Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
N’ihi gịnị ka otú e si nye akwụkwọ Abụ Ọma nọmba ji dịgasịa iche ná nsụgharị Bible dị iche iche?
Bible mbụ zuru ezu nke nwere isiakwụkwọ na amaokwu bụ nsụgharị French nke Robert Estienne bipụtara na 1553. Otú ọ dị, o doro anya na akwụkwọ Abụ Ọma enwewo akụkụ dị iche iche ogologo oge tupu mgbe ahụ, ebe ọ bụ na ọ bụ nchịkọta nke abụ dịgasị iche iche, bụ́ ndị ọtụtụ ndị rọrọ.
Dị ka ihe àmà na-egosi, Devid bụ onye mbụ Jehova nyere ntụziaka ịchịkọta ọtụtụ abụ maka iji ya eme ihe n’ofufe ihu ọha. (1 Ihe E Mere 15:16-24) E kweere na Ezra, bụ́ onye nchụàjà na “odeakwụkwọ nke bụ́ onye ọkà,” mesịrị chịkọta akwụkwọ Abụ Ọma gaa n’otú ọ dị ugbu a. (Ezra 7:6) Ya mere, ọ pụtara na ihe mejupụtara akwụkwọ Abụ Ọma mgbe a chịkọtara ya bụ abụ dịgasị iche iche.
N’okwu Pọl kwuru n’ụlọ nzukọ dị n’Antiọk (Pisidia) na njem ozi ala ọzọ ya nke mbụ, o hotara ihe site n’akwụkwọ Abụ Ọma, ma sị: “Ọbụna dị ka e dere n’abụ ọma nke abụọ, sị, ‘Ị bụ ọkpara m, aghọwo m Nna gị taa.’” (Ọrụ 13:33) Na Bible dị iche iche taa, okwu ndị ahụ ka dị n’abụ ọma nke abụọ, amaokwu nke 7. Otú ọ dị, otu e si nye ọtụtụ abụ ndị ahụ nọmba ná nsụgharị Bible dị iche iche dịgasị iche. Nke a bụ n’ihi na e si n’ihe odide ndị Masorete nke Hibru sụgharịta ụfọdụ nsụgharị Bible, ebe e si na Septuagint nke Grik, nke bụ́ nsụgharị nke ihe odide Hibru nke a sụgharịchara na narị afọ nke abụọ T.O.A., sụgharịta ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, otú e si nye Abụ Ọma nọmba na Vulgate Latin, bụ́ nke e si na ya sụgharịta ọtụtụ Bible ndị Katọlik, yiri nke Septuagint, ebe Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ na nsụgharị ndị ọzọ gbasoro otú e si nye ya nọmba n’ihe odide Hibru.
Gịnị bụ ọdịiche ndị a kapịrị ọnụ? Ihe odide Hibru nwere ngụkọta nke abụ ọma 150. Otú ọ dị, Septuagint jikọtara Abụ Ọma nke 9 na nke 10 ịbụ otu abụ, jikọtakwa Abụ Ọma nke 114 na 115 ịbụ otu. Ọzọkwa, o kewara Abụ Ọma nke 116 na nke 147 abụọ abụọ. Ọ bụ ezie na ngụkọta ha nile ka bụ otu, otú e si nye nọmba site n’Abụ Ọma nke 10 ruo na nke 146 na Septuagint ji otu dị ala karịa otú e si nye ya n’ihe odide Hibru. N’ihi ya, Abụ Ọma nke 23 ahụ a ma ama pụtara dị ka Abụ Ọma nke 22 na Douay Version, bụ́ nke gbasoro otú e si nye ya nọmba na Vulgate Latin, bụ́ nke gbasoro Septuagint n’onwe ya.
N’ikpeazụ, amaokwu nke ụfọdụ abụ ọma pụkwara ịdị iche site n’otu nsụgharị gaa n’ọzọ. N’ihi gịnị? Nke a bụ n’ihi na nsụgharị ụfọdụ gbasoro “omume ndị Juu nke iwere ihe ndị e dekwasịrị n’elu abụ dị ka amaokwu mbụ,” ka akwụkwọ bụ́ Cyclopedia nke McClintock na Strong dere na-ekwu, ma ndị ọzọ emeghị otú ahụ. N’ezie, ọ bụrụ na ihe e dekwasịrị n’elu abụ toro ogologo, a na-ewerekarị ya dị ka amaokwu abụọ, amaokwu ndị dịkwa n’abụ ọma ahụ na-amụbakwa n’ihi ya.