Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w08 10/1 p. 26
  • Ịgbanye Anya Mmiri n’Ime Karama Akpụkpọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịgbanye Anya Mmiri n’Ime Karama Akpụkpọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ahụ́ Agwọ
    Teta!—2014
  • Jehova Agụwo “Ntutu Nile nke Isi Unu Ọnụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ka Otú Ahụ́ Gị Na-acha Dị Gị Mma
    Teta!—2010
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
w08 10/1 p. 26

Ịgbanye Anya Mmiri n’Ime Karama Akpụkpọ

OTU nwa okorobịa nọ na-agba ọsọ ndụ. Ike gwụrụ ya, mwute jukwara ya obi, anya mmiri nọkwa na-agụsị ya n’anya, ya ewee rịọ Chineke, bụ́ Jehova, ka o meere ya ebere ma nwee ọmịiko n’ahụ́ ya, sị: “Gbanye anya mmiri m n’ime karama akpụkpọ gị.” (Abụ Ọma 56:8) Nwa okorobịa ahụ bụ Devid, bụ́ onye mechara bụrụ eze Izrel. Ma, gịnị ka karama akpụkpọ ahụ o kwuru okwu ya bụ? Oleekwa otú Chineke ga-esi gbanye anya mmiri anyị n’ime karama akpụkpọ?

Devid maara ihe karama akpụkpọ bụ. Ọ bụ ihe e ji agbanye mmiri, mmanụ, mmanya, ma ọ bụkwanụ bọta. Ndị na-akwagharị akwagharị na Sahara, dị ka ndị Tuareg, ka na-agbanye mmiri n’ime karama akpụkpọ ewu ma ọ bụ nke atụrụ. E nwere ike ịgbanye mmiri dị ukwuu n’ime otu karama ndị ahụ, dabere n’otú anụ e si nweta akpụkpọ anụ ahụ hà. Ọ bụ ihe a ma ama na karama akpụkpọ na-ajụ mmiri oyi, ọbụna mgbe anwụ na-achasi ike n’ọzara. Ọ bụ ịnyịnya ibu ma ọ bụ kamel ka a na-ejikarị ebu ya n’oge ochie. N’oge a, mmadụ nwere ike ịhụ karama akpụkpọ e kegidere n’ihu ụgbọala ndị na-agba n’ọzara!

Ihe a na-emetụ n’ahụ́ Devid kwuru banyere karama akpụkpọ bakwaara anyị onwe anyị uru. Olee otú o si baara anyị uru? Baịbụl kwuru na ọ bụ Setan na-achị ụwa a, kwuokwa na “ọ na-ewe oké iwe” n’oge anyị a. Ọ bụ ya mere e ji nwee nsogbu ọjọọ dị iche iche n’ụwa. (Mkpughe 12:12) Ọ bụkwa ya mere nsogbu ji abịara ọtụtụ ndị, dị ka ọ bịaara Devid, karịchaa, ndị na-agbalị ime ihe dị Chineke mma, ma ọ́ bụghị nsogbu ndị na-akpatara ha nchekasị, ya abụrụ ndị nke na-enye ha nsogbu n’ahụ́. Ị̀ na-enwe ụdị nsogbu a? Ọ bụ eziokwu na ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nwere ike “na-akwa ákwá,” ha na-eguzosi ike n’ezi ihe n’ihi obi ike ha nwere. (Abụ Ọma 126:6) Ha ga-ejide n’aka na Nna ha nke bi n’eluigwe na-ahụ ọnwụnwa niile na-abịara ha, na-ahụkwa otú o si enye ha nsogbu n’obi. N’eziokwu, ọ maara ihe mgbu niile na-abịara ndị ohu ya, ọmịiko o nwere n’ebe ha nọ na-emekwa ka ọ na-echeta anya mmiri ha na ahụhụ ha na-ata. N’ụzọ ihe atụ, ọ na-agbanye ha niile na karama akpụkpọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya