Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w06 4/15 p. 31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mere I Ji Kwesị Izere Mgbaasị
    Teta!—2000
  • Guzogide Ndị Ajọ Mmụọ
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Ndị Mmụọ E Kere Eke—Otú Ha Si Emetụta Anyị
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ndị Mmụọ Ọjọọ—Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Guzogide Ha?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
w06 4/15 p. 31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ọ bụrụ na ndị mmụọ ọjọọ na-enye mmadụ nsogbu, gịnị ka ọ pụrụ ime iji nwere onwe ya?

Okwu Chineke na-egosi na ndị ndị mmụọ ọjọọ na-enye nsogbu pụrụ inwere onwe ha pụọ ná nsogbu ahụ. Ekpere dị oké mkpa maka nnwere onwe dị otú ahụ. (Mak 9:25-29) Ma ọ pụrụ ịdị onye ndị mmụọ ọjọọ na-enye nsogbu mkpa ime ihe ndị ọzọ. Ihe Ndị Kraịst narị afọ mbụ mere gosiri ihe ọzọ nwere ike ịdị mkpa ka mmadụ mee.

Ụfọdụ ndị nọ n’Efesọs oge ochie mere mgbaasị tupu ha aghọọ ụmụazụ Kraịst. Otú ọ dị, mgbe ha kpebiri ijere Chineke ozi, “ndị na-eme majik chịkọtara akwụkwọ ha ma kpọọ ha ọkụ n’ihu mmadụ nile.” (Ọrụ 19:19) Site n’ibibi akwụkwọ ndị ha ji ajụ ndị mmụọ ase, ndị ọhụrụ ahụ kwere ekwe n’Efesọs setịpụrụ ihe nlereanya maka onye ọ bụla chọrọ ime ka ndị mmụọ ọjọọ kwụsị inye ya nsogbu taa. Ọ bụ nnọọ ihe kwesịrị ekwesị nye onye dị otú ahụ imebi ihe nile gbasara mgbaasị. Nke a gụnyere akwụkwọ, magazin, fim, ozi ndị a na-enweta site n’Intanet, egwu ndị a na-ekwu ihe banyere mgbaasị na ha, nakwa ọgwụ ma ọ bụ ihe ndị a na-agba ma ọ bụ nyara maka “nchebe” ma ọ bụ ndị nwere ihe jikọtara ha na mgbaasị.—Deuterọnọmi 7:25, 26; 1 Ndị Kọrint 10:21.

Afọ ole na ole ka Ndị Kraịst ahụ nọ n’Efesọs bibisịrị akwụkwọ ndị ha ji eme majik, Pọl onyeozi dere, sị: “Anyị nwere mgba, . . . megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ.” (Ndị Efesọs 6:12) Pọl gbara Ndị Kraịst ume, sị: “Yikwasịnụ ekike agha zuru ezu nke sitere na Chineke ka unu wee nwee ike iguzosi ike megide nzupụta ọjọọ dị iche iche nke Ekwensu.” (Ndị Efesọs 6:11) Ndụmọdụ ahụ ka dị mkpa. Ndị Kraịst aghaghị iwusi onwe ha ike n’ụzọ ime mmụọ iji mee ka ndị mmụọ ọjọọ ghara inye ha nsogbu. Pọl kwusiri ike, sị: “Karịsịa ihe nile, burunụ ọta ukwu bụ́ okwukwe, bụ́ nke unu ga-eji nwee ike imenyụ akụ́ ụta nile na-ere ọkụ nke ajọ onye ahụ.” (Ndị Efesọs 6:16) Mmadụ na-ewusi okwukwe ya ike site n’ọmụmụ Bible. (Ndị Rom 10:17; Ndị Kọlọsi 2:6, 7) N’ihi ya, ịmụchi Bible anya na-enyere anyị aka ịzụlite okwukwe nke na-echebe anyị ka ndị mmụọ ọjọọ ghara inye anyị nsogbu.—Abụ Ọma 91:4; 1 Jọn 5:5.

Ọ dịkwa ihe ọzọ ọ dị Ndị Kraịst ahụ nọ n’Efesọs mkpa ime. Pọl gwara ha, sị: “Unu [jiri] ụdị ọ bụla nke ikpe ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na-anọgide n’ekpere n’oge nile n’ime mmụọ nsọ.” (Ndị Efesọs 6:18) Ee, ọ dị nnọọ ndị chọrọ ka ndị mmụọ ọjọọ kwụsị inye ha nsogbu mkpa ikpesi ekpere ike maka nchebe Jehova. (Ilu 18:10; Matiu 6:13; 1 Jọn 5:18, 19) Bible na-ekwu n’ụzọ dabara adaba, sị: “Ya mere, doonụ onwe unu n’okpuru Chineke; ma na-eguzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.”—Jems 4:7.

Ọ bụ ezie na onye ahụ ndị mmụọ ọjọọ na-enye nsogbu kwesịrị ikpesi ekpere ike iji nwere onwe ya, ezi Ndị Kraịst ndị ọzọ pụkwara ikpere onye ahụ ji obi ya nile chọọ ijere Jehova ozi ma na-agbalịsi ike iguzogide ndị mmụọ ọjọọ ekpere. Ha pụrụ ịrịọ Chineke ka o nye onye ndị mmụọ ọjọọ na-enye nsogbu ike iji merie nsogbu ahụ. Ebe ọ bụ na Okwu Chineke kwuru na “arịrịọ nke onye ezi omume na-arịọsi ike, mgbe ọ nọ n’ọrụ, nwere ike dị ukwuu,” o doro anya na ekpere nke ndị ohu Chineke ga-abara ndị ndị mmụọ ọjọọ na-enye nsogbu, bụ́ ndị na-eme ike ha nile ‘iguzogide Ekwensu,’ uru.—Jems 5:16.

[Foto dị na peeji nke 31]

Ndị kwere ekwe nọ n’Efesọs bibiri akwụkwọ ndị ha ji eme majik

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya