Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w04 10/1 p. 3-4
  • Ihe Nketa Ị Pụrụ Ịtụkwasị Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Nketa Ị Pụrụ Ịtụkwasị Obi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ndị Dị Umeala n’Obi Ga-eketa Ụwa”—N’ụzọ Dị Aṅaa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Chebe Ihe Nketa Dị Oké Ọnụ Ahịa I Nwere
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2021
  • Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Joshụa
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Ihe Nketa Anyị Dị Oké Ọnụ Ahịa—Gịnị Ka Ọ Pụtara Nye Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
w04 10/1 p. 3-4

Ihe Nketa Ị Pụrụ Ịtụkwasị Obi

“Ọ BỤRỤ na ị nata ozi site n’aka ‘otu onye’ nke na-ekwu na e nwere ihe nketa e debeere gị, lezie anya. Ọ pụrụ ịbụ na a na-achọ igwu gị wayo.”

Nke ahụ bụ ịdọ aka ná ntị nke Ụlọ Ọrụ United States Na-enyocha Nzipụ Akwụkwọ Ozi tinyere n’ebe ha na-edebe ihe ọmụma n’Intanet. N’ihi gịnị? N’ihi na ọtụtụ puku mmadụ nwetara ozi nke na-ekwu, sị, ‘Otu onye ikwu gị anwụwo ma hapụrụ gị ihe nketa.’ N’ihi ya, ọtụtụ ndị zigara $30 ma ọ bụ karịa iji nweta ‘akwụkwọ nkọwa ala na ụlọ’ bụ́ nke ha chere ga-akọwa ebe ihe nketa ahụ dị na otú a pụrụ isi nweta ya. N’ụzọ dị mwute, ha ahụghị ihe ha tụrụ anya ya. Ndị nile e zigaara akwụkwọ ozi nwetara otu akwụkwọ nkọwa ahụ—o yighịkwa ka ọ̀ dị onye n’ime ha ga-eketa ihe ọ bụla.

Atụmatụ ndị dị otú ahụ na-elekwasịkarị anya n’ọchịchọ ebumpụta ụwa ndị mmadụ nwere inweta ihe nketa. Ma, Bible na-ekwu okwu ọma banyere ndị na-enye ndị ọzọ ihe nketa mgbe o kwuru, sị: “Ezi mmadụ na-eme ka ụmụ ụmụ ya keta ihe ya.” (Ilu 13:22) N’ezie, ọ bụ Jizọs Kraịst n’onwe ya kwuru okwu a a maara nke ọma na nke ọtụtụ ndị nwere mmasị na ya n’Ozizi Elu Ugwu ya: “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi, ebe ọ bụ na ha ga-eketa ụwa.”—Matiu 5:5.

Okwu Jizọs na-echetara anyị ihe e nyere Eze Devid nke Izrel oge ochie ike mmụọ nsọ ide ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ: “Ndị dị umeala n’obi ga-eketa ụwa; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”—Abụ Ọma 37:11, King James Version.

‘Iketa ụwa’—Lee atụmanya na-akpali akpali nke ahụ bụ! Ma ànyị pụrụ ijide n’aka na nke a abụghị atụmatụ wayo ọzọ e mere iji napụ ndị mmadụ ihe? Ee, anyị pụrụ. Ebe ọ bụ na ụwa so n’ihe okike dị ebube nke Jehova, dị ka Onye Mere ya na Onye Nwe ya, o nwere ikike inye ya onye ọ chọrọ dị ka ihe nketa. Site n’ọnụ Eze Devid, Jehova kwere Ọkpara Ya Ọ hụrụ n’anya, bụ́ Jizọs Kraịst, nkwa amụma a: “Rịọ m, na aga m enye gị mba nile ka ha bụrụ ihe nketa gị, na nsọtụ ụwa ka ha bụrụ ihe onwunwe gị.” (Abụ Ọma 2:8) N’ihi nke a, Pọl onyeozi kọwara Jizọs dị ka onye Chineke “họpụtara ịbụ onye nketa nke ihe nile.” (Ndị Hibru 1:2) Ya mere, anyị pụrụ inwe obi ike zuru ezu na mgbe Jizọs kwuru na ndị dị umeala n’obi “ga-eketa ala,” o ji obi eziokwu kwuo ya, o nwekwara ikike kwesịrị ekwesị imezu nkwa ya.—Matiu 28:18.

Ajụjụ dị oké mkpa bụzi, Olee otú nkwa ahụ ga-esi mezuo? Ebe ọ bụla anyị lere anya taa, o yiri ka ihe ọ̀ na-agara ndị na-eme ihe ike na ndị nwere oké ọchịchọ nke ọma karị, ha ana-enwetakwa ihe ha chọrọ. Olee ihe ga-afọdụrụ ndị dị umeala n’obi iketa? Tụkwasị na nke ahụ, nsogbu ndị siri ike na mmetọ na-eti ụwa ihe otiti, ndị anyaukwu na ndị na-adịghị elepụ anya n’ihu na-ewekọrọkwa ihe ndị dị n’ime ya. À ga-emecha nwee ụwa nke dị mma nketa? Anyị na-agba gị ume ịgụ isiokwu na-esonụ iji chọta azịza nye ajụjụ ndị a na ndị ọzọ dị mkpa.

[Foto dị na peeji nke 3]

Ị̀ ga-enweta ihe nketa nke bụ́ ezie?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya