Ụzọ Dị Iche Iche Ndị Mmadụ Si Agbalị Igbo Mkpa Ime Mmụọ Ha
N’OZIZI Elu Ugwu ya ahụ a ma ama, Jizọs kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa nke ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3) Eleghị anya i kweere n’ihe a o kwuru. Ndị mmadụ n’ebe nile kweere na ọ dị mkpa mmadụ iji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, kwerekwa na ọ bụrụ na mmadụ ejisie ike gboo mkpa ime mmụọ ya, na onye ahụ ga-enwe obi ụtọ. Ma gịnị ka iji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe pụtara?
Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kọwara onye ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe dị ka ‘onye na-ejighị okpukpe ya egwuri egwu ma ọ bụ onye na-adịghị eji ihe ndị metụtara Chineke egwuri egwu.’ N’ihi ya, ‘ihe ime mmụọ,’ ‘mmadụ ịma mkpa ime mmụọ ya,’ ma ọ bụ ‘mmadụ iji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe’ bụ okwu ndị yiri ibe ha. Ya bụ na a na-ewere onye na-etinye uche n’ihe ndị metụtara Chineke dị ka onye ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe.
Oleezi otú mmadụ si aghọ onye ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe n’ezie? N’ezie, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ okpukpe nile na-ekwu na ha maara ụzọ isi nyere ndị mmadụ aka igbo mkpa ime mmụọ ha, aro ndị ha na-atụ karịkwara akarị. Onye Protestant na-ekwu na ọ bụ site n’ịga mgbakọ chọọchị ya na-enwe ga-eme ka a zọpụta ya. Onye Katọlik na-ekwu na ọ bụ site n’ịnara oriri nsọ n’oge a na-edo Mas. Onye Buddha sị na ọ bụ site n’ịtụgharị uche n’ihi na ọ bụ nke a ga-eme ka ya nwetakwuo ihe ọmụma. Onye Hindu sị na ọ bụ site n’ịnapụ onwe ya ihe ndị na-amasị ya ga-eme ka ya ghara ịlọ ụwa ugboro ugboro. Ihe a nile ha na-ekwu, ọ̀ bụ ụzọ mmadụ ga-esi gboo mkpa ime mmụọ ya? Ọ̀ dị nke n’ime ha bụ́ ụzọ mmadụ na Chineke ga-esi adị ná mma?
Ọtụtụ ndị ga-aza ee e ma a jụọ ha ajụjụ ndị a. Ha kweere na mmadụ iji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe pụtara onye ahụ ikwere na Chineke dị ma ò nwere chọọchị o so na ya ma ọ bụ na o nweghị. Ndị ọzọ na-ekwu na mmadụ iji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe apụtaghị mmadụ isonyere okpukpe ọ bụla kama ọ bụ mmadụ ịchọ otú ọ ga-esi na-enwe obi iru ala, nakwa onye ahụ ịmata ebe ndụ ya na-eche ihu. Ha na-ekwu na ọ dịghịdị mkpa ka ndị chọrọ ka ha na Chineke dị ná mma legara okpukpe ọ bụla anya. Kama ilegara okpukpe anya, ha na-ekwu na ihe ka mkpa bụ mmadụ ileru onwe ya anya, lekwasị anya n’otú obi ya dị n’ebe Chineke nọ. Otu onye na-ede akwụkwọ dere, sị: “Mmadụ na Chineke ịdị ná mma bụ ihe dị onye ahụ n’obi. Ọ bụ otú i si ahụ ụwa na ndị bi n’ime ya n’anya, ọ bụ ụzọ i si anabata ndị nọ n’ụwa na ụzọ gị na ha si emekọrịta ihe. Ọ bụghị ihe a na-enweta site n’ịga chọọchị ma ọ bụ site n’ikwenye n’ozizi ụfọdụ.”
N’ezie, otú ndị mmadụ si aghọta ihe mmadụ ná Chineke ịdị ná mma pụtara dị iche iche. E bipụtala ọtụtụ puku akwụkwọ na-ekwu na ha ga-enyere ndị mmadụ aka mee ka ha na Chineke dị ná mma. Ma ọtụtụ mgbe ndị na-agụ ha adịghị enweta ihe ha chọrọ, kama ha na-anọ n’enweghị afọ ojuju nakwa n’amaghị nke ha ga-eme eme. Ma, e nwere otu akwụkwọ na-enye ntụziaka dị nnọọ mma banyere otú mmadụ na Chineke ga-esi dị ná mma. Ọ bụ akwụkwọ kwuru na e ji ike mmụọ nsọ Chineke dee ya. (2 Timoti 3:16) Ka anyị tụlee ihe akwụkwọ ahụ, bụ́ Bible, kwuru banyere ihe mmadụ iji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe pụtara na uru ime otú ahụ bara.
[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 2]
FOTO DỊ N’IHU AKWỤKWỌ: E wezụga nwanyị ahụ: © Mark Hamblin/age fotostock