Ị̀ ‘Ga-anọgide Na-eje Ije Site na Mmụọ Nsọ’?
“Nọgidenụ na-eje ije site na mmụọ nsọ, unu agaghịkwa emezu ọchịchọ anụ ahụ́ ọ bụla ma ọlị.”—NDỊ GALESHIA 5:16.
1. Olee otú anyị pụrụ isi kwụsị ịtụ ụjọ imehie megide mmụọ nsọ?
Ọ DỊ otu ụzọ mmadụ pụrụ isi kwụsị ịtụ ụjọ imehie megide mmụọ nsọ Jehova. Ọ bụ ime ihe Pọl onyeozi kwuru, nke bụ́: “Nọgidenụ na-eje ije site na mmụọ nsọ, unu agaghịkwa emezu ọchịchọ anụ ahụ́ ọ bụla ma ọlị.” (Ndị Galeshia 5:16) Ọ bụrụ na anyị ekwere ka mmụọ nsọ Chineke na-eduzi anyị, anyị agaghị ekwe ka ọchịchọ ọjọọ nke anụ ahụ́ merie anyị.—Ndị Rom 8:2-10.
2, 3. Ọ bụrụ na anyị anọgide na-eje ije site na mmụọ nsọ, olee otú ọ ga-esi metụta anyị?
2 Ka anyị ‘na-anọgide na-eje ije site na mmụọ nsọ,’ ike Chineke nke nọ n’ọrụ ga-akwali anyị irubere Jehova isi. Anyị ga-egosipụta àgwà ndị e ji mara Chineke n’ozi anyị, n’ọgbakọ, n’ebe obibi anyị na n’ebe ndị ọzọ. Ụzọ anyị si emeso di ma ọ bụ nwunye anyị, ụmụ anyị, ndị kwere ekwe ibe anyị, na ndị ọzọ ihe ga-egosi na anyị bụ ndị mmụọ nsọ na-eduzi.
3 Ịdị ndụ “dị ka mmụọ si dị site n’ụzọ Chineke si ele ihe anya,” na-enyere anyị aka iwepụ aka ná mmehie. (1 Pita 4:1-6) Ọ bụrụ na mmụọ nsọ na-eduzi anyị, o doro anya na anyị agaghị eme mmehie na-enweghị mgbaghara. Ma olee ụzọ ndị ọzọ anyị pụrụ isi rite uru site n’ịnọgide na-eje ije site na mmụọ nsọ?
Nọgide Na-anọ Chineke na Kraịst Nso
4, 5. Olee otú ije ije site na mmụọ nsọ si emetụta ụzọ anyị si ele Jizọs anya?
4 Ihe mere anyị ji nwee ike ịnọgide na-anọ Chineke na Ọkpara ya nso bụ na anyị na-eje ije site na mmụọ nsọ. Mgbe Pọl na-edere ndị kwere ekwe ibe ya nọ na Kọrint akwụkwọ banyere onyinye nke mmụọ nsọ, ọ gwara ha, sị: “M ga-achọ ka unu [ndị na-ekpeburu arụsị] mara na ọ dịghị onye ọ bụla, mgbe ọ na-ekwu okwu site na mmụọ Chineke, nke na-asị: ‘Jizọs bụ onye a bụrụ ọnụ!’ ọ dịghịkwa onye ọ bụla pụrụ ịsị: ‘Jizọs bụ Onyenwe anyị!’ ma ọ́ bụghị site na mmụọ nsọ.” (1 Ndị Kọrint 12:1-3) Mmụọ ọ bụla na-akpali ndị mmadụ ịbụ Jizọs ọnụ aghaghị isite n’aka Setan bụ́ Ekwensu. Ma, dị ka Ndị Kraịst bụ́ ndị na-eje ije site na mmụọ nsọ, anyị kwenyesiri ike na Jehova si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite Jizọs ma bulie ya elu karịa ihe ọ bụla ọzọ e kere eke. (Ndị Filipaị 2:5-11) Anyị nwere okwukwe n’àjà mgbapụta Kraịst ma nabata Jizọs dị ka Onye Ọchịchị Chineke nyere anyị.
5 Ụfọdụ ndị kpọrọ onwe ha Ndị Kraịst na narị afọ mbụ O.A. ekwetaghị na Jizọs abịawo n’anụ ahụ́. (2 Jọn 7-11) Nke ahụ mere ka ụfọdụ ndị kweere n’echiche na-ezighị ezi dị otú ahụ jụ ezi ozizi banyere Jizọs, bụ́ Mezaịa ahụ. (Mak 1:9-11; Jọn 1:1, 14) Ije ije site na mmụọ nsọ na-eme ka anyị ghara isi n’ezi ofufe dapụ otú ahụ. Ma iji nọgide na-enweta obiọma na-erughịrị mmadụ nke Jehova ma ‘nọgide na-eje ije n’eziokwu ahụ’ anyị aghaghị ịnọgide na-amụrụ anya iji mata ozizi ndị sitere na Bible. (3 Jọn 3, 4) N’ihi ya, ka anyị kpebisie ike ịnọgide na-ajụ ụdị nile nke ndapụ n’ezi ofufe iji mee ka mmekọrịta nke anyị na Nna anyị nke eluigwe nọgide na-esi ike.
6. Olee àgwà ndị mmụọ Chineke na-amịpụta n’ime ndị na-eje ije site na mmụọ nsọ?
6 Pọl gụkọtara ikpere arụsị nke bụ́ isi n’ezi ofufe dapụ na ịrọ òtù ‘n’ọrụ nke anụ ahụ́’ ndị dị ka ịkwa iko na omume rụrụ arụ. Ma ọ kọwara, sị: “Ndị bụ ndị nke Kraịst Jizọs kpọgidere anụ ahụ́ tinyere agụụ mmekọahụ ya na ọchịchọ ya nile n’osisi. Ọ bụrụ na anyị na-adị ndụ site na mmụọ nsọ, ka anyị nọgide na-ejekwa ije n’usoro site na mmụọ nsọ.” (Ndị Galeshia 5:19-21, 24, 25) Olee àgwà ndị ike Chineke nke nọ n’ọrụ na-amipụta n’ime ndị na-eje ije site na mmụọ nsọ? Pọl dere, sị: “Mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, njide onwe onye.” (Ndị Galeshia 5:22, 23) Ka anyị tụlee akụkụ ndị a nke mkpụrụ nke mmụọ nsọ.
“Na-ahụrịta Ibe Anyị n’Anya”
7. Gịnị bụ ịhụnanya, oleekwa ụfọdụ ihe ndị e ji mara ya?
7 Ịhụnanya—nke so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ—na-agụnye inwe mmasị miri emi n’ebe ndị ọzọ nọ ma na-echebara ha echiche, tinyekwara imeta ha enyi. Akwụkwọ Nsọ kwuru na “Chineke bụ ịhụnanaya” n’ihi na ọ bụ isi iyi nke àgwà ahụ. Àjà mgbapụta Jizọs Kraịst bụ ihe atụ nke ịhụnanya dị ukwuu Chineke na Ọkpara ya nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ. (1 Jọn 4:8; Jọn 3:16; 15:13; Ndị Rom 5:8) Ịhụnanya anyị nwere n’etiti onwe anyị bụ ihe e ji mara anyị dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Jọn 13:34, 35) N’ezie, e nyere anyị iwu ‘ịhụrịta ibe anyị n’anya.’ (1 Jọn 3:23) Pọl kwukwara na ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi na obiọma. Ọ dịghị ekwo ekworo, ọ dịghị etu ọnụ, ọ dịghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị, ma ọ bụ na-achọ ọdịmma nke ya. A dịghị akpasu ịhụnanaya iwe, ọ dịghịkwa agụkọ ihe ọjọọ. Ọ dịghị aṅụrịrị ajọ omume ọṅụ, kama ọ na-aṅụrịrị eziokwu ọṅụ. Ịhụnanaya na-edi ihe nile, na-ekwere ihe nile, na-enwe olileanya ihe nile, ma na-atachiri ihe nile obi. Ọzọkwa, ọ dịghị ada ada.—1 Ndị Kọrint 13:4-8.
8. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji hụ ndị anyị na ha na-efe Jehova n’anya?
8 Ọ bụrụ na anyị ekwe ka mmụọ nsọ Chineke mịpụta ịhụnanya n’ime anyị, a ga-ahụ ya ná mmekọrịta anyị na Chineke na ndị agbata obi anyị. (Matiu 22:37-39) Jọn onyeozi dere, sị: “Onye na-adịghị ahụ n’anya na-anọgide n’ọnwụ. Onye ọ bụla nke kpọrọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ, unu makwaara na ọ dịghị ogbu mmadụ nke ndụ ebighị ebi na-adịgide n’ime ya.” (1 Jọn 3:14, 15) A pụrụ ichebe onye gburu mmadụ gbabara n’otu n’ime obodo mgbaba ndị e nwere n’Izrel nanị ma ọ bụrụ na ọ kpọghị onye ahụ o gburu asị. (Deuterọnọmi 19:4, 11-13) Ọ bụrụ na mmụọ nsọ na-eduzi anyị, anyị ga-ahụ Chineke, ndị kwere ekwe ibe anyị na ndị ọzọ n’anya.
“Ọṅụ Jehova Bụ Ike Unu”
9, 10. Gịnị bụ ọṅụ, oleekwa ụfọdụ ihe ndị na-enye anyị ọṅụ?
9 Ọṅụ bụ oké obi ụtọ. Jehova bụ “Chineke onye obi ụtọ.” (1 Timoti 1:11; Abụ Ọma 104:31) Ọ na-atọ Ọkpara ahụ ụtọ ime uche Nna ya. (Abụ Ọma 40:8; Ndị Hibru 10:7-9) ‘Ọṅụ Jehova bụkwa ike anyị.’—Nehemaịa 8:10.
10 Ọṅụ sitere n’aka Chineke na-enye anyị afọ ojuju mgbe anyị mere uche ya ọbụna n’oge ihe isi ike, iru újú, ma ọ bụ n’oge mkpagbu. Lee nnọọ obi ụtọ “ihe ọmụma Chineke” na-enye anyị! (Ilu 2:1-5) Ọṅụ dị ukwuu mmekọrịta anyị na Chineke na-enye anyị dabeere n’ezi ihe ọmụma na okwukwe anyị nwere n’ebe ọ nọ, na n’ebe àjà mgbapụta nke Jizọs dị. (1 Jọn 2:1, 2) Ihe ọzọ na-enye anyị ọṅụ bụ na anyị nọ n’òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ. (Zefanaịa 3:9; Hagaị 2:7) Olileanya Alaeze anyị nwere na nnukwu ihe ùgwù nke ikwusa ozi ọma na-enye anyị ọṅụ. (Matiu 6:9, 10; 24:14) Ihe ọzọkwa na-enye anyị ọṅụ bụ olileanya nke ndụ ebighị ebi. (Jọn 17:3) Ebe anyị nwere olileanya dị otú ahụ magburu onwe ya, anyị kwesịrị ‘ịdị na-aṅụrị nanị ọṅụ.’—Deuterọnọmi 16:15.
Na-eme Udo Ma Nwee Ogologo Ntachi Obi
11, 12. (a) Olee otú ị ga-esi kọwaa udo? (b) Olee mmetụta udo nke Chineke na-enwe n’ebe anyị nọ?
11 Udo—bụ́ ihe ọzọ so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ—bụ obi iru ala na enweghị nchekasị. Nna anyị nke eluigwe bụ Chineke nke udo, e mesikwara anyị obi ike, sị: “Jehova ga-eji udo gọzie ndị Ya.” (Abụ Ọma 29:11; 1 Ndị Kọrint 14:33) Jizọs gwara ndị na-eso ụzo ya, sị: “M na-ahapụrụ unu udo, m na-enye unu udo m.” (Jọn 14:27) Olee otú nke ahụ ga-esi nyere ndị na-eso ụzọ ya aka?
12 Udo nke Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya mere ka obi na uche ruo ha ala, meekwa ka ha kwụsị ịtụ ụjọ. Ha nwere udo karịsịa mgbe ha natara mmụọ nsọ e kwere ha ná nkwa. (Jọn 14:26) Ekpere Chineke na-aza anyị taa na nduzi nke mmụọ nsọ na-enye anyị “udo nke Chineke” nke na-enweghị atụ, bụ́ nke na-eme ka obi na uche na-eru anyị ala. (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ọzọkwa, mmụọ Jehova na-enyere anyị aka ịdị nwayọọ na anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị na ndị ọzọ ịdị n’udo.—Ndị Rom 12:18; 1 Ndị Tesalonaịka 5:13.
13, 14. Gịnị bụ ogololgo ntachi obi, gịnịkwa mere anyị kwesịrị iji na-egosi ya?
13 Ogologo ntachi obi na ime udo nwere njikọ, n’ihi na ọ pụtara ịtachi obi mgbe a kpasuru anyị iwe ma ọ bụ mee anyị ihe ọjọọ, na-enwe olileanya na ihe ga-aka mma. Chineke nwere ogologo ntachi obi. (Ndị Rom 9:22-24) Jizọs gosipụtakwara àgwà a. Anyị pụrụ irite uru ná ngosipụta Jizọs gosipụtara àgwà a, n’ihi na Pọl dere, sị: “Ihe mere e ji meere m ebere bụ na site na mụ, dị ka onye kasị pụta ìhè, Kraịst Jizọs ga-enwe ike igosipụta ogologo ntachi obi ya nile ịbụ ihe atụ nye ndị gaje ime ka okwukwe ha dabere na ya maka ndụ ebighị ebi.”—1 Timoti 1:16.
14 Ogologo ntachi obi na-enyere anyị aka inwe ndidi mgbe ndị ọzọ gwara anyị okwu ọjọọ ma ọ bụ kwuo okwu n’echeghị ya eche. Pọl gbara Ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Na-enwenụ ogologo ntachi obi n’ebe mmadụ nile nọ.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:14) Ebe ọ bụ na anyị nile ezughị okè ma na-emejọ ihe, anyị ga-achọ nnọọ ka ndị mmadụ na-enwe ndidi n’ebe anyị nọ ma na-enwe ogologo ntachi obi mgbe anyị mejọrọ ha. Ya mere, ka anyị nile gbalịsie ike ‘iji ọṅụ na-enwe ogologo ntachi obi.’—Ndị Kọlọsi 1:9-12.
Na-egosi Obiọma na Ịdị Mma
15. Kọwaa ihe obiọma bụ, nyekwa ihe atụ ya.
15 Anyị na-egosi ndị ọzọ obiọma mgbe anyị gosiri na anyị nwere mmasị n’ebe ha nọ site n’iji obiọma agwa ha okwu na imere ha ihe ọma. Jehova dị obiọma, otú ahụ ka ọ dịkwa Ọkpara ya. (Ndị Rom 2:4; 2 Ndị Kọrint 10:1) A chọrọ ka ndị ohu Chineke na Kraịst na-egosipụta obiọma. (Maịka 6:8; Ndị Kọlọsị 3:12) Ọbụna ụfọdụ ndị ha na Chineke na-adịghị emekọrịta ihe egosiwo “obiọma pụrụ iche.” (Ọrụ 27:3; 28:2) N’ezie, anyị pụrụ igosipụta obiọma ma ọ bụrụ na anyị ‘anọgide na-eje ije site na mmụọ nsọ.’
16. Olee ọnọdụ ụfọdụ ndị kwesịrị ịkpali anyị igosi obiọma?
16 Anyị nwere ike igosipụta obiọma ọbụna mgbe ndị ọzọ kpasuru anyị iwe site n’ịgwa anyị okwu ọjọọ ma ọ bụ mejọọ anyị. Pọl kwuru, sị: “Weenụ iwe, ma unu emehiekwala; ka anyanwụ ghara ịda n’ebe unu nọ n’ọnọdụ mkpasu iwe, unu enyekwala Ekwensu ohere. . . . Bụrụnụ ndị na-emere ibe unu ebere, na-enwe obi ọmịiko, na-agbaghara ibe unu kpam kpam dị nnọọ ka Chineke gbaghakwaara unu kpam kpam site na Kraịst.” (Ndị Efesọs 4:26, 27, 32) O kwesịrị ekwesị karịsịa igosi ndị nọ n’ọnwụnwa obiọma. Otú ọ dị, okenye ọgbakọ nke hụrụ onye o doro anya na ọ chọrọ ịhapụ ụzọ nke “ịdị mma na ezi omume na eziokwu” ma ghara inye ya ndụmọdụ sitere n’Akwụkwọ Nsọ nanị n’ihi na ọ chọghị ịkpasu onye ahụ iwe, anaghị egosipụta obiọma.—Ndị Efesọs 5:9.
17, 18. Olee otú e si kọwaa ịdị mma, oleekwa ọrụ o kwesịrị ịrụ ná ndụ anyị?
17 Ịdị mma bụ ime ihe ọma, ịkpa ezi àgwà, ma ọ bụ ịbụ ezi mmadụ. Ọ bụ Chineke bụ onye kasị dị mma. (Abụ Ọma 25:8; Zekaraịa 9:17) Jizọs mere ihe ọma ma kpaa nnọọ ezi àgwà. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ nabataghị “Ezi Onye” dị ka utu aha mgbe a kpọrọ ya “Ezi Onye Ozizi.” (Mak 10:17, 18) O doro anya na ihe mere o ji ghara ikwe ka a kpọọ ya ezi onye bụ na ọ ghọtara na ọ bụ Chineke kasị egosipụta ịdị mma.
18 Ihe na-egbochi anyị ime ihe ọma bụ mmehie anyị ketara eketa. (Ndị Rom 5:12) N’agbanyeghị nke ahụ, anyị pụrụ ime ihe ọma ma ọ bụrụ na anyị ekpegara Chineke ekpere ka o ‘zi anyị ịdị mma.’ (Abụ Ọma 119:66) Pọl gwara ndị kwere ekwe ibe ya nọ na Rom, sị: “E mewo ka mụ onwe m kwetakwa banyere unu, ụmụnna m, na unu onwe unu jupụtakwara n’ịdị mma, ebe e meworo ka unu jupụta n’ihe ọmụma nile.” (Ndị Rom 15:14) Okenye ọgbakọ aghagị ịbụ “onye hụrụ ezi ihe n’anya.” (Taịtọs 1:7, 8) Ọ bụrụ na mmụọ nsọ Chineke na-eduzi anyị, a ga-eji ịdị mma mara anyị, Jehova ‘ga-echetakwa anyị n’ihi ezi ihe anyị meworo.’—Nehemaịa 5:19; 13:31.
‘Okwukwe Na-enweghị Ihu Abụọ’
19. Kọwaa ihe okwukwe bụ dị ka e si kwuo ya ná Ndị Hibru 11:1.
19 Okwukwe—nke so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ—“bụ atụmanya e ji n’aka nke ihe ndị a na-ele anya ha, ngosipụta pụtara ìhè nke ihe ndị bụ ezie n’agbanyeghị na a dịghị ahụ ha anya.” (Ndị Hibru 11:1) Ọ bụrụ na anyị nwere okwukwe, anyị ga-ejide n’aka na ihe nile Jehova kwere ná nkwa ga-emezurịrị. Ihe àmà ndị na-egosi na ihe ahụ a na-adịghị ahụ anya dị adị siri nnọọ ike nke na e kwuru na okwukwe bụ ihe àmà ahụ. Dị ka ihe atụ, ihe e kere eke ndị anyị na-ahụ anya na-eme ka anyị kwenyesie ike na e nwere Onye Okike. Nke ahụ bụ ụdị okwukwe anyị ga-egosipụta ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-eje ije site na mmụọ nsọ.
20. Gịnị bụ “mmehie ahụ nke na-ekegide anyị n’ụzọ dị mfe,” oleekwa otú anyị pụrụ isi zere ya na ọrụ nile nke anụ ahụ́?
20 Enweghị okwukwe bụ “mmehie ahụ nke na-ekegide anyị n’ụzọ dị mfe.” (Ndị Hibru 12:1) Ọ dị anyị mkpa ịdabere na mmụọ Chineke iji zere ọrụ nile nke anụ ahụ́, ịhụ ihe onwunwe n’anya, na ozizi ụgha ndị pụrụ imebi okwukwe. (Ndị Kọlọsi 2:8; 1 Timoti 6:9, 10; 2 Timoti 4:3-5) Mmụọ Chineke na-amịpụta n’ime ndị ohu Jehova nke oge a okwukwe yiri nke ndị àmà dịrị ndụ tupu oge Ndị Kraịst nakwa ndị ọzọ a kọrọ akụkọ ha na Bible. (Ndị Hibru 11:2-40) ‘Okwukwe na-enweghị ihu abụọ’ anyị nwere pụkwara iwusi nnọọ okwukwe nke ndị ọzọ ike.—1 Timoti 1:5; Ndị Hibru 13:7.
Na-egosipụta Ịdị Nwayọọ na Njide Onwe Onye
21, 22. Olee otú e si kọwaa ịdị nwayọọ, n’ihi gịnịkwa ka anyị kwesịrị iji na-egosipụta ya?
21 Ịdị nwayọọ bụ ịdị obi umeala. Otu n’ime àgwà ndị Chineke nwere bụ ịdị nwayọọ n’obi. Otú anyị si mara nke a bụ na Jizọs, bụ́ nwoke dị nwayọọ n’obi, gosipụtara àgwà Jehova n’ụzọ zuru okè. (Matiu 11:28-30; Jọn 1:18; 5:19) Oleezi ihe a chọrọ ka anyị na-eme dị ka ndị ohu Chineke?
22 Dị ka Ndị Kraịst, ihe a chọrọ ka anyị na-eme bụ ‘igosi ịdị nwayọọ n’ebe mmadụ nile nọ.’ (Taịtọs 3:2) Anyị na-egosipụta ịdị nwayọọ n’ozi anyị. E nyere ndị ruru eru n’ụzọ ime mmụọ ndụmọdụ ka ha jiri “mmụọ nke ịdị nwayọọ” na-agbazi Ndị Kraịst na-azọhie ụkwụ. (Ndị Galeshia 6:1) Anyị nile pụrụ ịkwalite udo na ịdị n’otu nke Ndị Kraịst site n’ịdị na-egosipụta ‘ịdị umeala n’obi na ịdị nwayọọ.’ (Ndị Efesọs 4:1-3) Anyị pụrụ igosipụta ịdị nwayọọ ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-eje ije site na mmụọ nsọ ma na-enwe njide onwe onye.
23, 24. Gịnị bụ njide onwe onye, oleekwa otú o si enyere anyị aka?
23 Njide onwe onye na-enyere anyị aka ịchịkwa echiche, okwu, na omume anyị. Jehova ‘jisiri onwe ya ike [nọgidere na-enwe njide onwe onye]’ mgbe ọ na-emeso ndị Babilọn ahụ bibiri Jeruselem ihe. (Aịsaịa 42:14) Ọkpara ya ‘hapụụrụ anyị ihe nlereanya’ site n’inwe njide onwe onye mgbe ọ na-ata ahụhụ. Pita onyeozi nyekwara Ndị Kraịst ibe ya ndụmọdụ ka ha ‘tụkwasị n’ihe ọmụma ha njide onwe onye.’—1 Pita 2:21-23; 2 Pita 1:5-8.
24 A na-atụ ndị okenye ọgbakọ anya n’aka ka ha na-enwe njide onwe onye. (Taịtọs 1:7, 8) N’ezie, ndị nile mmụọ nsọ na-eduzi pụrụ inwe njide onwe onye, ọ pụkwara ime ka ha zere omume rụrụ arụ, okwu rere ure, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ nwere ike ime ka ihe ha ghara ịdị Jehova mma. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka mmụọ Chineke mipụta njide onwe onye n’ime anyị, ndị ọzọ ga-ahụ nke a n’okwu na n’àgwà anyị ndị na-ewetara Chineke nsọpụrụ.
Nọgide Na-eje Ije Site na Mmụọ Nsọ
25, 26. Olee otú ije ije site na mmụọ nsọ si emetụta mmekọrịta anyị ugbu a nakwa ọdịnihu anyị?
25 Ọ bụrụ na anyị na-eje ije site na mmụọ nsọ, anyị ga-abụ ndị nkwusa Alaeze na-anụ ọkụ n’obi. (Ọrụ 18:24-26) Anyị ga-abụ ezi ndị enyi, ndị na-atụ egwu Chineke ga-enwekwa nnọọ mmasị ịkpakwute anyị. Dị ka ndị mmụọ nsọ na-eduzi, anyị ga na-agbakwa ndị anyị na ha na-efe Jehova ume. (Ndị Filipaị 2:1-4) Nke ahụ ọ́ bụghị ihe Ndị Kraịst nile ga-achọ ịbụ?
26 Ọ dịghị mfe ije ije site na mmụọ nsọ n’ụwa a Setan na-achị. (1 Jọn 5:19) N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ nde mmadụ na-eme nke ahụ taa. Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi anyị nile, anyị ga-anụ ụtọ ndụ ugbu a, nweekwa ike ịnọgide na-eje ije ruo mgbe ebighị ebi n’okporo ụzọ ezi omume nke Onye ahụ ji ịhụnanya na-enye anyị mmụọ nsọ ya.—Abụ Ọma 128:1; Ilu 3:5, 6.
Gịnị Ka Ị Ga-aza?
• Olee otú “ije ije site na mmụọ nsọ” si emetụta mmekọrịta anyị na Chineke na Ọkpara ya?
• Olee àgwà ndị mejupụtara mkpụrụ nke mmụọ nsọ?
• Olee ụzọ ụfọdụ a pụrụ isi gosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke?
• Olee otú ije ije site na mmụọ nsọ si emetụta ndụ anyị ugbu a nakwa ọdịnihu anyị?
[Foto dị na peeji nke 23]
Mmụọ nsọ Jehova na-akpali anyị ịhụ ndị kwere ekwe ibe anyị n’anya
[Foto dị na peeji nke 24]
Na-egosi obiọma site n’okwu ọma na ịrụ ezi ọrụ