Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w10 1/1 p. 3
  • “Naanị Otu Iko Mmanya”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Naanị Otu Iko Mmanya”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ile Mmanya Na-aba n’Anya anya Otú Kwesịrị Ekwesị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Olee Ihe Baịbụl Kwuru Gbasara Mmanya Na-aba n’Anya?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Nọgide Na-enwe Echiche Ziri Ezi Banyere Iji Ihe Ọṅụṅụ Na-aba n’Anya Eme Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Mmetụta Ịṅụ Mmanya Na-aba n’Anya n’Ụzọ Na-adịghị Mma Na-enwe n’Ahụ́
    Teta!—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
w10 1/1 p. 3

“Naanị Otu Iko Mmanya”

ALEN malitere ịṅụbiga mmanya na-aba n’anya ókè mgbe ọ dị afọ iri na otu.a Ya na ndị enyi ya na-egwuri egwu n’ọhịa, na-ejije ndị ha na-ahụ na fim. Ndị ahụ Alen na ndị enyi ya na-ejije bụ ndị na-eme ihe egwuregwu, ma, mmanya ahụ ha na-aṅụ abụghị mmanya egwuregwu.

Toni dị afọ iri anọ mgbe o ji nwayọọ nwayọọ si n’ịṅụ otu iko mmanya ma ọ bụ abụọ kwa mgbede gaa n’ịṅụ iko ise ma ọ bụ isii. Ka oge na-aga, ọ naghịzi agụtali iko mmanya ole ọ na-aṅụ n’ụbọchị.

Alen chọwara enyemaka maka nsogbu mmanya ya. Toni ekweghị ka ndị ikwu na ibe ya ihe banyere ya na-emetụ n’obi nyere ya aka. Alen dị ndụ taa ịkọ ihe mere ya; Toni nwụrụ afọ ole na ole gara aga n’ihe mberede ụgbọala mgbe ọ ṅụbigachara mmanya ókè.

Ya bụrụgodị na mmadụ na-aṅụbiga mmanya ókè mgbe naanị ya nọ, ọ na-emetụtarịrị ndụ ndị ọzọ, mgbe mgbe, na-akpatara ha oké nsogbu.b Ịṅụbiga mmanya ókè na-esokarị akpata ikwu okwu ọjọọ na iti ihe, ime ihe ike na igbu ọchụ, ihe mberede ụgbọala na inwe mmerụ ahụ́ n’ebe ọrụ, nakwa ọtụtụ ọrịa ndị ọzọ. Ịṅụbiga mmanya ókè na-efu ụmụ mmadụ ọtụtụ ijeri naịra kwa afọ, n’agụnyeghị obi mgbawa ọ na-akpatara ndị mmadụ n’otu n’otu, ezinụlọ dị iche iche, na ụmụaka.

N’agbanyeghị nke ahụ, Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike nke Mba Yunaịted Stets kwuru na “ọ bụghị onye ọ bụla na-aṅụ mmanya mgbe niile nwere nsogbu mmanya, ọ bụghịkwa ndị niile nwere nsogbu mmanya na-aṅụ mmanya kwa ụbọchị.” Ọtụtụ ndị na-abụghị ndị aṅụrụma amalitela ịṅụbiga mmanya ókè n’amaghị ama. Ndị ọzọ na-aṅụ mmanya naanị mgbe ụfọdụ, ma ha na-aṅụ ihe karịrị iko ise n’otu oge.

Ọ bụrụ na i kpebie ịṅụ mmanya na-aba n’anya, iko ole ka ị ga-aṅụ, ya abụrụ na ị ṅụbigala ya ókè? Olee otú i nwere ike isi mara mgbe ị ga-ajụ ịṅụkwu “naanị otu iko mmanya”? (Ilu 23:29, 30, Contemporary English Version) Isiokwu ndị na-esonụ ga-atụle ihe ndị ga-enyere anyị aka n’okwu a.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

b Ọ bụ ezie na ọnụ ọgụgụ ụmụ nwoke ndị nwere ike ịghọ ndị aṅụrụma ji okpukpu anọ karịa nke ụmụ nwaanyị, ihe e kwuru n’isiokwu ndị a metụtara ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya