Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w04 6/15 p. 3
  • Ihe Ịma Aka nke Ịzụ Ụmụ Taa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ịma Aka nke Ịzụ Ụmụ Taa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Zụlite Nwa Gị Site na Nwa Ọhụrụ
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Otú Ị Ga-esi Chebe Ụmụ Gị
    Teta!—2007
  • Mkpịsị Ugodi nke Mmụta Dị Mma
    Teta!—1996
  • Nyere Nwa Gị Aka Idi Ọnwụ Onye Ọ Hụrụ n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
w04 6/15 p. 3

Ihe Ịma Aka nke Ịzụ Ụmụ Taa

N’UHURUCHI, otu onye nwe ụlọ nri na-akwado imechi ụlọ nri ya ma laa. Mgbe ahụ, ụmụ nwanyị abụọ na otu nwatakịrị abata ma gwa ya ka o resị ha nri. N’ịbụ nnọọ onye ike gwụrụ, onye ahụ nwe ụlọ nri achọọ ịgwa ha na ya emechiela ụlọ nri ya, ma ya ekpebie iresị ha nri. Ka ụmụ nwanyị abụọ ahụ na-akparịta ụka ma na-eri nri, nwatakịrị ahụ ana-agbagharị n’ụlọ nri ahụ, na-atụsasị biskit n’ala ma were ụkwụ na-azọpịasị ha. Kama ịkwụsị ya, nne ya amụmụọ ọnụ ọchị. Mgbe ndị ahụ zụrụ nri mesịrị laa, onye ahụ nwe ụlọ nri bụ́ onye ike gwụrụ aghaghị ịzachasị unyí ahụ.

Dị ka ị maara ma eleghị anya, ihe a na-eme eme n’ezie na-egosi na n’ọtụtụ ezinụlọ, a dịghị enye ụmụaka ọzụzụ otú o kwesịrị. Ihe ndị na-akpata ya dịgasị iche. Ụfọdụ ndị nne na nna na-ahapụ nnọọ ụmụ ha ka ha na-eme ihe masịrị ha, na-eche na e kwesịrị ikwe ka ụmụaka nwere onwe ha. Ma ọ bụ, n’ihi ịbụ ndị ji nnọọ ọrụ n’aka, ọ pụrụ ịbụ na ndị nne na nna adịghị ewepụta oge iji lebara ụmụ ha anya nke ọma ma nye ha ọzụzụ dị ha mkpa. Ụfọdụ ndị nne na nna na-eche na agụmakwụkwọ nwa ha bụ ihe kasị mkpa, n’ihi ya ha na-enye nwa ahụ nnwere onwe a na-akparaghị ókè ma ọ bụrụhaala na ọ na-enwe akara mmụta dị mma n’ụlọ akwụkwọ ma banye na kọleji a ma ama.

Ma, ụfọdụ na-ekwu na ọ dị mkpa ka e mezigharịa ụkpụrụ nke ndị nne na nna na nke ọha na eze n’ozuzu. Ha na-ekwu na ụmụaka na-etinyezi aka n’ụdị mpụ nile nakwa na ime ihe ike n’ụlọ akwụkwọ na-arị elu kwa ụbọchị. N’ihi ya, otu onyeisi ụlọ akwụkwọ sekọndrị na Seoul, Republic of Korea mesiri ike na e kwesịrị ibute ịzụlite àgwà dị mma n’ime ụmụaka ụzọ. O kwuru, sị: “Ịzụlite àgwà dị mma kwesịrị ibutere inweta ihe ọmụma ụzọ.”

Ọtụtụ ndị nne na nna bụ́ ndị chọrọ ka nwa ha banye kọleji ma nwee ihe ịga nke ọma ná ndụ na-eleghara ịdọ aka ná ntị anya. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ụdị mmadụ dị aṅaa ka ị ga-achọ ka nwa gị bụrụ? Ọ̀ bụ onye toruru ogo mmadụ nke nwere omume ọma na nke ji ibu ọrụ ya akpọrọ ihe? Onye na-echebara ndị ọzọ echiche, onye pụrụ ime mgbanwe, na onye na-enwe nchekwube? Ọ bụrụ otú ahụ, biko tụlee isiokwu na-esonụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya