Maka Ndị Na-eto Eto
Jizọs Gwọrọ Ndị Mmadụ Ọrịa
Otú ị ga-esi mee ya: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ ebe ndị ahụ a chọrọ ka ị gụọ n’Akwụkwọ Nsọ, were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ ị na-agụ mere. Jiri anya nke uche gị kirie ebe ihe ahụ mere. Nụrụ olu ndị ahụ ị na-agụ banyere ha. Ka ihe ị na-agụ yie gị ka ọ̀ na-eme eme ugbu a.
CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ MATIU 15:21-28.
Olee otú i chere obi dị mama nwatakịrị ahụ?
․․․․․
Olee ụdị olu ị “nụrụ” Jizọs ji kwuo ihe ndị dị n’amaokwu ndị sonụ?
24 ․․․․․ 26 ․․․․․ 28 ․․․․․
LEBAKWUO YA ANYA.
Ugboro ole ka Jizọs gosiri n’okwu ọnụ na n’omume na ya agaghị agwọ nwa nwaanyị ahụ?
․․․․․
Gịnị mere na Jizọs achọghị ịgwọ nwa ahụ ná mmalite?
․․․․․
Gịnị mere Jizọs ji mechaa gwọọ ya?
․․․․․
TINYE IHE Ị MỤTARA N’ỌRỤ. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE . . .
Ezi uche Jizọs nwere.
․․․․․
Otú i nwere ike isi ṅomie agwa a mgbe gị na ndị ọzọ na-emekọrịta ihe.
․․․․․
CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ MAK 8:22-25.
Olee ihe ndị na-eme n’ime obodo ahụ nakwa ná mpụta ya i nwere ike iji anya nke uche gị hụ, jirikwa ntị gị nụ?
․․․․․
LEBAKWUO YA ANYA.
Gịnị ka i chere mere Jizọs ji kpọrọ nwoke ahụ pụọ n’obodo ahụ tupu ya agwọọ ya?
․․․․․
TINYE IHE Ị MỤTARA N’ỌRỤ. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE . . .
Otú obi dị Jizọs mgbe ọ hụrụ nwoke ahụ nwere nkwarụ, ọ bụ ezie na ya onwe ya enwetụbeghị nkwarụ.
․․․․․
OLEE IHE KACHA METỤ GỊ N’AHỤ́ N’AKỤKỌ ABỤỌ A A KỌRỌ NA BAỊBỤL, N’IHI GỊNỊKWA?
․․․․․