Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w10 7/1 p. 9
  • Ị̀ Maara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Maara?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mgbidi Jeruselem
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Nehemaịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • “Nọgide Jiri Ezi Ihe Na-emeri Ihe Ọjọọ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Mgbidi Jeruselem
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
w10 7/1 p. 9

Ị̀ Maara?

Ọ̀ bụ eziokwu na ndanda na-akwadebe ihe oriri ya n’ọkọchị, na-achịkọtakwa ihe oriri ya n’oge owuwe ihe ubi?

▪ Ilu 6:6-8 kwuru, sị: “Gakwuru ndanda, gị onye umengwụ; hụ ụzọ ya wee mara ihe. Ọ bụ ezie na o nweghị ọchịagha, onyeisi ma ọ bụ onye na-achị achị, ọ na-akwadebe ihe oriri ya n’ọkọchị; ọ chịkọtawo ihe oriri ya n’oge owuwe ihe ubi.”

N’ezie, ụdị ndanda ụfọdụ na-akwakọba ihe oriri. O nwere ike ịbụ na ụdị ndanda Sọlọmọn kwuru banyere ya, bụ́ ụdị kacha dịrị n’Izrel taa, bụ ndanda na-achịkọta ihe oriri (Messor semirufus).

Otu akwụkwọ kwuru na “ndanda ndị a dị uchu ndị na-achịkọta ihe oriri na-ahapụ ọnụ ha n’oge okpomọkụ ịga chọọ ihe oriri . . . [ma] jiri oge okpomọkụ niile n’afọ chịkọta mkpụrụ akụ́kụ́.” Ha nwere ike ịghọrọ mkpụrụ osisi dị iche iche ma ọ bụ buru ndị dara n’ala. Ndanda ndị ahụ na-atụ ọnụ n’ime ala n’ebe dị nso n’ubi, ebe a na-akwakọba mkpụrụ akụ́kụ́, ma ọ bụ n’ebe a na-azọcha ọka, bụ́ ebe ha nwere ike ịhụ mkpụrụ akụ́kụ́ dị iche iche.

N’ime ọnụ ha, ndanda ndị ahụ na-edokọta ihe oriri n’oghere dị iche iche ndị nwere ụzọ ndị jikọtara ha. Ebe ndị ha na-akwakọba ihe oriri nwere ike ịdị sentimita iri na abụọ n’obosara ma dị otu sentimita n’ịdị elu. N’ihi ya, e kwuru na ìgwè ndanda ndị na-enweta ihe oriri na-ezuru ha nwere ike ịdịgide ndụ “ruo ihe karịrị ọnwa anọ n’enwetaghị ihe oriri ma ọ bụ mmiri n’èzí.”

Olee ihe dị n’ịbụ obu ihe ọṅụṅụ eze?

▪ Nehemaya bụ obu ihe ọṅụṅụ nke Eze Atazaksis nke Peshia. (Nehemaya 1:11) N’obí eze ndị e nwere n’oge ochie n’ala Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu, obu ihe ọṅụṅụ eze anaghị abụ odibo nkịtị. Kama nke ahụ, ọ na-abụ onye nọ n’ọkwá dị elu. Ihe odide oge ochie na ọtụtụ ihe osise oge ochie nke ndị obu ihe ọṅụṅụ na-enyere anyị aka ịghọta ihe ụfọdụ banyere ọrụ Nehemaya n’obí eze Peshia.

Obu ihe ọṅụṅụ na-ebu ụzọ aṅụtụ mmanya eze iji hụ na e nyeghị eze nsí. N’ihi ya, obu ihe ọṅụṅụ bụ onye eze tụkwasịrị nnọọ obi. Ọkà mmụta bụ́ Edwin M. Yamauchi kwuru, sị: “Mgba okpuru a na-agbakarị n’obí ndị eze Peshia mere ka ọ dị oké mkpa inwe ndị a tụkwasịrị obi na-eje ozi n’obí eze.” Ọ ga-abụ na obu ihe ọṅụṅụ bụkwa onye ukwu eze hụrụ n’anya, onye na-atụrụ eze aro ihe ọ na-eme. Otú o si anọ eze nso kwa ụbọchị nwere ike ime ka ọ na-ekpebi onye ga-ahụ eze na onye na-agaghị ahụ ya.

O nwere ike ịbụ ọkwá Nehemaya so mee ka o nwee ike inweta ikike ịlaghachi Jeruselem ịga wughachi mgbidi ya. Ọ ghaghị ịbụ na eze ji Nehemaya kpọrọ nnọọ ihe. The Anchor Bible Dictionary kwuru, sị: “Naanị ihe eze zara ya bụ, ‘Olee mgbe ị ga-alọta.’”—Nehemaya 2:1-6.

[Ihe Osise/Foto dị na peeji nke 9]

Ihe a tụrụ atụ si n’obí eze dị na Pesepọlis

[Ihe Osise]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Obu ihe ọṅụṅụ

Ọkpara Eze Bụ́ Zaksis

Darayọs Onye Ukwu

[Ebe E Si Nweta Foto]

© The Bridgeman Art Library International

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya