Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w03 12/15 p. 28-29
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Enyi Anyị Kasị Mma Nọ n’Ógbè Ndị Mmụọ
    Teta!—1996
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Nnupụisi n’Ógbè Ndị Bụ Mmụọ
    Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?
  • Ọhụụ Ndị Mere Ka A Mata Ndị Bí n’Eluigwe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
w03 12/15 p. 28-29

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

N’ekpere nlereanya ya, Jizọs ọ̀ na-enye echiche na a nọ na-eme uche Chineke n’eluigwe n’agbanyeghị na a chụpụbeghị ndị ajọ mmụọ ozi?

Dị ka e dekọrọ na Matiu 6:10, Jizọs kwuru, sị: “Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” A pụrụ ịghọta asụsụ mbụ Jizọs ji mee ihe n’arịrịọ a n’ụzọ abụọ. Nke mbụ, dị ka arịrịọ ka e mee uche Chineke n’ụwa dị ka a na-eme ya rịị n’eluigwe, ma ọ bụ nke abụọ, dị ka arịrịọ ka e mezuo ya ma n’eluigwe ma n’ụwa.a Ihe okwu Jizọs bu ụzọ kwuo bụ́ “ka alaeze gị bịa,” pụtara na-egosi na nghọta nke abụọ ahụ ka kwekọọ n’ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu. Ọ na-egosikwa ọnọdụ dị mgbe Jizọs nọ n’ụwa na ogologo oge ka nke ahụ gasịrị. Ò si aṅaa dị otú ahụ?

Akwụkwọ Mkpughe na-arụtụ aka n’ihe abụọ dịgasị iche nguzobe nke Alaeze Chineke n’eluigwe rụpụtara. Nke mbụ metụtara eluigwe n’onwe ya, nke abụọ emetụta ụwa. Mkpughe 12:7-9, 12 na-ekwu, sị: “Agha wee daa n’eluigwe: Maịkel na ndị mmụọ ozi ya busoro dragọn ahụ agha, dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya bukwara agha ma dragọn ahụ emerighị, e nwekwaghị ọnọdụ maka ha n’eluigwe. Otú ahụ ka e si chụda dragọn ukwu ahụ, bụ́ agwọ mbụ ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa dum mmadụ bi; a chụdara ya n’ụwa, chụdakwa ya na ndị mmụọ ozi ya. N’ihi nke a na-aṅụrịnụ ọṅụ, unu eluigwe nile na unu ndị bi n’ime ha! Ahụhụ ga-adịrị ụwa, dịkwara oké osimiri, n’ihi na Ekwensu arịdakwuruwo unu, na-ewe oké iwe, ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.”

Nchụpụ a chụpụrụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ n’eluigwe ka 1914 gasịrị kpochapụrụ ndị mmụọ nile na-enupụ isi pụọ n’ógbè ahụ, wee wetara ndị mmụọ ozi Jehova na-eguzosi ike n’ihe ọṅụ dị ukwuu, bụ́ ndị mejupụtara ọnụ ọgụgụ ka nnọọ ukwuu nke ndị o kere eke bụ́ mmụọ. (Job 1:6-12; 2:1-7; Mkpughe 12:10) N’ụzọ dị otú a, e mezuru arịrịọ dị n’ekpere nlereanya Jizọs n’akụkụ nke metụtara eluigwe. Ndị nile fọdụrụ n’ógbè eluigwe ahụ guzosiri ike n’ihe nye Jehova ma nọrọ n’okpuru ọbụbụeze ya kpam kpam.

A ghaghị imesi ya ike na ọbụna tupu nke a, mgbe ndị ajọ mmụọ ahụ ka nwere ohere ịba n’eluigwe, ha bụ ndị a mapụrụ n’iwu n’ezinụlọ Chineke, nọrọkwa ná mmachibido iwu doro anya. Dị ka ihe atụ, Jud amaokwu nke 6 kpughere na narị afọ mbụ O.A., ‘e jiriworịị agbụ ebighị ebi debe ha n’okpuru oké ọchịchịrị ime mmụọ maka ikpe nke oké ụbọchị ahụ.’ N’otu aka ahụ, 2 Pita 2:4 na-ekwu, sị: “N’ezie ọ bụrụ na Chineke alaghị azụ n’inye ndị mmụọ ozi ahụ mehierenụ ahụhụ, kama, site n’ịtụba ha n’ime Tatarọs [ọnọdụ nke ịbụ ndị a chụpụrụ nnọọ achụpụ], o nyefere ha n’olulu nke oké ọchịchịrị [ime mmụọ] ịbụ ndị e debere maka ikpe.”b

N’ụzọ dị nnọọ iche site n’ọnọdụ ha nke ịbụ ndị a mapụrụ n’iwu n’ụzọ ime mmụọ mgbe ha ka nọ n’eluigwe, ndị ajọ mmụọ a akpawo ike dị ukwuu n’ụwa. N’ezie, Okwu Chineke kpọrọ Setan “onye na-achị ụwa a,” ọ na-akpọkwa ndị mmụọ ọjọọ “ndị na-achị ụwa nke ọchịchịrị a.” (Jọn 12:31; Ndị Efesọs 6:11, 12; 1 Jọn 5:19) N’ihi ikike ya, Ekwensu pụrụ ikwe Jizọs nkwa inye ya “alaeze nile nke ụwa na ebube ha” ma ọ bụrụ na ọ ga-akpọ isiala nye ya. (Matiu 4:8, 9) Mgbe ahụ, a bịa n’ihe banyere ụwa, o doro anya na mgbe Alaeze Chineke ‘ga-abịa’ ọ ga-eweta oké mgbanwe.

N’ụwa ebe a, ‘ọbịbịa’ nke Alaeze Chineke ga-arụpụta usoro ihe ọhụrụ dị nnọọ iche. Alaeze ahụ ga-egwepịa ọchịchị nile nke mmadụ ma bụrụ nanị ọchịchị a ga-enwe n’ụwa. N’otu oge ahụ, ụmụ mmadụ ndị na-atụ egwu Chineke bụ́ ndị ọ na-achị ga-abụ “ụwa ọhụrụ.” (2 Pita 3:13; Daniel 2:44) Alaeze ahụ ga-ewepụkwa mmehie n’ahụ́ ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ma ka oge na-aga mee ka ụwa nile bụrụ paradaịs, si otú a wepụ akụkụ nile nke ịchịisi Setan.—Ndị Rom 8:20, 21; Mkpughe 19:17-21.

Ná ngwụsị nke Narị Afọ Iri ahụ, mgbe Alaeze Mezaịa ahụ rụzuworo uche Chineke maka ya, “Ọkpara ahụ n’onwe ya ga-edokwa onwe ya n’okpuru Onye ahụ nke doro ihe nile n’okpuru ya, ka Chineke wee bụrụ ihe nile n’ebe onye ọ bụla nọ.” (1 Ndị Kọrint 15:28) Mgbe ahụ a ga-enwe ule ikpeazụ, mgbe nke ahụ gasịrị, a ga-ebibi Setan, ndị mmụọ ọjọọ ya, na ụmụ mmadụ na-enupụ isi bụ́ ndị e duhiere, kpam kpam ‘n’ọnwụ nke abụọ.’ (Mkpughe 20:7-15) E mesịa, ihe nile e kere eke nwere ọgụgụ isi nọ n’eluigwe na n’ụwa ga-anọgide na-eji ọṅụ edo onwe ha n’okpuru ọbụbụeze ịhụnanya nke Jehova ruo mgbe ebighị ebi. N’ụzọ nile, nke ahụ ga-abụ mmezu zuru ezu nke okwu ndị ahụ dị n’ekpere nlereanya Jizọs.—1 Jọn 4:8.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a The Bible—An American Translation, si otú a sụgharịa akụkụ a nke ekpere nlereanya Jizọs, “Ka alaeze gị bịa! Ka e mee uche gị n’ụwa, meekwa ya n’eluigwe!”—Matiu 6:10.

b Pita onyeozi ji ọnọdụ mmapụ iwu ime mmụọ a tụnyere ịnọ “n’ụlọ mkpọrọ.” Otú ọ dị, ọ dịghị ekwu banyere “abis” a ga-enwe n’ọdịnihu bụ́ ebe a ga-atụba ndị mmụọ ọjọọ ruo otu puku afọ.—1 Pita 3:19, 20; Luk 8:30, 31; Mkpughe 20:1-3.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya