara ịdị na-aja ụmụ ha mma. Nke ahụ pụrụ inye aka mee ka ụmụaka ahụ nwee ùgwù onwe onye. E kwuwerị, olee otú mmadụ pụrụ isi ‘hụ onye agbata obi ya n’anya dị ka onwe ya’ ma ọ bụrụ na ọ dịghị akwanyere onwe ya ùgwù? (Matiu 22:39) N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na ndị nne na nna na-akatọ ụmụ ha mgbe nile, n’adịghị aja ha mma ma ọlị, ọ pụrụ ịdịrị ụmụaka ahụ mfe ịghọ ndị na-enweghịzi ùgwù onwe onye ma siere ha ike igosi ndị ọzọ mmetụta na-ekpo ọkụ.—Ndị Efesọs 4:31, 32.

Ị Pụrụ Ịchọta Enyemaka

Gịnị ma ọ bụrụ na a zụliteghị gị n’ezinụlọ nwere ịhụnanya? Ị ka pụrụ ịmụta igosipụta mmetụta na-ekpo ọkụ. Nzọụkwụ mbụ bụ ịmata nsogbu gị ma ghọta mkpa ọ dị ime mgbanwe. Okwu Chineke, bụ́ Bible, bụ ezi ihe inyeaka na nke a. A pụrụ iji ya tụnyere enyo. Mgbe anyị ji ozizi Bible nke dị ka enyo nyochaa onwe anyị, anyị na-ahụ ntụpọ, ma ọ bụ ọrụ, ndị dị n’echiche anyị. (Jems 1:23) N’ikwekọ n’ozizi Bible, anyị pụrụ imeziwanye ọchịchọ ọ bụla na-ekwesịghị ekwesị. (Ndị Efesọs 4:20-24; Ndị Filipaị 4:8, 9) Ọ dị anyị mkpa ịdị na-eme otú ahụ mgbe nile, ‘ghara ịda mbà ma ọlị n’ime ihe dị mma.’—Ndị Galeshia 6:9.

Ọ pụrụ isiri ụfọdụ ndị ike igosipụta mmetụta na-ekpo ọkụ n’ihi otú e si zụlite ha ma ọ bụ ọdịbendị ha. Otú ọ dị, nchọpụta ndị e mere na nso nso a na-egosi na a pụrụ imeri ihe mgbochi ndị dị otú ahụ. Dr. Daniel Goleman, bụ́ ọkachamara ná nsogbu uche, na-akọwa na ‘a pụrụ ịgbanwe ọbụna àgwà a kụnyere n’obi mmadụ mgbe ọ ka bụ nwata.’ Ihe karịrị narị afọ 19 gara aga, Bible gosiri na site n’enyemaka nke mmụọ Chineke, a pụrụ ịgbanwe ọbụna ọchịchọ ndị kasị gbanye mkpọrọgwụ n’obi mmadụ. Ọ na-adụ anyị ọdụ, sị: “Yipụnụ ụdị mmadụ ochie ahụ na omume ya, ma yikwasịnụ onwe unu ụdị mmadụ ọhụrụ.”—Ndị Kọlọsi 3:9, 10.

Ozugbo ezinụlọ chọpụtara nsogbu ha, ha pụrụ ịmụ Bible, na-eburu mkpa ha n’uche. Dị ka ihe atụ, gịnị ma unu chọpụta ihe Bible nwere ikwu banyere “mmetụta na-ekpo ọkụ”? Unu pụrụ ịchọta akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị ka nke a: “Unu anụwo banyere ntachi obi Job, unu ahụwokwa ihe Jehova mesịrị mee, na Jehova nwere mmetụta dị nnọọ nro ma na-emekwa ebere.” (Jems 5:11) Mgbe ahụ tụleekwa ihe e dekọrọ na Bible banyere Job, na-elekwasị anya n’otú Jehova si nwee mmetụta dị nnọọ nro na obi ebere n’ahụ́ Job. Obi abụọ adịghị ya na ị ga-achọ iṅomi Jehova n’inwe mmetụta dị nnọọ nro na obi ebere n’ebe ezinụlọ gị nọ.

Otú ọ dị, ebe anyị na-ezughị okè, “anyị nile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro” n’okwu. (Jems 3:2) N’ime ezinụlọ, anyị nwere ike ghara ịdị na-ekwu okwu n’ụzọ na-agba ume. N’ebe a ka ekpere na ịdabere na Jehova dị mkpa. Adala mbà. “Na-ekpenụ ekpere n’akwụsịghị akwụsị.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:17) Jehova ga-enyere ndị mmetụta na-ekpo ọkụ na-agụ agụụ n’ime ezinụlọ aka, ha na ndị chọrọ igosi ya ma a na-egbochi ha ime otú ahụ.

Tụkwasị na nke a, Jehova ejiriwo obiọma mee ka a na-enweta enyemaka n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Jems dere, sị: “È nwere onye ọ bụla na-arịa ọrịa [n’ụzọ ime mmụọ] n’etiti unu? Ka ọ kpọọ ndị okenye nke ọgbakọ, ka ha kpeekwara ya ekpere, na-ete ya mmanụ n’aha Jehova.” (Jems 5:14) Ee, ndị okenye nọ n’ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova pụrụ inyere ezinụlọ ndị ọ na-esiri ndị òtù ha ike igosirịta ibe ha mmetụta na-ekpo ọkụ aka n’ụzọ dị ukwuu. N’agbanyeghị na ha abụghị ndị na-agwọ ọrịa uche, ndị okenye pụrụ iji ndidi nyere ndị kwere ekwe ibe ha aka, ọ bụghị ịgwa ha ihe ha kwesịrị ime, kama ichetara ha otú Jehova si ele ihe anya na isonyere ha n’ekpere na ikpe ekpere n’isi ha.—Abụ Ọma 119:105; Ndị Galeshia 6:1.

N’ihe banyere Tohru na Yoko, Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye gere ntị ná nsogbu ha mgbe nile ma kasie ha obi. (1 Pita 5:2, 3) N’oge ụfọdụ, onye okenye na nwunye ya na-eleta ha ka Yoko wee nwee ike irite uru ná nnọkọ nke ya na nwanyị bụ́ Onye Kraịst nwere ahụmahụ bụ́ onye pụrụ ime ka Yoko nweghachi ‘uche ziri ezi ịhụ di ya n’anya.’ (Taịtọs 2:3, 4) Site n’igosi Ndị Kraịst ibe ha nghọta na ọmịiko maka nhụjuanya na obi mgbawa ha na-enwe, ndị okenye na-aghọ “ebe izonahụ ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo.”—Aịsaịa 32:1, 2.

Site n’enyemaka nke ndị okenye nwere obiọma, Tohru bịara ghọta na o nwere nsogbu n’ụzọ o si egosipụta mmetụta ya nakwa na “n’ụbọchị ikpeazụ” a, Setan na-awakpo njikọ ezinụlọ. (2 Timoti 3:1) Tohru kpebiri idozi nsogbu ya. Ọ malitere ịchọpụta na ihe mere ọ na-ejighị nwee ike igosipụta ịhụnanya bụ n’ihi na e gosighị ya ịhụnanya mgbe ọ na-etolite. Site n’ịmụsi Bible ike na ikpe ekpere, Tohru bịara jiri nke nta nke nta na-egbo mkpa mmetụta uche nke Yoko.

Ọ bụ ezie na ọ nọwo na-ewesa Tohru iwe, mgbe Yoko ghọtara ụdị ezinụlọ Tohru si na ya pụta ma hụ amaghị eme nke ya onwe ya, ọ mere mgbalị siri ike ịhụ ebe di ya na-eme nke ọma. (Matiu 7:1-3; Ndị Rom 5:12; Ndị Kọlọsi 3:12-14) O ji ezi obi rịọ Jehova maka ume iji nọgide na-ahụ di ya n’anya. (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ka oge na-aga, Tohru malitere igosipụta mmetụta na-ekpo ọkụ bụ́ nke na-eme nwunye ya obi ụtọ.

Ee, a sịgodị na ọ na-esiri gị ike inwe na igosipụta mmetụta na-ekpo ọkụ n’ime ezinụlọ, n’ezie ị pụrụ imeri nsogbu ahụ. Okwu Chineke na-enye anyị nduzi dị mma. (Abụ Ọma 19:7) Site n’ịghọta otú okwu ahụ siruru n’ike, site n’ịgbalị ịhụ ebe ndị òtù ezinụlọ gị na-eme nke ọma, site n’ịmụ na itinye Okwu Chineke n’ọrụ, site n’ịdabere na Jehova site n’ekpere sitere n’ala ala obi, na site n’ịchọ enyemaka nke Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye tozuru okè, ị pụrụ imeri ihe pụrụ iyi ihe mgbochi dị egwu nke dị n’etiti gị na ndị òtù ezinụlọ gị. (1 Pita 5:7) Gị onwe gị pụkwara ịṅụrị ọṅụ dị ka otu di nọ na United States mere. A gbara ya ume ikwupụta mmetụta na-ekpo ọkụ o nwere n’ebe nwunye ya nọ. Mgbe o mesịrị kata obi ịsị, “Ahụrụ m gị n’anya,” ihe nwunye ya zaghachiri ya juru ya anya. O ji anya mmiri nke ọṅụ kwuo, sị: “Ahụkwara m gị n’anya, ma nke a bụ nke mbụ ya n’ime afọ 25 i sitụrụla otú a kwuo ya.” Echerela ka o ruo ogologo oge ruru otú ahụ tupu i gosipụta mmetụta na-ekpo ọkụ i nwere n’ebe onye òtù ọlụlụ gị na ụmụ gị nọ!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a A gbanwewo aha ụfọdụ.

[Foto dị na peeji nke 28]

Jehova na-eme ka e nweta enyemaka site n’Okwu ya, bụ́ Bible

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya