Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w07 4/15 p. 3
  • Ụwa Obi Ọjọọ Anyị Bi na Ya Taa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụwa Obi Ọjọọ Anyị Bi na Ya Taa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Mere Ụfọdụ Ndị Ji Ekwu na Obi Tara Chineke Mmiri?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ọ̀ Dị Mgbe Omume Obi Ọjọọ Ga-akwụsị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Gbaghara Ma Chezọọ—Ọ̀ Pụrụ Ikwe Mee?
    Teta!—1998
  • Arụrụala—Gịnị Bụ Ihe Ngwọta Chineke Nwere?
    Teta!—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
w07 4/15 p. 3

Ụwa Obi Ọjọọ Anyị Bi na Ya Taa

MARÍA dị afọ 64 ma biri nanị ya. A hụrụ ozu ya n’ụlọ ya, ebe a kụchara ya ihe ma jiri waya eletrik kegbuo ya.

Otu ìgwè mmadụ iwe ji kụrụ ndị uwe ojii atọ ihe, na-ebo ha ebubo na ha tọọrọ ụmụaka abụọ. Ha wụrụ mmadụ abụọ n’ime ndị uwe ojii ahụ mmanụ ụgbọala ma kpọọ ha ọkụ. Nke atọ n’ime ndị uwe ojii ahụ jisiri ike gbanahụ ha.

Otu oku fon nke a na-amaghị onye kpọrọ ya mere ka a chọpụta otu ihe na-awụ akpata oyi n’ahụ́. A bọpụtara ozu ụmụ nwoke anọ gara ezumike n’otu ogige. E kechiri ha anya, kekọtakwa ha aka. Mgbe e nyochara ozu ha, a chọpụtara na e liri ha ná ndụ.

Arụ ndị a abụghị ihe ndị e mere na fim ndị na-atụ ụjọ e mere ọtụtụ ihe ike na ha. Akụkọ ndị ahụ nile mere eme nke na ha gbara n’ihu akwụkwọ akụkọ ndị a na-ebipụta n’otu mba dị na Latin America na nso nso a. Ma, ọ bụghị nanị ná mba ahụ ka ụdị ihe ndị ahụ na-eme n’ụwa taa.

A na-eme omume obi ọjọọ ebe nile kwa ụbọchị. Ịtụ bọmbụ, iyi ọha egwu, igbu ọchụ, mwakpọ, ịgbarịta égbè na idina ụmụ nwanyị n’ike bụ ole na ole n’ime ha. Ugboro ugboro, ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-akọ banyere arụ ndị na-awụ akpata oyi n’ahụ́, ọ dịghịzikwa ihe ọtụtụ ndị ji ịnụ ma ọ bụ ịhụ omume obi ọjọọ ndị ahụ kpọrọ.

Ị pụrụ nnọọ ịdị na-eche, sị: ‘Olee ihe na-eme ụwa nke oge a? Ọ́ dịghịzi onye na-echetụ echiche banyere otú ihe si emetụta ndị ọzọ na onye na-akwanyere ndụ ùgwù?’ N’ihi gịnị ka anyị ji biri n’ụwa dị otú a?

Cheedị echiche banyere Harry, bụ́ nwoke dị afọ 69 na-arịa ọrịa cancer. Nwunye ya na-arịa ọrịa na-ebibi akwara bụ́ multiple sclerosis, ma ndị agbata obi ha na ndị enyi ha gbataara ha ọsọ enyemaka. Harry kwuru, sị: “Amaghị m ihe anyị gaara eme ma e wepụ aka ndị a na-enyere anyị.” Otu ihe ọmụmụ e mere na Canada, bụ́ ebe o bi, gosiri na ihe karịrị ọkara nke ndị na-elekọta ndị agadi na-elekọta ndị na-abụghị ndị ikwu ha. O doro anya na ị maara ndị nkịtị na-egosikarị ndị ọzọ obiọma ma na-enyere ndị agbata obi ha aka. Ee, ụmụ mmadụ nwere ike ịdị ọmịiko na obiọma kama ime omume obi ọjọọ.

Ebe ọ dị otú ahụ, oleezi ihe mere arụ ji jupụta ebe nile? Olee ihe na-akpali ndị mmadụ ime omume obi ọjọọ? Ndị na-emeso ndị ọzọ omume obi ọjọọ hà nwere ike ịgbanwe? Ọ̀ dị mgbe omume obi ọjọọ ga-akwụsị? Ya bụrụ na ọ ga-akwụsị, olee otú ọ ga-esi kwụsị, oleekwanụ mgbe ọ ga-akwụsị?

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

Ụgbọ okporo ígwè: CORDON PRESS

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya