Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w07 7/15 p. 16-20
  • Ì Mehiela Megide Mmụọ Nsọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ì Mehiela Megide Mmụọ Nsọ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nchegharị Na-eweta Mgbaghara
  • Ha Mehiere Megide Mmụọ Nsọ
  • Ha Emehieghị Megide Mmụọ Nsọ
  • Ibelata Egwu Banyere Mmehie
  • Jehova Na-agbaghara n’Ụba
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ọ̀ Dị Mmehie Na-enweghị Mgbaghara?
    Teta!—2003
  • Gịnị Bụ Mmehie Na-enweghị Mgbaghara?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ebere Jehova Na-azọpụta Anyị Pụọ N’obi Nkoropụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
w07 7/15 p. 16-20

Ì Mehiela Megide Mmụọ Nsọ?

“E nwere mmehie nke na-eweta ọnwụ.”—1 JỌN 5:16.

1, 2. Olee otú anyị si mara na mmadụ nwere ike imehie megide mmụọ nsọ Chineke?

“ANỌWO m na-echegbu onwe m n’ihi na echere m na emehiewo m megide mmụọ nsọ.” Nke ahụ bụ ihe otu nwanyị nọ na Germany dere, n’agbanyeghị na ọ na-efe Chineke. Onye Kraịst ọ̀ pụrụ n’ezie imehie megide mmụọ nsọ Chineke ma ọ bụ ike ya nke nọ n’ọrụ?

2 Ee, mmadụ nwere ike imehie megide mmụọ nsọ Jehova. Jizọs Kraịst kwuru, sị: “A ga-agbaghara ụmụ mmadụ ụdị mmehie na nkwulu ọ bụla, ma a gaghị agbaghara nkwulu e kwuluru mmụọ nsọ.” (Matiu 12:31) A dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Ọ bụrụ na anyị elezie anya nọgide na-eme mmehie mgbe anyị nwetasịworo ezi ihe ọmụma nke eziokwu ahụ, ọ dịkwaghị àjà ọ bụla fọrọ maka mmehie, kama e nwere nnọọ ikpe na-atụ egwu nke a na-atụ anya ya.” (Ndị Hibru 10:26, 27) Jọn onyeozi dekwara, sị: “E nwere mmehie nke na-eweta ọnwụ.” (1 Jọn 5:16) Ma ọ̀ bụ onye ahụ mere mmehie dị oké njọ ka ọ dịịrị ikpebi ma ò meela “mmehie nke na-eweta ọnwụ”?

Nchegharị Na-eweta Mgbaghara

3. Ọ bụrụ na mmehie anyị mere na-ewute anyị nke ukwuu, gịnị ka ọ pụrụ nnọọ ịpụta?

3 Ọ bụ Jehova bụ Onyeikpe nke ga-ekpe ndị mere ihe ọjọọ ikpe. N’ezie, anyị nile aghaghị ịza ajụjụ n’ihu ya, ọ na-emekwa ihe ziri ezi mgbe nile. (Jenesis 18:25; Ndị Rom 14:12) Ọ bụ Jehova ka ọ dịịrị ikpebi ma ànyị emeela mmehie na-enweghị mgbaghara, ọ pụkwara ịnara anyị mmụọ ya. (Abụ Ọma 51:11) Otú ọ dị, ọ bụrụ na mmehie anyị mere na-ewute anyị nke ukwuu, ọ pụrụ ịpụta nnọọ na anyị echegharịala. Ma, gịnị ka ezi nchegharị pụtara?

4. (a) Olee otú ị ga-esi kọwaa nchegharị? (b) Olee ihe na-akasi obi dị n’Abụ Ọma 103:10-14?

4 Nchegharị pụtara na anyị ga-ewepụ aka ná mmehie anyị mere n’oge gara aga ma ọ bụ na nke anyị chọrọ ime eme. Ọ pụtara inwe mwute ma ọ bụ ịkwa ụta maka mmehie ahụ anyị mere ma kwụsị ya. Ọ bụrụ na anyị mere mmehie dị oké njọ ma mee ihe ndị kwesịrị ekwesị iji gosi na anyị echegharịala n’ezie, okwu ndị a ọbụ abụ kwuru pụrụ ịkasị anyị obi: “Ọ bụghị dị ka mmehie nile anyị si dị ka [Jehova] meworo anyị, ọ bụghịkwa dị ka ajọ omume nile anyị si dị ka O mesoworo anyị. N’ihi na dị ka ịdị elu nke eluigwe si dị n’elu ụwa, otú a ka ebere Ya dị ike n’ahụ́ ndị na-atụ egwu Ya. Dị ka Ihu anyanwụ si dị anya n’Ọdịda anyanwụ, otú a ka O meworo ka njehie nile anyị dị anya n’ebe anyị nọ. Dị ka nna si enwe obi ebere n’ahụ́ ụmụ ya, otú a ka Jehova nwere obi ebere n’ahụ́ ndị na-atụ egwu Ya. N’ihi na Ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị; Ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.”—Abụ Ọma 103:10-14.

5, 6. Kwuo isi ihe dị na 1 Jọn 3:19-22 ma kọwaa ihe okwu onyeozi ahụ pụtara.

5 Ihe ọzọ pụkwara ịkasị anyị obi bụ okwu Jọn onyeozi nke bụ́: “Anyị ga-esite na nke a mara na anyị sitere n’eziokwu ahụ, anyị ga-emekwa ka obi sie anyị ike n’ihu ya banyere ihe ọ bụla obi anyị nwere ike ịma anyị ikpe na ya, n’ihi na Chineke karịrị obi anyị, marakwa ihe nile. Ndị m hụrụ n’anya, ọ bụrụ na obi anyị adịghị ama anyị ikpe, anyị nwere nkwuwa okwu n’ebe Chineke nọ; anyị na-anatakwa ihe ọ bụla anyị rịọrọ n’aka ya, n’ihi na anyị na-edebe ihe ndị o nyere n’iwu, na-emekwa ihe ndị dị mma n’anya ya.”—1 Jọn 3:19-22.

6 Anyị “maara na anyị sitere n’eziokwu ahụ” n’ihi na anyị na-ahụ ụmụnna anyị n’anya, anyị adịghịkwa anọgide na-eme mmehie. (Abụ Ọma 119:11) Ọ bụrụ na obi anyị na-ama anyị ikpe n’ihi ihe ụfọdụ, anyị kwesịrị icheta na “Chineke karịrị obi anyị, marakwa ihe nile.” Jehova na-emere anyị ebere n’ihi na ọ maara na anyị nwere “mmetụta ụmụnna nke ihu abụọ na-adịghị ya,” mara ọgụ anyị na-alụso mmehie na mgbalị anyị na-eme iji mee uche Ya. (1 Pita 1:22) Obi anyị agaghị “ama anyị ikpe” ma ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi, na-ahụ ụmụnna anyị n’anya ma ghara ịkpachara anya nọgide na-eme mmehie. Anyị ga-enwe “nkwuwa okwu n’ebe Chineke nọ” n’ekpere, ọ ga-azakwa ekpere anyị n’ihi na anyị na-edebe ihe ndị o nyere n’iwu.

Ha Mehiere Megide Mmụọ Nsọ

7. Olee ihe na-ekpebi ma à ga-agbaghara mmadụ mmehie ya ma ọ bụ na a gaghị agbaghara ya?

7 Olee mmehie ndị na-enweghị mgbaghara? Iji zaa ajụjụ a, ka anyị tụlee ụfọdụ ihe atụ ndị dị na Bible. Nke a kwesịrị ịkasi anyị obi ma ọ bụrụ na anyị echegharịala ma ya abụrụ na oké ihe ọjọọ ndị anyị mere ka na-ewute anyị nke ukwuu. Anyị ga-ahụ na ihe na-ekpebi ma à ga-agbaghara mmadụ mmehie ya abụghị ụdị mmehie o mere; kama nke ahụ, ihe na-ekpebi ya bụ ebumnobi onye ahụ, ọnọdụ obi ya, na otú ọ maruru ama mee mmehie ahụ.

8. Olee otú ụfọdụ ndị ndú okpukpe ndị Juu na narị afọ mbụ si mehie megide mmụọ nsọ?

8 Ndị ndú okpukpe ndị Juu nke narị afọ mbụ, bụ́ ndị ji obi ọjọọ megide Jizọs Kraịst nọ na-eme mmehie megide mmụọ nsọ. Ha hụrụ mmụọ Chineke ka ọ na-arụ ọrụ n’ime Jizọs ka Jizọs na-arụ ọrụ ebube ndị wetaara Jehova otuto. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị a bụ́ ndị iro Kraịst kwuru na ike a sitere n’aka Setan bụ́ Ekwensu. Dị ka Jizọs si kwuo, ndị kwuluru mmụọ nsọ Chineke nọ na-eme mmehie a na-agaghị agbaghara ha “n’usoro ihe nke a ma ọ bụkwanụ na nke gaje ịbịa.”—Matiu 12:22-32.

9. Gịnị bụ nkwulu, oleekwa ihe Jizọs kwuru banyere ya?

9 Nkwulu bụ okwu nkwutọ, nke na-egbu mmụọ, ma ọ bụ nke na-eweda mmadụ ala. Ebe ọ bụ na mmụọ nsọ si n’aka Chineke, ikwulu mmụọ ya bụ ikwulu Jehova. A gaghị agbaghara ndị kwuluru mmụọ nsọ n’enweghị nchegharị. Ihe Jizọs kwuru banyere mmehie dị otú a na-egosi na ndị Jizọs na-ekwu banyere ha bụ ndị leziri anya gọnahụ ọrụ mmụọ nsọ Chineke na-arụ. Ebe ọ bụ na mmụọ nsọ Jehova na-arụ ọrụ n’ime Jizọs ma ndị na-emegide ya ekwuo na ike ya sitere n’aka Ekwensu, ha mere mmehie site n’ikwulu mmụọ nsọ. N’ihi ya, Jizọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-ekwulu mmụọ nsọ enweghị mgbaghara ruo mgbe ebighị ebi, kama ọ bụ onye ikpe mmehie ebighị ebi mara.”—Mak 3:20-29.

10. N’ihi gịnị ka Jizọs ji kpọọ Judas “nwa mbibi ahụ”?

10 Tụleekwa ihe banyere Judas Iskarịọt. Ọ kwụwaghị aka ya ọtọ, na-ezuru ego dị n’igbe ego e nyere ya lekọta. (Jọn 12:5, 6) Judas mesịrị gakwuru ndị ndú ndị Juu ma mee atụmatụ ịrara Jizọs nye maka mkpụrụ ego ọlaọcha 30. Ee, Judas nwere mwute mgbe ọ rasịịrị Jizọs nye, ma ọ dịghị mgbe o chegharịrị ná mmehie ahụ o leziri anya mee. N’ihi ya, a gaghị akpọlite Judas n’ọnwụ. Ọ bụ ihe mere Jizọs ji kpọọ ya “nwa mbibi.”—Jọn 17:12; Matiu 26:14-16.

Ha Emehieghị Megide Mmụọ Nsọ

11-13. Olee otú Eze Devid si mee mmehie n’ihe banyere Bat-sheba, oleekwa otú ụzọ Chineke si kpee ha ikpe pụrụ isi kasie anyị obi?

11 Mgbe ụfọdụ, Ndị Kraịst kwupụtarala mmehie ha, ndị okenye ọgbakọ enyekwara ha aka ka nwere ike ịdị na-echegbu onwe ha maka iwu Chineke ndị ha nupụụrụ isi. (Jems 5:14) Ọ bụrụ na anyị na-echegbu onwe anyị otú ahụ, o yiri nnọọ ka ànyị ga-erite uru site n’ịtụle ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ndị a gbaghaara mmehie ha.

12 Eze Devid mere mmehie dị oké njọ n’ihe ya na Bat-sheba, bụ́ nwunye Yuraịa, mere. Mgbe Devid si n’elu ụlọ ya hụ nwanyị a mara nnọọ mma ka ọ na-asa ahụ́ n’otu ụlọ dị nso, o ziri ozi ka a kpọta ya n’obí ya, ya na ya nwekwara mmekọahụ. Mgbe nwanyị ahụ gwara Devid na ya dị ime, o mere atụmatụ ka di ya bụ́ Yuraịa lọta ma soro ya dinaa iji kpuchie iko ahụ ha kwara. Mgbe atụmatụ ahụ kụrụ afọ n’ala, eze mere ndokwa ka e gbuo Yuraịa n’ọgbọ agha. Mgbe nke ahụ gasịrị, Bat-sheba ghọrọ nwunye Devid, mụọkwara ya nwa, bụ́ onye mesịrị nwụọ.—2 Samuel 11:1-27.

13 Jehova kpere ikpe Devid na Bat-sheba. Chineke gbaghaara Devid mmehie ya, ma eleghị anya n’ihi nchegharị ya na n’ihi ọgbụgba ndụ Alaeze Ya na ya gbara. (2 Samuel 7:11-16; 12:7-14) O doro anya na Bat-sheba nwere nchegharị, n’ihi na o nwetara ihe ùgwù nke ịbụ nne Eze Solomọn na nne ochie nke Jizọs Kraịst. (Matiu 1:1, 6, 16) Ọ bụrụ na anyị mere mmehie, ọ dị mma icheta na Jehova na-ahụ nchegharị anyị.

14. Olee otú akụkọ Eze Manase si gosi ókè Chineke pụrụ ịgbagharuru mmadụ mmehie?

14 Akụkọ Eze Manase nke Juda gosikwara ókè Jehova pụrụ ịgbagharuru mmadụ mmehie. O mere ihe jọrọ njọ n’anya Jehova. Manase wuuru Bel ebe ịchụàjà, fee “ụsụụ nile nke ihe eluigwe,” ọbụnakwa wuoro chi ụgha dị iche iche ebe ịchụàjà n’ogige abụọ nke ụlọ nsọ ahụ. O mere ka ụmụ ya ndị ikom gabiga n’ọkụ, kwalite mgbaasị, meekwa ka ndị bi na Juda na Jeruselem ‘mee ihe ọjọọ karịa mba ọzọ, bụ́ ndị Jehova kpochapụrụ n’ihu ụmụ Izrel.’ Ọ naraghị ịdọ aka ná ntị ndị amụma Chineke nyere ya. N’ikpeazụ, eze Asiria dọọrọ Manase n’agha. Mgbe Manase nọ ná ndọrọ n’agha, o chegharịrị ma jiri obi umeala nọgide na-ekpegara Chineke ekpere, bụ́ onye gbaghaara ya mmehie ya ma weghachi ya n’ocheeze ya na Jeruselem, bụ́ ebe ọ nọ kwalite ezi ofufe.—2 Ihe E Mere 33:2-17.

15. Olee ihe mere ná ndụ Pita onyeozi bụ́ nke na-egosi na Jehova na-agbaghara mmehie “n’ụba”?

15 Mgbe ọtụtụ narị afọ gasịrị, Pita onyeozi mere mmehie dị oké njọ site n’ịgọnahụ Jizọs. (Mak 14:30, 66-72) Ma, Jehova gbaghaara Pita mmehie ya “n’ụba.” (Aịsaịa 55:7) N’ihi gịnị? N’ihi na Pita nwere ezi nchegharị. (Luk 22:62) Ihe gosiri na Chineke gbaghaara Pita mmehie ya bụ na ka ụbọchị 50 gasịrị, e nyere ya ihe ùgwù nke iji obi ike kwuo okwu banyere Jizọs n’ụbọchị Pentikọst. (Ọrụ 2:14-36) Ọ̀ dị ihe mere anyị ga-eji ghara ikwere na Chineke ga-agbaghara Ndị Kraịst nwere ezi nchegharị mmehie ha taa? Ọbụ abụ bụrụ, sị: “Ọ bụrụ na Ị rịba ajọ omume nile ama, Jaa, Onyenwe anyị, ònye ga-eguzo? Ma n’aka Gị ka mgbaghara dị.”—Abụ Ọma 130:3, 4.

Ibelata Egwu Banyere Mmehie

16. Olee ọnọdụ ndị na-eme ka Chineke gbaghara mmehie?

16 Ihe atụ ndị ahụ e nyere n’elu kwesịrị inyere anyị aka ịkwụsị ụjọ anyị na-atụ na anyị emehiela megide mmụọ nsọ. Ha na-egosi na Jehova na-agbaghara ndị mmehie chegharịrị echegharị mmehie ha. Ihe kasị mkpa bụ ikpesi ekpere ike nye Chineke. Ọ bụrụ na anyị mere mmehie, anyị pụrụ ịrịọ Chineke ka ọ gbaghara anyị mmehie anyị dabere n’àjà mgbapụta Jizọs, ebere Jehova, mmehie anyị ketara eketa, nakwa dabere n’ozi anyị jirila ikwesị ntụkwasị obi jeere ya. Ebe anyị maara obiọma na-erughịrị mmadụ nke Jehova, anyị pụrụ ịrịọ ya ka ọ gbaghara anyị mmehie anyị, nwee obi ike na ọ ga-agbaghara anyị.—Ndị Efesọs 1:7.

17. Olee ihe anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị emee mmehie ma chọọ ka Chineke nyere anyị aka?

17 Gịnị ma ọ bụrụ na anyị mere mmehie ma ghara inwe ike ikpe ekpere n’ihi na mmehie anyị emebiwo mmekọrịta anyị na Chineke? Jems onye na-eso ụzọ dere banyere nke a, sị: “Ka [onye dị otú ahụ] kpọọ ndị okenye nke ọgbakọ, ka ha kpeekwara ya ekpere, teekwa ya mmanụ n’aha Jehova. Ekpere e ji okwukwe kpee ga-emekwa ka ahụ́ dị onye ahụ nke ahụ́ na-adịghị ike mma, Jehova ga-emekwa ka o bilie. Ọ bụrụkwa na o mewo mmehie, a ga-agbaghara ya.”—Jems 5:14, 15.

18. N’ihi gịnị ka mmehie mmadụ mere ji ghara ịpụta na a pụghị ịgbaghara ya ma ọ bụrụgodị na a chụrụ ya n’ọgbakọ?

18 Ya bụrụgodị na onye mere ihe ọjọọ enweghị nchegharị na mbụ, a chụpụkwa ya n’ọgbakọ, nke ahụ apụtaghị na a pụghị ịgbaghara ya. Pọl dere banyere onye e tere mmanụ mere ihe ọjọọ, bụ́ onye a chụrụ n’ọgbakọ na Kọrint, sị: “Mba a nke ndị ka n’ọnụ ọgụgụ bara ezuworo onye dị otú ahụ, ka unu wee, n’ụzọ dị iche ugbu a, jiri obiọma gbaghara ya ma kasie ya obi, ka a ghara inwe ụzọ onye dị otú ahụ ga-esi bụrụ onye e lodara site n’inwebiga mwute ókè.” (2 Ndị Kọrint 2:6-8; 1 Ndị Kọrint 5:1-5) Ma, ọ bụrụ na ndị mere mmehie chọrọ ka ha na Chineke dịghachi ná mma, ọ dị ha mkpa ịnabata enyemaka nke ndị okenye ọgbakọ ji Bible nye ha ma gosi na ha echegharịala n’ezie. Ha aghaghị ‘ịmị mkpụrụ kwesịrị nchegharị.’—Luk 3:8.

19. Olee ihe pụrụ inyere anyị aka ịnọgide ‘na-adị ike n’okwukwe’?

19 Olee ihe nwere ike iso kpata ụjọ anyị na-atụ na anyị emehiela megide mmụọ nsọ? Ịkpachabiga anya ókè ma ọ bụ ọrịa nwekwara ike iso kpata ya. N’ọnọdụ dị otú ahụ, ekpere na izu ezigbo ike pụrụ inyere anyị nnọọ aka. Anyị ekwesịtụghị ikwe ka Setan kụda anyị obi ijere Chineke ozi. Ebe ọ bụ na ọnwụ onye ajọ omume anaghị atọ Jehova ụtọ, ọ na-ewute ya nnọọ mgbe ohu ya kwụsịrị ife ya. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị na-atụ ụjọ na anyị emehiela megide mmụọ nsọ, anyị kwesịrị ịnọgide na-agụ Okwu Chineke, gụnyere akụkụ ya ụfọdụ ndị na-akasi obi dị ka Abụ Ọma. Ọ dị anyị mkpa ịgachi ọmụmụ ihe ọgbakọ anya na ikere òkè n’ọrụ nkwusa Alaeze. Ime otú ahụ ga-enyere anyị aka ‘ịdị ike n’okwukwe,’ ọ ga-emekwa ka anyị ghara ịdị na-echegbu onwe anyị na anyị emewo mmehie na-enweghị mgbaghara.—Taịtọs 2:2.

20. Olee ajụjụ ndị pụrụ inyere mmadụ aka ịghọta na ya emehiebeghị megide mmụọ nsọ?

20 Onye ọ bụla na-atụ ụjọ na ya emehiela megide mmụọ nsọ nwere ike ịjụ onwe ya, sị: ‘Èkwuluola m mmụọ nsọ? Èji m obi dum chegharịa ná mmehie m? M̀ nwere okwukwe ná mgbaghara Chineke? M̀ bụ onye si n’ezi ofufe dapụ nke jụrụla nduzi Chineke?’ O yiri nnọọ ka ndị dị otú ahụ ga-aghọta na ha ekwulubeghị mmụọ nsọ Chineke, ha abụghịkwa ndị si n’ezi ofufe dapụ. Ha echegharịala ná mmehie ha ma nwee okwukwe siri ike ná mgbaghara Jehova. Ọ bụrụ otú ahụ, ha emehiebeghị megide mmụọ nsọ Jehova.

21. Olee ajụjụ ndị isiokwu na-esonụ ga-aza?

21 Obi ga-eru anyị nnọọ ala mgbe o doro anyị anya na anyị emehiebeghị megide mmụọ nsọ! Ma, ihe ọzọ ya na okwu a nwere njikọ bụ ajụjụ ndị a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ. Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ ịjụ onwe anyị, sị: ‘Àbụ m onye mmụọ nsọ Chineke na-eduzi n’ezie? À na-ahụ mkpụrụ ya ná ndụ m?’

Gịnị Ka Ị Ga-aza?

• N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na mmadụ nwere ike imehie megide mmụọ nsọ?

• Olee ihe nchegharị pụtara?

• Olee ndị mehiere megide mmụọ nsọ mgbe Jizọs nọ n’ụwa?

• Olee otú anyị pụrụ isi kwụsị ịtụ ụjọ na anyị emewo mmehie na-enweghị mgbaghara?

[Foto dị na peeji nke 17]

Ndị kwuru na Jizọs rụrụ ọrụ ebube site n’ike Setan mehiere megide mmụọ nsọ Chineke

[Foto dị na peeji nke 18]

Ọ bụ ezie na Pita gọnahụrụ Jizọs, Pita emeghị mmehie na-enweghị mgbaghara

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya