Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w03 12/1 p. 29
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ọgwụgwụ Unu Eruola”
    A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ezikiel—Akụkụ nke Mbụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Otú Jehova Si Enyere Anyị Aka Ijezu Ozi Anyị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ezikiel—Akụkụ nke Abụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
w03 12/1 p. 29

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

N’echiche dị aṅaa ka Izikiel ‘dara ogbi’ n’oge nnọchibido na mbibi nke Jeruselem?

N’ụzọ bụ́ isi, ọ bụ n’echiche nke na o nweghị ihe ọ ga-atụkwasị n’ozi amụma Jehova nke o ziworo.

Onye amụma bụ́ Izikiel malitere ozi ya dị ka onye nche na-ekwesị ntụkwasị obi nke ụmụ Izrel a dọọrọ n’agha laa Babilọn ‘n’afọ nke ise nke e mere ka Eze Jehoịakin jee biri n’ala ọzọ,’ ya bụ, n’afọ 613 T.O.A. (Ezikiel 1:2, 3) N’ụbọchị nke iri n’ọnwa nke iri n’ikwekọ ná mpụta nke ọnwa n’afọ 609 T.O.A., e sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke gwa ya banyere mmalite nke nnọchibido ndị Babilọn ga-anọchibido Jeruselem. (Ezikiel 24:1, 2) Gịnị ga-esi ná nnọchibido a pụta? Jeruselem na ndị na-enweghị okwukwe bi na ya hà ga-alanarị? Dị ka onye nche, Izikiel ezielarị ozi Jehova doro anya banyere mbibi, ọ dịghịkwa mkpa ka Izikiel tụkwasị ihe ọ bụla n’elu ya, dị ka ọ̀ na-achọ ime ka ozi ahụ dokwuo anya. Izikiel dara ogbi n’ikwu ihe ọzọ banyere nnọchibido a ga-anọchibido Jeruselem.—Ezikiel 24:25-27.

Ihe dị ka ọnwa isii ka e bibisịrị Jeruselem na 607 T.O.A., otu onye gbapụrụ agbapụ wetaara Izikiel ozi na Babilọn banyere ntọgbọrọ n’efu nke obodo nsọ ahụ. N’uhuruchi tupu onye ahụ gbapụrụ agbapụ abịarute, Jehova “wee saghee ọnụ [Izikiel] . . . ; [o] wee ghara ịdakwa ogbi ọzọ.” (Ezikiel 33:22) Nke ahụ wetara ịda ogbi Izikiel ná njedebe.

Izikiel ọ̀ dara ogbi n’ụzọ nkịtị n’oge ahụ? Ọ dịghị ma ọlị, n’ihi na ọbụna mgbe ọ dasịrị “ogbi” a, o buru amụma ndị metụtara karịsịa obodo ndị gbara Jeruselem gburugburu, bụ́ ndị ṅụrịrị ọṅụ n’ihi ọdịda ya. (Ezikiel, isi nke 25-32) Ná mmalite nke ọrụ Izikiel dị ka onye amụma na onye nche, Jehova gwara ya, sị: “Ire gị rapara n’okpo ọnụ gị, i wee ghọọ ogbi, ghara ịbụrụ ha onye na-adọ aka ná ntị: n’ihi na ụlọ nnupụisi ka ha bụ. Ma mgbe m na-akpanyere gị ụka, m ga-emeghe ọnụ gị.” (Ezikiel 3:26, 27) Mgbe Jehova na-enweghị ozi a ga-ezi Izrel, Izikiel agaghị agwa mba ahụ ihe ọ bụla. Izikiel ga-ekwu ihe Jehova chọrọ ka o kwuo n’oge Jehova chọrọ ka o kwuo ya. Ịda ogbi Izikiel pụtara na ọ gwaghị ụmụ Izrel okwu amụma ọ bụla.

Òtù onye nche nke oge a, bụ́ Ndị Kraịst e tere mmanụ, anọwo na-adọ aka ná ntị banyere mbibi nke Krisendọm, bụ́ Jeruselem ihe atụ. Mgbe “oké mkpagbu” ahụ tiwapụrụ ma bibie “Babilọn Ukwu ahụ,” bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, ọ gaghịzi adị mkpa ka òtù Izikiel ahụ e tere mmanụ kwuo ihe ọ bụla banyere mbibi nke Krisendọm, nke bụ́ akụkụ ka ukwuu nke alaeze ukwu ahụ.—Matiu 24:21; Mkpughe 17:1, 2, 5.

Ee, ụbọchị na-abịa mgbe ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ na ndị enyi ha ga-ada ogbi, n’enweghịzi ihe ọzọ ha ga-agwa Krisendọm. Nke ahụ ga-abụ mgbe “mpi iri ahụ” na “anụ ọhịa ahụ” ga-eme ka Babilọn Ukwu ahụ laa n’iyi na ka ọ gbara ọtọ. (Mkpughe 17:16) N’ezie, nke a apụtaghị na Ndị Kraịst ga-ada ogbi n’ụzọ nkịtị. Ọbụna dị ka ha na-eme ugbu a, ha ga na-eto Jehova ma na-eme ka e cheta ya kwa ụbọchị na “n’ọgbọ nile.”—Abụ Ọma 45:17; 145:2.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya