Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w04 2/15 p. 31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Osisi Olive Nwere Akwụkwọ Ndụ n’Ụlọ Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Oké Iju Mmiri Ahụ
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Jenesis—Akụkụ nke Mbụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
w04 2/15 p. 31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, Noa si n’ụgbọ ahụ zipụ nduru nke kpụ “akwụkwọ osisi oliv” n’ọnụ lọghachi. Ebee ka nduru ahụ chọtara akwụkwọ osisi ahụ?

Bible na-agwa anyị na “mmiri ahụ dị ike nke ukwuu nke ukwuu n’elu ụwa; e wee kpuchie ugwu nile dị elu nke dị n’okpuru eluigwe nile.” (Jenesis 7:19) Ka mmiri ahụ na-atalata, Noa zipụrụ nduru ugboro atọ—otu ugboro kwa izu. Na nke abụọ, nduru ahụ kpụ ‘akwụkwọ osisi oliv a kụbitere ọhụrụ n’ọnụ ya’ lọghachi, “Noa wee mara na mmiri esiwo n’elu ụwa tawa.”—Jenesis 8:8-11.

N’ezie, ọ dịghị otú a pụrụ isi mata ugbu a ogologo oge iju mmiri ahụ kpuchiruru otu akụkụ ụwa, n’ihi na o doro anya na Iju Mmiri ahụ gbanwere ọdịdị ala. Ka o sina dị, o yiri ka mmiri ò kpuchiri ebe ka ukwuu ruo ogologo oge nke mere ka ọtụtụ osisi nwụọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe àmà na-egosi na ụfọdụ anwụghị, nke mere ka ha pupụta akwụkwọ ọhụrụ mgbe mmiri ahụ talatara.

Banyere osisi oliv, The New Bible Dictionary na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na e gbutuo ya, osisi ahụ na-epuliteghachi site n’úkwù ya, nke na a pụrụ inwe úkwù osisi ise si na ya pulite. Osisi oliv na-achọ ịnwụ anwụ na-epuliteghachikarịkwa n’otu ụzọ a. Ọ dị “ka a ga-asị na a naghị ebibi ike ya ebibi,” ka akwụkwọ bụ́ The New Schaff-Herzog Encyclopedia of Religious Knowledge na-ekwu. Ọ dịghị onye dị ndụ taa maara ihe nile merenụ, dị ka otú nnu dịruru na mmiri iju mmiri ahụ na ọ̀tụ̀tụ̀ ịjụ oyi ya. N’ihi ya, anyị apụghị ijide n’aka mmetụta ha pụworo inwe n’ahụ́ osisi oliv na ihe ọkụkụ ndị ọzọ.

Otú ọ dị, oliv ọhịa, dị ka ndị na-adịkarị n’elu ugwu ndị ka elu, apụghị ịnagide oyi. Ọ na-epukarị n’ebe ndị dị ala karịa 1,000 mita, bụ́ ebe ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ ya na-akarị 10 degrees Celsius. “N’ihi ya,” ka akwụkwọ bụ́ The Flood Reconsidered na-ekwu, “site n’akwụkwọ osisi ahụ a kụbitere ọhụrụ, Noa pụrụ ikwubi na mmiri amalitewo ịtalata na ndagwurugwu ndị dị omimi karị.” Mgbe Noa zipụrụ nduru ahụ ka otu izu gasịrị, ọ lọghachighị, nke na-egosi na e nweela ụbara ahịhịa ndụ na ebe pụrụ ịbụrụ nduru ahụ ebe izu ike.—Jenesis 8:12.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya