Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w09 2/1 p. 5
  • Ò Nwere Otu Onye Dị Adị Bụ́ Chineke?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ò Nwere Otu Onye Dị Adị Bụ́ Chineke?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chineke Ọ̀ Nọ Ebe Nile?
    Teta!—2005
  • Ònye Bụ Chineke?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Mmụọ Nsọ Ọ̀ Bụ Onye?
    Teta!—2006
  • Chineke Ọ̀ Nọ Ebe Niile?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
w09 2/1 p. 5

Ò Nwere Otu Onye Dị Adị Bụ́ Chineke?

Ihe ndị mmadụ na-azakarị:

◼ “Ọ nọ ebe niile. Ọ nọ n’ihe niile. Ọ dị ka ifufe.”

◼ “Ọ bụ ihe nwere ọgụgụ isi anyị na-enweghị ike ịkọwa akọwa, ike nkịtị a na-adịghị ahụ anya.”

Olee ihe Jizọs kwuru?

◼ “N’ụlọ Nna m, ọtụtụ ebe obibi dị.” (Jọn 14:2) Jizọs kwuru na Chineke nwere ebe e nwere ike ịkpọ ụlọ, ma ọ bụ ebe obibi.

◼ “Esi m n’ebe Nna m nọ bịa, abịawokwa m n’ụwa. Ana m ahapụkwa ụwa, ana m alakwuru Nna m.” (Jọn 16:28) Jizọs kweere na Chineke bụ Onye dị adị nke nwere otu ebe o bi.

O NWEGHỊ mgbe Jizọs kwuru na Chineke bụ ike nkịtị a na-anaghị ahụ anya. Kama nke ahụ, ọ gwara Chineke okwu, kpekuokwa ya ekpere. Ọtụtụ mgbe, ọ kpọrọ Jehova Nna ya nke bi n’eluigwe, bụ́ nke na-egosi na ya na Chineke dị n’ezigbo mma.—Jọn 8:19, 38, 54.

N’eziokwu, “ọ dịghị mmadụ hụtụrụla Chineke mgbe ọ bụla,” ‘Chineke bụkwa Mmụọ.’ (Jọn 1:18; 4:24) Ma, nke a apụtaghị na o nweghị ahụ́ ma ọ bụ ọdịdị. Baịbụl gwara anyị, sị: “Ọ bụrụ na e nwere anụ ahụ́, e nwekwara ahụ́ nke mmụọ.” (1 Ndị Kọrịnt 15:44) Jehova ò nwerenụ ahụ́ mmụọ?

Ee. Mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, “ọ banyere n’ime eluigwe, ka o wee pụta ugbu a n’ihu Chineke n’onwe ya maka anyị.” (Ndị Hibru 9:24) Nke a na-akụziri anyị ihe abụọ dị mkpa banyere Chineke. Nke mbụ bụ na o nwere ebe o bi. Nke abụọ abụrụ na ọ bụ Onye dị adị, ọ bụghị ike nkịtị a na-enweghị ike ịkọwa akọwa nke dị n’ebe niile.

Oleezi otú ike Chineke si eru ebe niile? Chineke nwere ike ime ka mmụọ nsọ ya, ma ọ bụ ike ya nọ n’ọrụ, gaa n’ebe ọ bụla n’eluigwe na n’ụwa. Chineke na-eji mmụọ nsọ ya emezu nzube ya otú nna na-amatị aka ya kasie ụmụ ya obi ma ọ bụ nyere ha aka.—Abụ Ọma 104:30; 139:7.

Ebe Chineke bụ Onye dị adị, o nwekwara ihe ndị na-amasị ya na ihe ndị na-anaghị amasị ya, ihe na-emetụkwa ya n’ahụ́. Baịbụl gwara anyị na ọ hụrụ ndị ya n’anya, ọrụ ndị ọ rụrụ na-eme ya obi ụtọ, ọ kpọrọ ikpere arụsị asị, omume ọjọọ na-ewutekwa ya. (Jenesis 6:6; Diuterọnọmi 16:22; 1 Ndị Eze 10:9; Abụ Ọma 104:31) Na 1 Timoti 1:11, a kpọrọ ya “Chineke bụ́ onye obi ụtọ.” Ka a sịkwa ihe mere Jizọs ji kwuo na anyị nwere ike iji obi anyị dum hụ Chineke anyị a n’anya!—Mak 12:30.a

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere ya, gụọ isi 1 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke di na peeji nke 5]

Chineke na-eji mmụọ nsọ ya emezu nzube ya otú nna na-amatị aka ya kasie ụmụ ya obi ma ọ bụ nyere ha aka

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya