Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w10 5/1 p. 13
  • Ị̀ Maara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Maara?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • Too Ọkpara Jehova
    Jiri Ọṅụ Bụkuo Jehova Abụ
  • Jizọs Akatọọ Ndị Na-emegide Ya
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
w10 5/1 p. 13

Ị̀ Maara?

Olee uru na ọrụ ndị dị n’ịbụ diọkpara?

▪ Kemgbe oge ndị nna nna ochie, ndị ohu Chineke na-enye onye bụ́ diọkpara ihe ndị pụrụ iche. Mgbe nna nwe ụlọ nwụrụ, diọkpara ya na-aghọ onyeisi ezinụlọ. Ọ ga na-elekọta ezinụlọ ahụ ma na-achị onye ọ bụla ka bi na ya. Ọ bụkwa diọkpara na-anọchi anya ezinụlọ ahụ n’ihu Chineke. Ọ bụ ezie na a na-ekenye ụmụ nwoke ndị ọzọ niile ihe, a na-ekenye diọkpara ihe gbara nnọọ ọkpụrụkpụ. E jiri ihe diọkpara na-eketa tụnyere nke ụmụ nwoke ndị nke ọzọ, ọ na-eketa òkè abụọ.

N’oge ndị nna ochie, diọkpara nwere ike ịtụfu ọnọdụ ya dị ka diọkpara. Dị ka ihe atụ, Isọ resịrị nwanne ya nke ọ tọrọ ọnọdụ ya dị ka diọkpara. (Jenesis 25:30-34) Jekọb naara diọkpara ya, bụ́ Ruben, ọnọdụ ya dị ka diọkpara ma nye ya Josef. Ruben tụfuru ọnọdụ ahụ n’ihi omume rụrụ arụ o mere. (1 Ihe E Mere 5:1) Ma, n’Iwu Mozis, nwoke lụrụ ihe karịrị otu nwaanyị enweghị ike ịnapụ ọkpara otu nwunye ya ọnọdụ diọkpara ya ma nye ya ọkpara nke nwunye ya ọzọ naanị n’ihi na ọ hụrụ nwunye ya nke ọzọ ahụ n’anya. Nwoke ahụ ga-enyerịrị diọkpara ya ihe ruuru ya.—Diuterọnọmi 21:15-17.

Olee ihe mere ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ji eyi “mkpọ̀ a na-etinye akụkụ Akwụkwọ Nsọ”?

▪ Jizọs katọrọ ndị okpukpe na-emegide ya, bụ́ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, n’ihi na ha “na-eme ka mkpọ̀ a na-etinye akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ ha na-eyi dị ka ihe nchebe bukwuo ibu.” (Matiu 23:2, 5) Ndị okpukpe ahụ na-eke obere mkpọ̀ nwere akụkụ anọ e ji akpụkpọ anụ mee, nke a na-akpọ filaktrị, n’egedege ihu ha. Ha na-ekekwa ha n’apata aka ha otú ọ ga-adị nso n’obi ha. Ihe na-adị n’ime mkpọ̀ ndị ahụ bụ amaokwu Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ. Ihe mere ha ji eyi mkpọ̀ ndị ahụ a na-etinye akụkụ Akwụkwọ Nsọ bụ na ha ghọtara ntụziaka a Chineke nyere ụmụ Izrel n’ụzọ nkịtị, nke kwuru, sị: “Okwu ndị a m na-enye gị n’iwu taa ga-adị n’obi gị . . . Kee ha dị ka ihe ịrịba ama n’aka gị, ha ga-abụkwa ihe ị na-ekegide n’egedege ihu gị, n’agbata anya gị abụọ.” (Diuterọnọmi 6:6-8) O nweghị onye maara kpọmkwem mgbe a malitere iyi filaktrị, ma ihe ka ọtụtụ ná ndị ọkà mmụta Baịbụl na-ekwu na ọ malitere na narị afọ nke atọ ma ọ bụ nke abụọ Tupu Oge Anyị.

E nwere ihe abụọ mere Jizọs ji katọọ omume ahụ. Nke mbụ, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii na-eme ka filaktrị ha bukwuo ibu iji gosi ndị ọzọ na ha dị nnọọ nsọ. Nke abụọ, ndị òtù abụọ a lere mkpọ̀ ahụ a na-etinye akụkụ Akwụkwọ Nsọ anya dị ka ọtụmọkpọ, ma ọ bụ ọgwụ, nke ga-echebe ha. A sụgharịkwara aha mkpọ̀ a na Grik, bụ́ phylakterion, bụ́ ihe a kpọrọ ya n’akwụkwọ ndị na-abụghị Baịbụl dị ka “ụlọ elu ndị nche,” “ebe e wusiri ike,” ma ọ bụ “ihe nchebe.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya