Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w03 11/15 p. 26
  • “Lee Otú Okwu Chineke Si Dị Nnọọ Ike!”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Lee Otú Okwu Chineke Si Dị Nnọọ Ike!”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Kalenda 2011 Gosiri Uru Ofufe Ezinụlọ Bara
    Ozi Alaeze Anyi—2010
  • Kalenda Ndị Maya nke Dị Ịtụnanya
    Teta!—2005
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
w03 11/15 p. 26

“Lee Otú Okwu Chineke Si Dị Nnọọ Ike!”

“OKWU Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.” (Ndị Hibru 4:12) N’ịgbara ike a na-apụghị iguzogide eguzogide nke Okwu Chineke akaebe, 2003 Calendar of Jehovah’s Witnesses nwere akụkọ ndụ isii sitere gburugburu ụwa. N’okpuru isiokwu bụ́ “Tupu Ya Amalite na Mgbe Ọ Malitesịrị,” kalenda ahụ gosiri otú ọrụ izi ihe nke Ndịàmà Jehova si enyere ndị mmadụ aka ime ka omume ha ka mma, ịhapụ ụzọ ndụ ịla n’iyi, ime ka ndụ ezinụlọ ha sikwuo ike, na iso Chineke na-enwe mmekọrịta chiri anya.

A natawo ọtụtụ akwụkwọ ozi ndị na-egosi ekele e nwere maka kalenda 2003. Nke a bụ ihe ụfọdụ ndị e kwuru:

“Kalenda a bụ ihe na-egosi ezi Ndị Kraịst na e nwere ndị dị nnọọ ka ha bụ́ ndị lụsiworo ọgụ ike maka okwukwe ahụ. Ugbu a ha pụrụ ịdị na-ekiri foto ndị ahụ dị ka ihe ncheta nke mgbanwe ụfọdụ ndị meworo.”—Steven, United States.

“Achọrọ m nnọọ idetara unu okwu ole na ole ndị a iji mee ka unu mata otú kalenda 2003 siworo metụ m n’ahụ́. Ọ dịbeghị mgbe ọ bụla kalenda nwere mmetụta dị otú ahụ n’ahụ́ m. Akụkọ ndụ ndị a ga-abụ otu n’ime ihe ndị m ga na-ebu n’akpa ozi ọma m iji gosi ndị mmadụ ihe àmà a na-ahụ anya nke mmetụta Bible pụrụ inwe n’ahụ́ ndị mmadụ n’otu n’otu.”—Marc, Belgium.

“Kalenda ahụ kpaliri m nnọọ nke ukwuu. O metụrụ m n’ahụ́ nke ukwuu ịgụ ma hụ otú Jehova siworo gbanwee ndị a. N’ihi ya, a kpaliwo m ịnọgide na-eme mgbanwe ná ndụ m. M na-enwe mmetụta nke ịbụ akụkụ nke òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ.”—Mary, United States.

“Ọnọdụ ọjọọ ìgwè mmadụ nọ na ya n’ụzọ ime mmụọ metụrụ Jizọs n’ahụ́ n’ụzọ dị ukwuu. Unu emeela maka iṅomi ihe nlereanya Kraịst site n’ibipụta akụkọ ndụ ndị ahụ pụtara na kalenda anyị nke 2003. Ọ dịbeghị mgbe ọ bụla ọzọ ná ndụ m kalenda mere ka anya mmiri gbaa m.”—Cassandra, United States.

“Mgbe m dị afọ 11, amalitere m ise siga; mesịakwa jiri ọgwụ ọjọọ mee ihe. Echere m echiche igbu onwe m ọtụtụ ugboro. Mgbe m bịara mara Jehova, e nyeere m aka ịkwụsị àgwà ndị ahụ. Kalenda a dị m nnọọ mkpa. Ihe atụ nke ụmụnna m ndị nwoke na ndị nwanyị sitere gburugburu ụwa na-eme ka m sie ike. Ugbu a, amaara m na ọ bụghị nanị m na-alụ ọgụ a nakwa na ihe kasị mkpa bụ ịhụ Jehova n’anya na iji obi dum na-ejere ya ozi.”—Margaret, Poland.

“Lee otú Okwu Chineke si dị nnọọ ike! Mgbe m nwetara kalenda 2003, agbalisiri m ike ịghara ibe ákwá. Ahụmahụ ndị ahụ, tinyere foto ndị dị na ha na-eme ka okwukwe sie ike.”—Darlene, United States.

“Ụzọ ndụ nke ụfọdụ n’ime ndị a yiri nnọọ ụzọ ndụ m na mbụ. Jehova enyewo m ume imeri ihe ọjọọ ndị yiri ihe a na-apụghị imeri emeri. Unu emeela nke ukwuu maka akụkọ ndụ ndị a.”—William, United States.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya