Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w06 12/15 p. 30
  • Ì Chetara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ì Chetara?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ònye Bụ Onye ahụ Na-emegide Kraịst?
    Teta!—2001
  • Ònye Bụ Onye Na-emegide Kraịst?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Ònye Bụ Onye Na-emegide Kraịst?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • A Mata Onye ahụ Na-emegide Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
w06 12/15 p. 30

Ì Chetara?

Ọ̀ tọrọ gị ụtọ ịgụ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Ọ dị mma, lee ma ị̀ pụrụ ịza ajụjụ ndị na-esonụ:

• Gịnị pụrụ inyere ezi Onye Kraịst aka ma ọ bụrụ na onye ọ hụrụ n’anya akwụsị ijere Jehova ozi?

Wulite onwe gị na ndị òtù ezinụlọ gị ndị ọzọ ka nọ n’ọgbakọ elu. Mikpuo onwe gị n’ihe ndị metụtara ezi ofufe. Na-ewepụta onwe gị inyere ndị ọzọ aka. Ya adịla mgbe ị ga-akwụsị inwe olileanya na onye ahụ ị hụrụ n’anya nwere ike ịlọghachite. Atala onwe gị ụta. Kwanyere ndokwa Chineke mere maka ịdọ aka ná ntị ùgwù, kọọkwara ndị enyi gị otú ọ dị gị n’obi.—9/1, peeji nke 18-21.

• Olee ụzọ ihe abụọ Akwụkwọ Nsọ gwara anyị iji nyere anyị aka ịmata ‘ụbọchị ikpeazụ’?

Bible buru amụma banyere ihe ndị ga na-eme ná “ngwụsị nke usoro ihe a.” (Matiu 24:3, 7, 8; Luk 21:11) O kwukwara otú àgwà na ihe ụmụ mmadụ bi “n’ụbọchị ikpeazụ” na-eme ga-esi gbanwee. (2 Timoti 3:1-5) Ọ bụ ihe dị ịrịba ama na a ga-ekwusa ozi ọma nke alaeze ahụ n’oge a.—9/15, peeji nke 4-6.

• Gịnị ka ọgbakọ kwesịrị ime ma ọ bụrụ na Onye Kraịst na-akwọ ụgbọala enwee ihe mberede nke ndị mmadụ nwụrụ na ya?

Ndị okenye nyochara okwu ahụ pụrụ ikpebi na ikpe amaghị ọkwọ ụgbọala ahụ n’ihi na o nwechaghị ihe o nwere ike ime iji gbochie ọnwụ ahụ. Ma ọ bụrụ na ikpe ọbara mara onye ahụ, ya egosikwa nchegharị, a ga-eji Akwụkwọ Nsọ nye ya ịdọ aka ná ntị kwesịrị ekwesị, a ga-egbochikwa ya inwe ihe ùgwù n’ọgbakọ.—9/15, peeji nke 30.

• N’ihi gịnị ka ndụ ebighị ebi na-ejighị dabere n’ọganihu nke nkà mmụta sayensị?

Ndị ọkà mmụta sayensị agbalịala ịgbatịkwu ndụ ụmụ mmadụ, dị ka site n’ịmụba ugboro ole mkpụrụ ndụ na-emepụtaghachi onwe ha, ma ọ bụ iji mkpụrụ ndụ ha wepụtara n’akụkụ dị iche iche nke ahụ́ mmadụ mepụtara onye na-arịa ọrịa akụkụ ahụ́ ndị ọhụrụ ga-ekwekọ n’ahụ́ ya. Ma Bible na-egosi na ọ bụ nanị ihe mgbapụta Jizọs nyere ga-eme ka ụmụ mmadụ nweta ndụ ebighị ebi.—10/1, peeji nke 3-5.

• Ahụ́ ndị Juu na-asa iji mezuo iwu okpukpe ha ọ̀ bụ ebe e si nweta baptizim Ndị Kraịst?

Ọ bụghị ebe e si nweta ya. Ndị Juu sara ahụ́ iji mezuo iwu okpukpe ha, bụ́ nke baptizim Jọn na-achọghị n’aka mmadụ. Ịsa ahụ́ Iwu Mozis chọrọ pụtara na mmadụ ga-asa ahụ́ ugboro ugboro, ma a na-eme Onye Kraịst baptizim nanị otu ugboro.—10/15, peeji nke 12-13.

• Gịnị bụ Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi?

Ọ bụ ụlọ akwụkwọ na-ewe izu asatọ nke a na-eji akụziri ndị okenye ọgbakọ na ndị ohu na-eje ozi na-ejighị nwanyị bụ́ ndị e nwere ike ikenye ozi n’ebe e nwere nnukwu mkpa ihe. Ebe ndị a ga-ekenye ha ọrụ nwere ike ịbụ n’ọgbakọ ha si bịa, n’ebe ọzọ ná mba ha, ma ọ bụ ná mba ọzọ.—11/15, peeji nke 10-11.

• Gịnị ma ọ bụ ole ndị bụ onye na-emegide Kraịst nke a kpọtụrụ aha na 1 Jọn 2:18; 4:3?

N’ụzọ sara mbara, okwu ahụ bụ́ “onye na-emegide Kraịst” pụtara ndị nile na-emegide Kraịst ma ọ bụ ndị nile na-azọrọ na ha bụ Kraịst ma ọ bụ na ha na-anọchite anya ya. Okwu Jizọs na nke Jọn gosiri na ọ bụ ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst bụ́ ndị ji okpukpe eduhie ndị mmadụ na ndị na-anabataghị Alaeze Chineke mejupụtara onye ahụ na-emegide Kraịst.—12/1, peeji nke 4-6.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya