Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w07 2/15 p. 3
  • Kporie Ndụ N’ụwa Anyị Mara Mma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kporie Ndụ N’ụwa Anyị Mara Mma
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Usoro Mbara Igwe Anyị Pụrụ Iche Otú O Si Malite
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ike Ike Ihe—“Onye Meworo Eluigwe na Ụwa”
    Bịaruo Jehova Nso
  • Gịnị Ka Ihe Ndị Dị na Mbara Igwe Nakwa n’Ụwa Na-akụziri Anyị?
    Teta!—2021
  • Onyinye Ga-adịru Mgbe Ebighị Ebi nke Onye Okike Anyị Nyere Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
w07 2/15 p. 3

Kporie Ndụ N’ụwa Anyị Mara Mma

NDỊ na-enyocha mbara igwe achọpụtala na ụwa dị nnọọ ka kpọm na mbara igwe nke na-enweghị nsọtụ. Ọ dịbeghị ebe ọzọ a hụrụ ndụ na mbara igwe anya na-ahụ. Ọ bụ nanị n’Ụwa ka e nwere ọnọdụ ga-eme nnọọ ka ihe dịgide ndụ.

Ọzọkwa, anyị nwere ike ịdị ndụ obi ụtọ n’ụwa a magburu onwe ya. Lee otú o si atọ ụtọ ịnyaratụ anwụ n’oge oyi! Olee onye n’ime anyị ọ na-adịghị amasị ikiri ka anyanwụ na-ada ma ọ bụ na-awa? Ma ọrụ anyanwụ anyị na-arụ abụghị nanị ikpo anyị ahụ́ ọkụ na ịdọrọ mmasị anyị. O ji anyị nnọọ ndụ.

Kemgbe ọtụtụ nde afọ, ikike sitere n’anyanwụ emewo ka ụwa na mbara ala ndị ọzọ dịgide n’ebe ha dị. Dịkwa ka a na-akụziri ụmụ akwụkwọ, usoro mbara igwe dum na-agba etiti ụyọkọ kpakpando anyị bụ́ Milky Way gburugburu. Ma a bịa n’ụyọkọ kpakpando nke anyị, anyanwụ bụ otu n’ime otu narị ijeri kpakpando ndị na-emekọ njem a ọnụ.

E jikọtara ụyọkọ kpakpando Milky Way na ihe dị ka ụyọkọ kpakpando 35 ndị ọzọ. E nwere ụyọkọ kpakpando ndị e jikọtara ha na ọtụtụ puku ụyọkọ kpakpando. O yiri ka usoro mbara igwe anyị agaraghị akwụsi ike otú ọ kwụsiri ma a sị na ọ nọ n’ụyọkọ kpakpando e jikọtara ya na ọtụtụ ụyọkọ kpakpando. Ma, dị ka Guillermo Gonzalez na Jay W. Richards kwuru n’akwụkwọ ha bụ́ The Privileged Planet, ọ bụ nanị ebe ole na ole na mbara igwe “ka mmadụ nwere ike ịdị ndụ na ha.”

Ndụ ọ̀ bịara dịrị n’ụwa a na mberede? Ka è nwere ezigbo ihe mere e ji nwee ndụ n’Ụwa anyị mara mma?

Ọtụtụ ndị ekwubiela na e kere ụwa anyị kpọmkwem iji mee ka ụmụ mmadụ na ihe ndị ọzọ dịgide ndụ.a Ọtụtụ narị afọ gara aga, otu onye Hibru na-ede egwú kwuru okwu banyere ụwa na eluigwe. O dere, sị: “Mgbe m hụrụ eluigwe Gị, bụ́ ọrụ mkpịsị aka Gị, ọnwa na kpakpando nile, nke I doziworo; gịnị ka mmadụ bụ?” (Abụ Ọma 8:3, 4) Onye a na-ede egwú kweere na ọ ghaghị ịbụ na e nwere Onye Okike. Ihe ahụ o kweere ọ̀ ka ziri ezi n’oge a e nwerela ọganihu dị ukwuu na nkà mmụta sayensị?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Gụọ akwụkwọ Abụ Ọma, karịsịa Abụ Ọma nke 8.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 3]

Akwụkwọ bụ́ The Illustrated Science Encyclopedia—Amazing Planet Earth kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị nọrọ n’ebe dị anya na mbara igwe gbara ọchịchịrị lee Ụwa anya, o yiri ọla na-acha anụnụ anụnụ nke na-egbuke egbuke.”

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ụwa: U.S. Fish & Wildlife Service, Washington, D.C./NASA

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya