Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w05 6/1 p. 3-4
  • N’ihi Gịnị Ka Ụwa Ji Ghara Ịdị n’Otu?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • N’ihi Gịnị Ka Ụwa Ji Ghara Ịdị n’Otu?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịdị n’Otu Ụwa Ka Ọ̀ Bụ Nkewasị nke Ụwa Nile?
  • Olee Ebe Ụwa Na-eche Ihu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • E Ji Ịdị n’Otu Mara Ndị Na-efe Chineke Ezi Ofufe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ezinụlọ Jehova Nwere Ịdị N’otu Dị Oké Ọnụ Ahịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ụwa Ọ̀ Ga-adị n’Otu?
    Teta!—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
w05 6/1 p. 3-4

N’ihi Gịnị Ka Ụwa Ji Ghara Ịdị n’Otu?

“Nke a bụ nke mbụ mba nile ga-adị n’otu kemgbe a lụsịrị Agha Ụwa nke Abụọ. . . . Ya mere, ụwa pụrụ iji ohere a mezuo nkwa nke ndokwa ụwa ọhụrụ ahụ a nọworo na-atụ anya ya eri ogologo oge.”

NKE A bụ ihe otu president United States kwuru n’afọ iri ikpeazụ nke narị afọ nke 20. N’oge ahụ, ihe ndị na-eme gburugburu ụwa yiri ka hà na-egosi na ịdị n’otu ụwa dị nso. A kwaturu ọchịchị aka ike dị iche iche. Mgbidi Berlin dara, na-egosi mmalite nke ọgbọ ọhụrụ na Europe. Ụwa kporopụrụ anya ka Soviet Union, bụ́ nke ọtụtụ ndị bi n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa na-ele anya dị ka ihe na-akpata ọgba aghara gburugburu ụwa, pụrụ n’anya. Agha Nzuzo biri, e kwusiwekwara okwu ike banyere ịchịsa ngwá agha, gụnyere ịchịsa ngwá agha nuklia. Ọ bụ ezie na agha malitere n’Ọwara Oké Osimiri Peasia, ma nke ahụ yiri ka ọ̀ bụ ihe na-agaghị adịte aka, meekwa ka ụwa kpebisikwuo ike ịchụso udo.

A pụrụ ịhụ ihe ndị na-egosi na udo ga-adị ọ bụghị nanị na ndọrọ ndọrọ ọchịchị kamakwa n’akụkụ ndị ọzọ nke ndụ. Ọnọdụ obibi ndụ nọ na-akawanye mma n’ọtụtụ akụkụ ụwa. Ọganihu ndị e nwere na nkà mmụta ahụ́ ike mere ka o kwe ndị dọkịta omume ime ihe ndị a pụrụ ilewo anya dị ka ọrụ ebube nanị iri afọ ole na ole tupu mgbe ahụ. Ego ọtụtụ mba na-akpata rịrị elu n’ọ̀tụ̀tụ̀ yiri ka ọ̀ ga-eduga n’ọganihu zuru ụwa ọnụ. O yiri ka ihe ọ̀ dịwala mma.

Taa, afọ ole na ole ka nke ahụ gasịrị, anyị aghaghị ịjụ, sị: ‘Gịnị meziri? Olee ebe ịdị n’otu ụwa e kwere ná nkwa dị?’ Kama ụwa ịdị n’otu, o yiri ka ọ̀ na-ekewa nnọọ ekewa. Iji bọmbụ egbu onwe onye na ndị ọzọ, mwakpo ndị na-eyi ọha egwu na-eme, mmụba e kwuru na ngwá agha ọgwụrụ mba na-amụba, na ihe ndị ọzọ bụ́ ndị na-akpata obi erughị ala apụtachiwela anya n’akwụkwọ akụkọ. Ihe ndị dị otú ahụ yiri ka hà na-eme ka inweta ịdị n’otu ụwa na-esiwanye ike. Otu oji ego achụ ego a ma ama kwuru n’oge na-adịchabeghị anya, sị: “Anyị tọrọ atọ n’ọnọdụ ebe otu ime ihe ike na-eduga na nke ka ya njọ.”

Ịdị n’Otu Ụwa Ka Ọ̀ Bụ Nkewasị nke Ụwa Nile?

Mgbe e hiwere òtù Mba Ndị Dị n’Otu, otu n’ime nzube e ji hiwe ya bụ ime “ka e nwee mmekọrịta enyi na enyi n’etiti mba dị iche iche site n’ịgbaso ụkpụrụ nke mba nile ịha nhata na ịchị onwe ha.” Ka ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 60 gasịrị, è nwetawo ebumnobi ọma ahụ? Ọ dịghị ma ọlị! Kama ịchọ inwe “mmekọrịta enyi na enyi,” o yiri ka ihe ka dịrị n’obi mba dị iche iche ọ̀ bụ “ịchị onwe ha.” Ndị mmadụ na agbụrụ dị iche iche ịgbalị ịkwụụrụ onwe ha na ịchị onwe ha emewo ka ụwa na-ekewasịkwu ekewasị. Mgbe e hiwere òtù Mba Ndị Dị n’Otu, mba ndị mejupụtara ya dị 51. Taa, ha dị 191.

Dị ka anyị hụworo, ka a na-eru ná ngwụsị nke narị afọ nke 20, olileanya nke ụwa ịdị n’otu jupụtara ebe nile. Kemgbe ahụ, olileanya ahụ akụwo afọ n’ala ka ihe a kpọrọ mmadụ na-ahụ ka ụwa na-ekewasịkwu kwa ụbọchị. Nkewa e ji ime ihe ike kewaa Yugoslavia, agha ndị Chechnya na Russia, agha Iraq, na oké mgbupịa nke ka na-aga n’ihu n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa—ihe a nile bụ ihe àmà na-egosi na ụwa na-ekewasịkwu ekewasị.

Obi abụọ adịghị ya na e bu ezi ihe n’obi mee ọtụtụ mgbalị ndị e mere iji nweta udo. N’agbanyeghị nke a, ịdị n’otu ụwa yiri ihe aka na-agaghị eru. Ọtụtụ ndị na-eche, sị: ‘Gịnị mere ịdị n’otu ụwa ji ka na-esi ike nnweta? Olee ebe ụwa na-eche ihu?’

[Ebe e sigasị nweta foto dị na peeji nke 3]

Foto AP/Lionel Cironneau

Arlo K. Abrahamson/AFP/ Getty Images

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya