Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ọ̀ bụ na Pọl onyeozi emebighị okwukwe ya dị ka Onye Kraịst mgbe o kwuru n’ihu Sanhedrin, sị: “Abụ m onye Farisii”?
Iji ghọta okwu Pọl nke dị n’Ọrụ 23:6, ọ dị anyị mkpa ịtụle ihe ndị gbara ya gburugburu.
Mgbe ìgwè ndị Juu wakposịrị ya na Jeruselem, Pọl gwara ìgwè mmadụ ahụ okwu. O kwuru na ya “gụrụ akwụkwọ na [Jeruselem] n’ụkwụ Gameliel, bụrụ onye a kụziiri ihe dị ka ụkpụrụ siri ike nke Iwu nke ndị nna ochie anyị hà si dị.” Ọ bụ ezie na ìgwè mmadụ ahụ gere ya ntị ruo nwa oge, mgbe oké iwe jidere ha, ọchịagha dutere Pọl dugara ya n’ogige ndị agha. Mgbe a chọrọ ịpịa ya ihe, Pọl kwuru, sị: “Iwu ọ̀ kwadoro ka unu pịa onye Rom nke a na-amaghịkwa ikpe ihe?”—Ọrụ 21:27–22:29.
N’echi ya, ọchịagha ahụ kpọpụtara Pọl n’ihu ụlọikpe ukwu ndị Juu, bụ́ Sanhedrin. Pọl legidere ha anya ma hụ na ihe mejupụtara Sanhedrin ahụ bụ ndị Sadusii na ndị Farisii. Mgbe ahụ, o kwuru, sị: “Ụmụnna m, abụ m onye Farisii, nwa onye Farisii. Ọ bụ n’ihi olileanya mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ ka a na-ekpe m ikpe.” N’ihi ya, esemokwu bilitere n’etiti ndị Farisii na ndị Sadusii, “n’ihi na ndị Sadusii na-ekwu na e nweghị mbilite n’ọnwụ ma ọ bụ ndị mmụọ ozi ma ọ bụ mmụọ, ma ndị Farisii na-akpọsa ha nile n’ihu ọha.” Ụfọdụ ndị so n’òtù ndị Farisii ji olu ike gbachitere ya, na-asị: “Anyị ahụghị ihe ọjọọ ọ bụla n’ebe nwoke a nọ.”—Ọrụ 23:6-10.
Ebe a maara ya dị ka Onye Kraịst na-anụ ọkụ n’obi nke ukwuu, Pọl apụghị ime ka ndị Sanhedrin kweta na ya bụ onye Farisii. Ndị Farisii nọ n’ebe ahụ agaraghị ekweta na onye na-anabataghị ozizi ha nile bụ onye òtù ha. Ya mere, okwu Pọl banyere ịbụ onye Farisii aghaghị ịbụ n’echiche a kpaara ókè, ọ ghaghịkwa ịbụ na ndị Farisii nọ ebe ahụ si otú ahụ ghọta okwu Pọl.
N’ikwu na a na-ekpe ya ikpe n’ihi olileanya mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, Pọl na-ekwu n’ụzọ doro anya na n’akụkụ a, ya dị ka ndị Farisii. N’esemokwu ọ bụla metụtara nke a, a ga-agụnyekọta Pọl na ndị Farisii kama ịgụnyekọta ya na ndị Sadusii, bụ́ ndị na-ekweghị ná mbilite n’ọnwụ.
Ihe Pọl kweere dị ka Onye Kraịst adịghị emegide nkwenkwe nke ndị Farisii n’okwu ndị dị ka mbilite n’ọnwụ, ndị mmụọ ozi, na n’ihe ụfọdụ ndị dị n’Iwu ahụ. (Ndị Filipaị 3:5) Ya mere, n’akụkụ ndị a, a pụrụ ịsị na Pọl na ndị Farisii kweere otu ihe, ọ bụkwa otú a ka ndị Sanhedrin si ghọta okwu ya. N’ụzọ dị otú a, o ji nzụlite ya zọrọ onwe ya n’ihu ụlọikpe ahụ kasị elu nke ndị Juu bụ́ ndị kpọrọ ya asị.
Otú ọ dị, ihe àmà kasị gosi na Pọl emebighị okwukwe ya bụ na ọ nọgidere na-enwe ihu ọma Jehova. N’abalị ụbọchị ahụ Pọl kwuru okwu ahụ, Jizọs gwara ya, sị: “Nwee obi ike dị ukwuu! N’ihi na dị ka ị nọworo na-agba àmà nke ọma n’ihe ndị metụtara m na Jeruselem, otú ahụkwa ka ị na-aghaghị ịgba àmà na Rom.” Ebe ọ bụ na Pọl nwere ihu ọma Chineke, anyị aghaghị ikwubi na Pọl emebighị okwukwe ya dị ka Onye Kraịst.—Ọrụ 23:11.