Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w10 3/1 p. 16-17
  • Nkume Kọral Dị n’Urukpuru

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nkume Kọral Dị n’Urukpuru
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Anyị Kpebisiri Ike Ijezu Ozi Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
w10 3/1 p. 16-17

Akwụkwọ Ozi Si Papiuwa Niu Gini

Nkume Kọral Dị n’Urukpuru

Ọ KỤỌLA elekere ise n’otu ụtụtụ Tuzdee okpomọkụ dị na Lae, Papiuwa Niu Gini (PNG). Mụ na nwunye m na-akwado ịga obodo Lengbati, n’elu Ugwu Rọlịnsịn dị n’Ógbè Morobe, ileta otu ìgwè Ndịàmà Jehova bi ebe ahụ.

Njem anyị were anyị naanị ihe dị ka iri nkeji atọ n’ime ụgbọelu na-ebu mmadụ anọ nke nwere otu njin. N’ụdị njem a, m na-anọkarị n’akụkụ ọkwọ ụgbọelu, ka njin ụgbọelu ahụ na-emekwa nnọọ ụzụ, mụ na ya na-eji telefon a na-ekpu n’isi dị n’ime ụgbọelu ahụ akparịta ụka. Ọkwọ ụgbọelu ahụ nọ na-atụrụ m aka n’ihe dị iche iche dị n’ihu ụgbọelu ahụ ma na-akọwara m ihe ha na-arụ, jirikwa egwuregwu sị m na ọ bụrụ na ihe emee ya, ọ bụ m ga-akwọwazi ụgbọelu ahụ. Ozugbo ahụ, echetara m ihe mere Onyeàmà Jehova na-ejegharị ejegharị nke na-eje ozi ebe a na PNG. Mgbe ọkwọ ụgbọelu ha tụbọrọ na njem ha, ụgbọelu ha malitere ifegharị nnọọ gburugburu n’ihi na e tinyere ya n’ebe ọ ga-eji aka ya na-efegharị, o fegharịgidekwara ruo mgbe ọkwọ ụgbọelu ha nwetaghachiri onwe ya ma nwee ike ifeda. Obi dị m ụtọ na ọ dịghị ihe ọjọọ mere na njem nke anyị.

Anyị nọ na-efe n’akụkụ ugwu ndị kwụ n’ahịrị, na mberede, anyị banyeziri n’urukpuru ma fefee elu ugwu ndị ahụ. Ọnụ ọnụ ugwu ndị ahụ dịkwa ihe dị ka naanị otu narị mita n’okpuru ụgbọelu anyị. Anyị nọ na-ele obodo Lengbati anya n’ihu anyị, bụ́ ebe e nwere ụlọ ndị dịkọtara ọnụ e ji ihe ndị e wetara n’ọhịa rụọ ma jiri ahịhịa ndị siri ike kpuchie elu ha. Ọkwọ ụgbọelu anyị ledara anya n’okporo ụzọ ebe ụgbọelu na-ada, jiri anya na-ele otú ọ dị na iji hụ na ụmụaka obodo ahụ anaghị agba bọl na ya. Ọ nọkwa na-ele ma ézì ò gwuola olulu na ya kemgbe oge ikpeazụ ọ bịara ebe ahụ. Ka ọ na-alaghachi n’agbata ugwu anyị si pụta, o kwuru, sị, “Ọ dị ka ebe ahụ ọ̀ dị mma; anyị ga-anwa ifeda.” Anyị gbara gburugburu ma feda n’okporo ụzọ ahụ na-adịghị ogologo, bụ́ nke ndị obodo ahụ wara n’akụkụ ugwu, bụ́kwa nke ha ka wụghachiri nkume laịm a kụrisịrị akụrisị ha gwutere n’ugwu dị nso n’ebe ahụ.

N’oge ndị anyị bịarala ebe a, elere m nkume laịm ndị ahụ a kụrisịrị akụrisị anya ma na-eche afọ ole ugwu ndị ahụ kwụ n’ahịrị dị n’ezie. Chegodị echiche ụdị ikike nwere ike ịkwapụta ugwu a dịbu n’ala ala mmiri ma mee ka ọ ghọọ ugwu dị ọtụtụ narị kilomita n’ogologo ma dị kilomita anọ n’elu osimiri! Mgbe anyị si n’ụgbọelu ahụ pụta, anyị guzo n’ebe m na-akpọ nkume kọral dị n’urukpuru.

Dị ka ndị obodo ahụ na-eme mgbe ọ bụla ha nụrụ ụda ụgbọelu, ha si ebe niile gbara bịa. Ka ọkwọ ụgbọelu anyị gbanyụrụ ụgbọelu ahụ, ahụrụ m otu nwoke si n’ìgwè mmadụ ahụ pụta ma gara bịawa n’ebe ụgbọelu anyị dị. Ọ bụ Zung. Ọ bụ otu n’ime ndị e nyere ọrụ ịkụzi ihe n’ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova bi n’ógbè ahụ na-enwe kwa izu. Ndị obodo ya makwaara ya dị ka onye na-ebi ezigbo ndụ, na-ekwu eziokwu ma kwesị ntụkwasị obi. O kwuru na ọ bụ iso ụkpụrụ Baịbụl mere ya ji biwe ndụ otú ahụ. Mgbe anyị kelechara ma kwechaa n’aka, anyị na Zung na Ndịàmà ndị ọzọ so gbadatatụ n’ugwu ahụ. Ụmụaka sooro anyị n’azụ, na-arụrịta nnọọ ụka onye n’ime ha ga-ebutere anyị akpa anyị nya n’azụ.

Anyị rutere n’obere ụlọ osisi Ndịàmà bi ebe ahụ rụrụ maka onye ozi na-ejegharị ejegharị, bụ́ ebe ọ ga na-ebi mgbe ọ bịara ebe ahụ ihe dị ka kwa ọnwa isii. Ọ bụ ezie na PNG bụ obodo dị n’ebe okpomọkụ, ebe a na-ajụ nnọọ oyi n’ihi na ọ dị n’elu ugwu. N’abalị, mgbe anyị mụnyere ihe ọkụ anyị, m na-ahụkarị urukpuru—bụ́ nke na-eji nwayọọ nwayọọ si na ndagwurugwu na-akwụgo n’elu ugwu ahụ n’ehihie—ka o si n’oghere ndị dị n’agbata osisi ndị e ji kụchie ala ụlọ ebe anyị bi na-abata n’ime ụlọ. Ọ bụ ihe ijuanya na anyị yizi uwe oyi ebe ọ bụkwanụ na awa ole na ole gara aga, okpomọkụ nọ na-egbu anyị mgbe anyị nọ n’ụsọ oké osimiri.

N’ihe dị ka afọ 1985, otu nwoke si n’obodo a na Ndịàmà Jehova mụrụ Baịbụl na Lae. Mgbe ọ lọghachiri n’obodo ya ebe a, ya na mmadụ ole na ole ndị ọzọ rụrụ otu obere ụlọ ọmụmụ ihe, bụ́ nke ha ji nnọọ eme ọnụ. Pastọ chọọchị Luta dị n’ebe a na ndị chọọchị ya gbara ya ọkụ. Ndị ahụ gbara ya ọkụ nọ na-etu ọnụ na ebe a bụ ógbè ndị chọọchị Luta. Kemgbe ahụ, n’agbanyeghị mmegide a nọgidere na-emegide Ndịàmà ahụ, ha arụọla ebe ọzọ ha na-anọ amụ ihe, ha amụbaakwala ruo iri ndị nkwusa ise na-ekwusachi ozi ọma anya. Ụfọdụ ndị megideburu ọrụ Ndịàmà jizi ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ya n’onwe ha.

Ugbu a ndị obodo ahụ na-anabatakarị Ndịàmà Jehova na nke ha, bụ́ ndị na-eji Baịbụl akụziri ha ihe. Ọ bụ ezie na ọ bụ naanị mmadụ ole na ole bi n’obodo a maara otú e si agụ ihe, ihe ka ọtụtụ ná Ndịàmà Jehova amụtala ịgụ ihe iji nwee ike izi ndị ọzọ ozi Baịbụl. Ihe ruru nnọọ narị mmadụ abụọ na-abịa ọmụmụ ihe a na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha kwa izu.

E nweghị ọkụ eletrik ebe a. Ná mgbede, anyị niile na-anọ gburugburu ọkụ a kwanyere n’ụlọ isi nri. Anyị niile na-erikọta ihe, na-ekwurịta okwu ma na-achị ọchị. Anyị na-ahụ ọṅụ ndị enyi anyị nwere n’ife Jehova n’ihu ha, ka anyị ji ìhè ọkụ ekwú ahụ na-ele ha anya n’ihu. Nwayọọ nwayọọ, ka chi na-ejikwu, ụfọdụ na-alọpụtazi aka igu ha sonyere n’ọkụ, bụ́ nke ha na-ebu n’obi na ha ga-ejili ya hụ ụzọ gbara ọsọ si n’ụzọ ọhịa ndị dị n’ebe ahụ laruo n’ụlọ ha.

Ka anyị na-alaghachi n’ụlọ anyị, anyị hụrụ otú ebe a si kụọ jii. Naanị ihe anyị na-anụ gburugburu anyị bụ ubé ụmụ anụmanụ na ahụhụ dị iche iche. Tupu anyị alakpuo, anyị lere anya n’elu iji kiritụkwuo otú eluigwe dị n’abalị ahụ ihu igwe gbachapụrụ agbachapụ ma na-eche kpakpando ole anyị nwere ike ịnọ n’ebe a dị n’elu hụ.

Tupu anyị amara ihe na-emenụ, otu izu agwụla, anyị na-atụzikwa anya ka ụgbọelu ahụ bịa echi bulaa anyị. Anyị nweziri naanị otu abalị ikuku oyi Lengbati dị n’urukpuru ga-eku anyị tupu anyị alaghachi n’ụsọ oké osimiri ahụ na-ekpo ọkụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya