Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w05 6/15 p. 3-4
  • Nsogbu Ọrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nsogbu Ọrụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịrụsi Ọrụ Ike na Ịrụgbu Onwe Onye n’Ọrụ
  • Ihe Ndị Na-eme Ka Ebe Ọrụ Dị Ize Ndụ
    Teta!—2002
  • Ọrụ—Ọ̀ Bụ Ngọzi Ka Ọ̀ Bụ Ọbụbụ Ọnụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ime Ka Ebe Ọrụ Gị Dị Nchebe
    Teta!—2002
  • Na-ahụ Ihe Ọma n’Ihi Ịrụsi Ọrụ Ike Gị
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
w05 6/15 p. 3-4

Nsogbu Ọrụ

“Ịga ọrụ—ịrụ ọrụ! Ọ bụ ihe na-enye nnọọ obi ụtọ ịma na anyị ka nwere ihe ndị kasị mma ime.”—Katherine Mansfield, onye edemede (1888-1923).

Ì NWERE ụdị echiche ahụ magburu onwe ya e kwuru banyere ya n’elu? Olee otú i si ele ọrụ anya? Ọ̀ pụrụ ịbụ na ị na-eche na ọrụ bụ ihe na-agwụ ike e ji echere ngwụsị izu bụ́ mgbe mmadụ na-ezuru ike? Ka ọrụ gị ò riela gị ahụ́?

Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-eji akụkụ ka ukwuu nke ụbọchị arụ ọrụ. Ọrụ pụrụ ikpebi ebe anyị ga-ebi na ụdị ndụ anyị ga-ebi. Malite n’oge okorobịa ha ruo mgbe ha lara ezumike nká, ọtụtụ na-achọpụta na ọrụ bụ ihe kasị achịkwa ndụ ha. Ụfọdụ n’ime anyị na-enweta ezi afọ ojuju n’ọrụ anyị. Ndị ọzọ na-eji ego ma ọ bụ ùgwù ha na-enweta atụ ọrụ ha n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, ebe ndị ọzọ na-ewere ọrụ dị ka nanị ihe e ji echere oge ma ọ bụ ọbụna dị ka ihe na-egbu oge.

E nwere ndị na-arụ ọrụ iji nweta ihe e ji ebi ndụ, e nwekwara ndị na-adịghị ihe ọzọ ha ji ndụ ha eme ma ọ́ bụghị ịrụ ọrụ; ndị ọzọ na-anwụ n’ọrụ ha ma ọ bụ n’ihi ọrụ ha. Dị ka ihe atụ, otu akụkọ Mba Ndị Dị n’Otu wepụtara na nso nso a na-ekwu na ọrụ na-akpata ihe mgbu na ọnwụ “karịa ka agha na ịṅụ ọgwụ ọjọọ na ịṅụ oké mmanya na-ejikọ aka akpata.” N’ikwu banyere nke a, akwụkwọ akụkọ London bụ́ The Guardian kwuru, sị: “Ihe karịrị nde mmadụ abụọ na-anwụ kwa afọ n’ihi ihe mberede ma ọ bụ ọrịa ndị ọrụ na-akpata . . . Ịnọ ebe e nwere uzuzu, kemikal, ụ̀zụ̀ na ụzarị ọkụ na-akpata ọrịa cancer, ọrịa obi na ọrịa strok.” Iji ụmụaka akpa ego na ọrụ mmanye bụ nnọọ ihe ọjọọ abụọ ọzọ a na-ahụ n’ebe ọrụ taa.

E nwekwara ihe ọkà n’akparamàgwà mmadụ bụ́ Steven Berglas kpọrọ “oké ike ọgwụgwụ.” O ji ya kọwaa onye dị uchu n’ọrụ nke rurula n’ọkwá kasị elu n’ụlọ ọrụ ya ma “na-atụ oké egwu, na-enwe nchekasị, daa mbà n’obi n’ihi na o kweere na ya tọrọ atọ n’ọrụ nke ya na-apụghị ịhapụ na nke na-apụghịkwanụ inye ya afọ ojuju.”

Ịrụsi Ọrụ Ike na Ịrụgbu Onwe Onye n’Ọrụ

N’ụwa ebe ọtụtụ ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ ruo ọtụtụ awa, ọ dị mkpa ịmata ọdịiche dị n’etiti ndị na-arụsi ọrụ ike na ndị na-arụgbu onwe ha n’ọrụ. Ọtụtụ ndị na-arụgbu onwe ha n’ọrụ na-ewere ụlọ ọrụ dị ka ebe nchebe pụọ n’ụwa nke jupụtara n’ihe ize ndụ na nke a na-ejighị n’aka; ndị na-arụsi ọrụ ike na-ewere ịrụ ọrụ dị ka ihe dị mkpa na mgbe ụfọdụ dị ka ọrụ dịịrị ha. Ndị na-arụgbu onwe ha n’ọrụ na-ekwe ka ọrụ butere ihe ndị ọzọ nile a na-eme ná ndụ ụzọ; ndị na-arụsi ọrụ ike na-ama mgbe ha kwesịrị ịhapụ ọrụ ma malite iche banyere ihe ndị ọzọ, dị ka ihe atụ, ha na-echeta ịnọ ya mgbe ha na-eme ememe ncheta agbamakwụkwọ ha. Ọ na-atọ ndị na-arụgbu onwe ha n’ọrụ ụtọ ịrụbiga ọrụ ókè, ọ na-akpalikwa ha akpali; ọ naghị adị ndị na-arụsi ọrụ ike otú ahụ.

Ọha mmadụ nke oge a adịghị ekwe ka a hụ ọdịiche dị n’etiti ha abụọ n’ihi na ha na-eme ka ịrụbiga ọrụ ókè yie ihe na-adọrọ mmasị. Modem kọmputa, ekwe ntị na ígwè ozi pager pụrụ ime ka a ghara ịhụ ọdịiche dị n’etiti ebe ọrụ na ebe obibi. Ọ bụrụ na ebe ọ bụla pụrụ ịbụ ebe ọrụ, oge ọ bụla abụrụkwa oge ọrụ, ụfọdụ ga na-arụgbu onwe ha n’ọrụ.

Olee ihe ụfọdụ ndị na-eme maka àgwà dị otú ahụ na-adịghị mma? Ndị ọkà ná mmụta mmekọrịta ọha na eze ahụla na ndị na-arụbiga ọrụ ókè na ndị nchegbu banyere ọrụ rikpuru na-ewebatazi ihe ime mmụọ n’ebe ọrụ ha ma na-ejikọta okpukpe na ọrụ ha. Akwụkwọ bụ́ San Francisco Examiner kọrọ na “ọha na eze amarala banyere njikọta a na-ejikọta ihe ime mmụọ na ọrụ.”

Otu onye nta akụkọ kwuru banyere Silicon Valley, bụ́ ebe bụ́ isi a na-emepụta kọmputa na ngwá electronic ndị ọzọ na United States, sị: “Ka ndị isi ọrụ na-achọpụta na ebe ndọba ụgbọala ndị e nwere n’ebe ọrụ na-atọgbọrọ chakoo n’ihi ụkọ ndị ọrụ, a na-achọ ebe a ga-adọba ụgbọala achọ n’ebe ndị a na-amụ Bible n’oge mgbede.” Ihe ọ sọrọ nke ahụ ya pụta, ọtụtụ mmadụ n’ụwa nile achọpụtala na Bible nwere mmetụta dị mma n’otú ha si ele ọrụ anya, na-eme ka ha na-elekwu ndụ anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị.

Olee otú Bible pụrụ isi nyere anyị aka ile ọrụ anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị? È nwere ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị pụrụ inyere anyị aka ịnagide ihe ịma aka ndị a na-enweta n’ebe ọrụ nke oge a n’ụzọ gara nke ọma? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya