Ị Pụrụ Ikwere na Paradaịs Elu Ala
N’AKỤKỌ ihe mere eme nile, ọtụtụ nde mmadụ kweere na ha ga-emecha hapụ ụwa gawa eluigwe. Ụfọdụ echewo na ọ dịghị mgbe Onye Okike anyị bu n’obi ka ụwa bụrụ ebe obibi anyị ga-adịgide adịgide. Ndị na-anapụ onwe ha ihe kweere ihe siri ike karịa nke ahụ. Nye ọtụtụ n’ime ha, ụwa na ihe nile a na-ahụ anya bụ ihe ọjọọ—ihe mgbochi nye inweta ezi afọ ojuju ime mmụọ na ịnọ Chineke nso.
Ma ọ́ bụghị na ndị zụlitere echiche ndị ahụ e kwuru n’elu amaghị ihe Chineke kwuru banyere ụwa paradaịs, ọ bụrụ na ha họọrọ ileghara ya anya. N’ezie, ọtụtụ ndị taa adịghị egosi mmasị n’inyocha ihe Chineke nyere ndị mmadụ mmụọ nsọ ya ide banyere okwu a n’ime Okwu ya bụ́ Bible. (2 Timoti 3:16, 17) Ma, ọ́ bụghị ihe amamihe dị na ya ịtụkwasị Okwu Chineke obi kama ịnakwere nchepụta ụmụ mmadụ? (Ndị Rom 3:4) N’ezie, ọ dị mkpa anyị ime otú ahụ ebe ọ bụ na Bible na-adọ anyị aka ná ntị na otu mmụọ e kere eke dị ike nke a na-apụghị ịhụ anya emewo ka ndị mmadụ kpuo ìsì n’ụzọ ime mmụọ, na ọ nọkwa ugbu a “na-eduhie ụwa dum mmadụ bi.”—Mkpughe 12:9; 2 Ndị Kọrint 4:4.
Gịnị Mere E Ji Nwee Mgbagwoju Anya?
Echiche ndị na-emegiderịta onwe ha banyere mkpụrụ obi emewo ka ọtụtụ ndị nwee mgbagwoju anya banyere nzube Chineke maka ụwa. Ọtụtụ kweere na anyị nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ—ihe dịpụrụ iche site n’ahụ́ mmadụ, nke na-adịgidekwa ndụ mgbe mmadụ nwụsịrị. Ndị ọzọ kweere na mkpụrụ obi dị adị tupu e kee ahụ́ mmadụ. Dị ka otu akwụkwọ ntụaka si kwuo, ọkà ihe ọmụma Gris bụ́ Plato chere na “a tụrụ mkpụrụ obi mkpọrọ n’ime ahụ́ dị ka ntaramahụhụ maka mmehie [mkpụrụ obi ahụ] mere mgbe ọ nọ n’eluigwe.” N’otu aka ahụ, onye ọkà mmụta okpukpe nke narị afọ nke atọ, bụ́ Origen kwuru na “mkpụrụ obi mehiere [n’eluigwe] tupu e jikọta ha na ahụ́, a tụọkwa ha mkpọrọ [n’ahụ́ n’ụwa] dị ka ntaramahụhụ maka mmehie ha.” Ọtụtụ nde mmadụ kwekwaara na ụwa bụ nanị ebe nnwale na njem mmadụ gaa n’eluigwe.
E nwekwara echiche dịgasị iche banyere ihe na-eme mkpụrụ obi mgbe mmadụ nwụrụ. Dị ka akwụkwọ bụ́ History of Western Philosophy si kwuo, ndị Ijipt zụlitere echiche bụ́ na “mkpụrụ obi ndị nwụrụ anwụ na-agbada n’ụwa ndị nwụrụ anwụ.” Ndị ọkà ihe ọmụma mechara kwuo na mkpụrụ obi ndị nwụrụ anwụ adịghị agbada n’ụwa ndị nwụrụ anwụ nke gbara ọchịchịrị kama na ha na-arịgo n’ezie n’ebe ka elu nke ógbè ndị bụ́ mmụọ. E kwuru na onye ọkà ihe ọmụma Gris bụ́ Socrates kweere na n’ọnwụ, mkpụrụ obi na-apụ gaa n’ebe anya na-apụghị ịhụ . . . ma soro ndị bụ́ chi nọrọ ruo ogologo oge nile nke ịdị adị ya.”
Gịnị Ka Bible Na-ekwu?
Ọ dịghị ebe Okwu Chineke sitere n’ike mmụọ nsọ bụ́ Bible, kwuru na mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ. Gụọ ihe ndekọ dị na Jenesis 2:7 n’onwe gị. Ọ na-ekwu sị: “Jehova, bụ́ Chineke, wee were ájá sitere n’ala kpụọ mmadụ, O wee kuo ume ndụ nye n’oghere imi ya abụọ; mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.” Nke ahụ doro anya ma kwe nghọta. Mgbe Chineke kere nwoke mbụ bụ́ Adam, O tinyeghị ihe a na-apụghị ịhụ anya n’ime ya. Ee e, n’ihi na Bible na-ekwu na ‘mmadụ ahụ ghọrọ mkpụrụ obi dị ndụ.’ Mmadụ ahụ enweghị mkpụrụ obi n’ime onwe ya. Ọ bụ mkpụrụ obi.
Mgbe o kere ụwa na ezinụlọ nke ihe a kpọrọ mmadụ, Jehova ebutụghị n’obi ka mmadụ na-anwụ anwụ. Nzube Chineke bụ na mmadụ ga-ebi ndụ n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi n’ọnọdụ Paradaịs. Adam nwụrụ nanị n’ihi na o nupụụrụ iwu Chineke isi. (Jenesis 2:8, 15-17; 3:1-6; Aịsaịa 45:18) Mgbe mmadụ mbụ ahụ nwụrụ, ọ̀ gara n’ógbè ndị bụ́ mmụọ? Ee e! Ọ—mkpụrụ obi ahụ bụ́ Adam—laghachiri n’ájá nkịtị e siri na ya kee ya.—Jenesis 3:17-19.
Anyị nile eketawo mmehie na ọnwụ site n’aka nna nna anyị bụ́ Adam. (Ndị Rom 5:12) Ọnwụ a bụ ịkwụsị ịdị adị, dị nnọọ ka Adam kwụsịrị ịdị adị. (Abụ Ọma 146:3, 4) N’eziokwu, n’ime akwụkwọ 66 ya nile, Bible adịtụghị ejikọta okwu ahụ bụ́ “anwụghị anwụ” ma ọ bụ “ndụ ebighị ebi” na okwu bụ́ “mkpụrụ obi.” N’ụzọ megidere nke ahụ, Akwụkwọ Nsọ na-ekwu n’ụzọ doro anya na mkpụrụ obi—mmadụ ahụ—na-anwụ anwụ. Mkpụrụ obi na-anwụ anwụ.—Eklisiastis 9:5, 10; Ezikiel 18:4.
Ihe Ndị A Na-ahụ Anya Hà Dị Njọ n’Onwe Ha?
Gịnị banyere echiche bụ́ na ihe ndị a na-ahụ anya, gụnyere ụwa, dị njọ? Nke a bụ echiche ndị okpukpe Mani nwere, bụ́ òtù okpukpe nke otu nwoke a na-akpọ Mani guzobere na Peasia na narị afọ nke atọ O.A. Akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica na-ekwu, sị: “Okpukpe Mani malitere n’ihi ọnọdụ nhụjuanya nke ụmụ mmadụ.” Mani kweere na ịbụ mmadụ bụ “ihe na-ekwekọghị n’okike, ihe a na-apụghị idi edi, na ihe dị nnọọ njọ.” O kwekwaara na nanị ụzọ a pụrụ isi pụọ ná “nhụjuanya” a bụ mkpụrụ obi ịhapụ ahụ́ mmadụ, ịhapụ ụwa na inweta ahụ́ mmụọ n’ụwa ndị bụ́ mmụọ.
N’ụzọ megidere nke ahụ, Bible na-agwa anyị na n’anya Chineke, “ihe nile ọ bụla O mere” mgbe ọ na-eke ụwa na mmadụ “dị mma nke ukwuu.” (Jenesis 1:31) N’oge ahụ, ọ dịghị ihe mgbochi dị n’etiti mmadụ na Chineke. Adam na Iv na Jehova nwere mmekọrịta chiri anya, ọbụna dị ka mmadụ ahụ zuru okè bụ́ Jizọs Kraịst na Nna ya nke eluigwe nwere mmekọrịta chiri anya.—Matiu 3:17.
A sị na nne na nna mbụ anyị bụ́ Adam na Iv agbasoghị ụzọ mmehie, ha na Jehova Chineke gaara enwewo mmekọrịta chiri anya ruo mgbe ebighị ebi n’ime ụwa paradaịs. Ha malitere ndụ na Paradaịs n’ihi na Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị, sị: “Jehova, bụ́ Chineke, wee kụọ ubi nke a gbara ogige n’Iden, n’Ihu anyanwụ; O wee tinye mmadụ ahụ n’ebe ahụ, bụ́ onye Ọ kpụrụrịị.” (Jenesis 2:8) Ọ bụ n’ime ogige paradaịs ahụ ka e kere Iv. A sị na Adam na Iv emehieghị, ha na ụmụ ha zuru okè gaara arụkọwo ọrụ ọnụ n’obi ụtọ ruo mgbe ụwa nile ghọrọ paradaịs. (Jenesis 2:21; 3:23, 24) Paradaịs elu ala ahụ gaara aghọwo ebe obibi nke ihe a kpọrọ mmadụ ruo mgbe ebighị ebi.
N’ihi Gịnị Ka Ụfọdụ Ga-eji Gaa Eluigwe?
‘Ma Bible na-ekwu banyere ndị mmadụ ịga eluigwe, ka ọ̀ bụ na ọ dịghị ekwu?’ ka ị pụrụ ikwu. Ee. Mgbe Adam mehiesịrị, Jehova kpebiri iguzobe otu Alaeze eluigwe ebe ụfọdụ n’ime ụmụ Adam ga-eso Jizọs Kraịst ‘chịa ụwa dị ka ndị eze.’ (Mkpughe 5:10; Ndị Rom 8:17) A ga-akpọlite ha n’ọnwụ gaa ná ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe. Ọnụ ọgụgụ ha ga-emesịa bụrụ 144,000, ndị na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị ntụkwasị obi nke narị afọ mbụ bụkwa ndị mbụ n’ime ha.—Luk 12:32; 1 Ndị Kọrint 15:42-44; Mkpughe 14:1-5.
Otú ọ dị, ọ bụghị nzube mbụ Chineke ka ụmụ mmadụ ziri ezi hapụ ụwa gawa eluigwe. N’ezie, mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o kwuru, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla rịgowooro n’eluigwe ma e wezụga onye ahụ nke si n’eluigwe rịdata, bụ́ Nwa nke mmadụ.” (Jọn 3:13) Site n’aka “Nwa nke mmadụ,” bụ́ Jizọs Kraịst, Chineke nyere ihe mgbapụta nke na-eme ka ndụ ebighị ebi maka ndị na-egosipụta okwukwe n’àjà Jizọs kwe omume. (Ndị Rom 5:8) Ma n’ole ebe ka ọtụtụ nde ụmụ mmadụ dị otú ahụ ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi?
A Ga-emezu Nzube Mbụ nke Chineke
Ọ bụ ezie na Chineke zubere ịkpọrọ ụfọdụ site n’ezinụlọ mmadụ iso Jizọs Kraịst chịa n’Alaeze eluigwe, ọ dịghị apụta na ndị ọma nile ga-aga eluigwe. Jehova kere ụwa ka ọ bụrụ ebe obibi Paradaịs nke ezinụlọ mmadụ. N’oge na-adịghị anya, Chineke ga-emezu nzube mbụ ahụ.—Matiu 6:9, 10.
N’okpuru ọchịchị Jizọs Kraịst na ndị ọchịchị eluigwe ibe ya, udo na ọṅụ ga-ejupụta n’ụwa nile. (Abụ Ọma 37:9-11) Ndị nọ ná ncheta Chineke ga-esi n’ọnwụ bilie ma nweta ahụ́ ike zuru okè. (Ọrụ 24:15) N’ihi ikwesị ntụkwasị obi ha nye Chineke, a ga-enyeghachi ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ihe nne na nna anyị mbụ tụfuru—ndụ ebighị ebi n’izu okè n’ime ụwa paradaịs.—Mkpughe 21:3, 4.
Jehova Chineke na-emezu nzube ya mgbe nile. Site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Aịzaịa, o kwuru, sị: “Dị ka oké mmiri ozuzo na snow si esi n’eluigwe ezo, ma ọ bụghị n’ebe ahụ ka ọ na-alaghachi, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ desịa ala, wee mee ka o mee ihe omume, ka o puokwa ihe opupu; o wee were mkpụrụ nye ọgha mkpụrụ, werekwa nri nye onye na-eri ihe; otú a ka okwu m dị nke na-esi n’ọnụ m pụta: ọ gaghị alaghachikwute m n’efu, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ mezuo ihe tọrọ m ụtọ, wee gaa nke ọma n’ihe M zigara ya.”—Aịsaịa 55:10, 11.
N’akwụkwọ Bible bụ́ Aịsaịa, anyị na-ahụpere ihe ndụ ga-adị ka ya n’ụwa Paradaịs. Ọ dịghị onye obibi Paradaịs nke ga-asị, “Ana m arịa ọrịa.” (Aịsaịa 33:24) Ụmụ anụmanụ agaghị abụrụ ụmụ mmadụ ihe ize ndụ. (Aịsaịa 11:6-9) Ụmụ mmadụ ga-ewu ọmarịcha ụlọ ma biri n’ime ha, kụọkwa mkpụrụ ma rijuo afọ. (Aịsaịa 65:21-25) Ọzọkwa, Chineke ‘ga-eloda ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi; Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu nile.’—Aịsaịa 25:8.
N’oge na-adịghị anya, ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ga-ebi n’okpuru ọnọdụ ndị dị otú ahụ magburu onwe ha. ‘A ga-emekwa ka ha nwere onwe ha pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure ma nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.’ (Ndị Rom 8:21) Lee ka ọ ga-esi magbuo onwe ya ịdị ndụ ebighị ebi na Paradaịs elu ala ahụ e kwere ná nkwa! (Luk 23:43) Ị pụrụ ịnọ n’ebe ahụ ma ọ bụrụ na i mee ihe kwekọrọ n’ezi ihe ọmụma nke Akwụkwọ Nsọ ma gosipụta okwukwe n’ebe Jehova Chineke na Jizọs Kraịst nọ. Ị pụkwara inwe obi ike na ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwere na paradaịs elu ala.
[Foto dị na peeji nke 5]
E kere Adam na Iv ibi ndụ na paradaịs elu ala ruo mgbe ebighị ebi
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Na Paradaịs elu ala ahụ . . .
ha ga-ewu ụlọ
ha ga-akụ ubi vaịn
Jehova ga-agọzi ha
[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 4]
Ụlọ Ọrụ U.S. Na-ahụ Maka Azụ na Anụ Ndị Bi n’Ọhịa, Washington, D.C./NASA