Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w10 8/1 p. 23
  • Ị̀ Maara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Maara?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘Ijegharị n’Ọṅụ Agha’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ikesa Ísìsì Ụtọ Nke Ihe Ọmụma Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ò Nwere Ihe Otú Anyị Si Efe Chineke Mere?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Isure Ihe Nsure Ọkụ Na-esi Ísì Ụtọ—Ò Nwere Ọnọdụ n’Ezi Ofufe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
w10 8/1 p. 23

Ị̀ Maara?

Olee ihe Pọl onyeozi bu n’obi mgbe o kwuru banyere “ngagharị mmeri”?

▪ Pọl dere, sị: “Chineke . . . na-edu anyị . . . ná ngagharị mmeri ná mmekọrịta anyị na Kraịst ma na-eme ka e nwee ike ịnụ ísìsì ihe ọmụma banyere ya n’ebe niile site n’aka anyị! N’ihi na n’ebe Chineke nọ, anyị bụ ísìsì ụtọ nke Kraịst n’etiti ndị a na-azọpụta nakwa n’etiti ndị na-ala n’iyi; n’ebe ndị na-ala n’iyi nọ, ọ bụ ísìsì ọnwụ nke na-eduga n’ọnwụ, n’ebe ndị a na-azọpụta nọ, ọ bụ ísìsì ndụ nke na-eduga ná ndụ.”—2 Ndị Kọrịnt 2:14-16.

Onyeozi ahụ na-ekwu banyere ihe ndị Rom na-eme nke bụ́ ime ngagharị mmeri iji kwanyere ọchịagha meriri ndị iro nke obodo ya n’agha ùgwù. Ná ngagharị ndị dị otú ahụ, a na-egosi ma ihe ndị a kwatara n’agha ma ndị a dọtara n’agha, a na-akpụkwa oké ehi aga ebe a ga-eji ha chụọ àjà ka ìgwè mmadụ na-eto ọchịagha ahụ na ndị agha ya. Mgbe njem ngagharị ahụ kwụsịrị, a na-achụ oké ehi ndị ahụ n’àjà, o yikwara ka à na-egbu ọtụtụ n’ime ndị ahụ a dọtara n’agha.

Akwụkwọ bụ́ The International Standard Bible Encyclopedia kwuru na “ọ ga-abụ n’ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ a na-esure ka ndị mmadụ kwụ n’ahịrị na-aga ka e si nweta” okwu bụ́ “ísìsì ụtọ nke Kraịst” nke pụtaara ụfọdụ ndụ, pụtara ndị ọzọ ọnwụ. “Ísìsì ụtọ ahụ nke na-egosi mmeri ndị meriri n’agha meriri na-echetara ndị a dọọrọ n’agha na e nwere ike igbu ha.”a

Olee ihe bụ́ “ebe ndị dị elu” ahụ e kwuru banyere ha ọtụtụ ugboro n’Akwụkwọ Nsọ Hibru?

▪ Mgbe ndị Izrel na-achọ ịbanye n’Ala Nkwa ahụ, Jehova gwara ha ka ha wepụ ebe niile ndị Kenan bi ebe ahụ na-anọ efe ofufe. Chineke nyere ha iwu, sị: “Bibie ihe oyiyi niile ha ji nkume mee, bibiekwanụ ihe oyiyi niile ha ji ígwè wụọ, laakwanụ ebe nsọ ha niile dị elu n’iyi.” (Ọnụ Ọgụgụ 33:52) O nwere ike ịbụ na ebe ndị ahụ a na-anọ efe ofufe ụgha bụ mbara ala dị n’elu ugwu ma ọ bụ ebe e wuliri elu n’ebe ndị ọzọ, dị ka n’okpuru osisi ma ọ bụ n’ime obodo. (1 Ndị Eze 14:23; 2 Ndị Eze 17:29; Ezikiel 6:3) Ebe ndị ahụ nwere ike inwe ebe ịchụàjà, ogidi nsọ ma ọ bụ ogwe osisi dị nsọ, ihe oyiyi, ihe ndị e ji adọba ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, na arịa ndị ọzọ e ji efe ofufe.

Tupu e wuo ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem, ndị Izrel fere Jehova n’ebe ndị ọ nabatara bụ́ ndị Akwụkwọ Nsọ kpọrọ ebe ndị dị elu. Onye amụma Chineke bụ́ Samuel chụrụ àjà “n’ebe dị elu” dị n’obodo a na-akpọghị aha dị n’ala Zọf. (1 Samuel 9:11-14) Ma, ozugbo e wuchara ụlọ nsọ ahụ, ọtụtụ ndị eze kwesịrị ntụkwasị obi nye Jehova gbara mbọ iwepụsị “ebe ndị dị elu” n’ala ahụ.—2 Ndị Eze 21:3; 23:5-8, 15-20; 2 Ihe E Mere 17:1, 6.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụrụ na ị chọrọ ịhụ ebe a kọwara ihe ihe atụ a Pọl mere pụtara n’ụzọ ime mmụọ, gụọ Ụlọ Nche, November 15, 1990, peeji nke 27.

[Foto dị na peeji nke 23]

Otu akụkụ nke ihe a tụrụ atụ na-egosi ngagharị mmeri nke ndị Rom, narị afọ nke abụọ oge anyị

[Ebe E Si Nweta Foto]

A natara Ebe Ndebe Ihe Ochie Briten ikike see foto a

[Foto dị na peeji nke 23]

Ogidi nsọ dakasịrị adakasị, na Giza

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya