Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w09 5/15 p. 18
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • A Mụwo Alaeze Chineke!
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Ndị Ọchịchị n’Ógbè Ndị Bụ Mmụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Na-eche Nche, Setan Chọrọ Iripịa Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Mara Onye Iro Gị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
w09 5/15 p. 18

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee mgbe e si n’eluigwe chụdata Setan n’ụwa?—Mkpu. 12:1-9.

Ọ bụ ezie na akwụkwọ Mkpughe ekwughị kpọmkwem mgbe a chụdatara Setan n’ụwa, ma, o kwuru ọtụtụ ihe ndị merenụ, bụ́ ndị ga-enyere anyị aka ịmata mgbe a chụdatara ya. Nke mbụ n’ime ihe ndị ahụ mere bụ ọmụmụ a mụrụ Alaeze Mesaya. Mgbe nke ahụ gachara, ‘agha dara n’eluigwe,’ bụ́ nke e ji merie Setan wee si n’eluigwe chụdata ya n’ụwa.

Akwụkwọ Nsọ mere ka o doo anya na ọ bụ n’afọ 1914 ka oge a kara aka nke “ndị mba ọzọ” gwụrụ, e wee guzobe Alaeze Chineke.a (Luk 21:24) Mgbe nke ahụ gachara, ọnwa ole gafere tupu agha ahụ adaa n’eluigwe, bụ́ nke e ji chụpụ Setan n’eluigwe?

Mkpughe 12:4 kwuru, sị: “Dragọn ahụ [ya bụ, Setan] guzokwa n’ihu nwaanyị ahụ nke na-aga ịmụ nwa, ka o wee ripịa nwa ya mgbe ọ mụrụ ya.” Nke a na-egosi na Setan chọrọ ịla Alaeze ahụ a mụrụ ọhụrụ n’iyi ozugbo e guzobere ya, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe ya mee. N’agbanyeghị na ihe Jehova mere mere ka Setan ghara imezu nzube ọjọọ ya, o kpebisiri ike ịla Alaeze ahụ Chineke guzobere ọhụrụ n’iyi. Ọ bụ ya mere “Maịkel na ndị mmụọ ozi ya” ji mee ngwa ngwa chụpụ “dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya” n’eluigwe ka ha ghara ịla Alaeze ahụ n’iyi. Nke a na-egosi na n’oge na-adịghị anya mgbe e guzobechara Alaeze ahụ n’afọ 1914, e meriri Setan ma chụdata ya n’ụwa.

Ihe ọzọ anyị ga-atụle bụ mbilite n’ọnwụ nke Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ nke Akwụkwọ Nsọ gosiri na ọ malitere ka obere oge gafere mgbe e guzobechara Alaeze ahụ.b (Mkpu. 20:6) Ebe ọ bụ na ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ụmụnna Jizọs, bụ́ ndị e tere mmanụ, e kwuru na o so Jizọs lụso dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya agha, ọ ghaghị ịbụ na a lụchaala agha ahụ n’eluigwe ma chụdata Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya tupu a kpọlitewe ụmụnna Kraịst n’ọnwụ.

Ya mere, Baịbụl ekwughị kpọmkwem mgbe e si n’eluigwe chụdata Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’ụwa. Ma, o doro anya na a chụdatara ha ka obere oge gafere mgbe e mechara Jizọs Kraịst eze n’eluigwe n’afọ 1914.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? peeji nke 215-218.

b Gụọ Ụlọ Nche nke January 1, 2007, peeji nke 27-28, paragraf nke 9-13.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya