Chineke Ọ̀ Chọrọ Ka Anyị Na-ekwupụta Mmehie Anyị?
N’ọtụtụ chọọchị, ndị mmadụ ka na-ekwupụtara ụkọchukwu ma ọ bụ onye ndú okpukpe mmehie ha. Ma, mmadụ ikwupụta mmehie ya ọ̀ dị mkpa n’oge a ọha na eze na-eme otú masịrị ha?
IHE ndị mmadụ na-eche n’okwu a dị iche iche. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ akụkọ bụ́ National Post nke Kanada kọrọ banyere otu onye nke kwetara na n’agbanyeghị na ọ na-esi ike ịkọrọ onye ọzọ ihe i mejọrọ, “ịkọrọ ya onye ọzọ, onye ahụ ekpeere gị ekpere ma gwa gị ihe i kwesịrị ime na-eme nnọọ ka i nwere onwe gị.” N’aka nke ọzọ, akwụkwọ bụ́ Bless Me, Father, for I Have Sinned kwuru ihe otu nwoke kwuru, sị: “Nkwupụta mmehie bụ otu n’ime ihe kacha egbu mmụọ a na-eme na Chọọchị. Ọ na-eme ka obi koro ndị mmadụ n’elu mgbe niile.” Olee ihe Baịbụl nwere ikwu n’isiokwu a?
Ihe Baịbụl Kwuru
N’Iwu Chineke nyere mba Izrel, e nwere ntụziaka ndị a kapịrị ọnụ banyere ihe e kwesịrị ime mgbe mmadụ mere mmehie. Dị ka ihe atụ, mgbe mmadụ mejọrọ ibe ya ma ọ bụ mebie iwu Chineke, ọ ga-ekwupụta ya n’ihu onye nchụàjà a họpụtara ahọpụta nke si n’ebo Livaị, bụ́ onye ga-ekpuchiri ya mmehie ahụ site n’ịchụrụ Chineke àjà maka mgbaghara mmehie.—Levitikọs 5:1-6.
Mgbe ọtụtụ narị afọ gachara, olee ihe Eze Devid mere mgbe Netan onye amụma dọrọ ya aka ná ntị maka mmehie ya? O kwetara ozugbo, sị: “Emehiewo m Jehova.” (2 Samuel 12:13) O kpekwara ekpere, rịọ Chineke ka o meere ya amara. Olee ihe si na ya pụta? Devid mechara dee, sị: “N’ikpeazụ, ekwupụtaara m gị mmehie m, ekpuchighịkwa m njehie m. Asịrị m: ‘M ga-ekwupụtara Jehova mmebi iwu m.’ Gị onwe gị gbaghaara m njehie m na mmehie m.”—Abụ Ọma 32:5; 51:1-4.
N’ọgbakọ Ndị Kraịst na narị afọ mbụ Oge Anyị, Chineke ka chọrọ ka ndị mmadụ na-ekwupụta mmehie ha. Jems, onye otu nne ji ya na Jizọs, nke bụ́kwa otu n’ime ndị na-edu ndú n’ọgbakọ dị na Jeruselem, gbara Ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Na-ekwupụtanụ mmehie unu gwa ibe unu, na-ekpekwaranụ ibe unu ekpere, ka e wee gwọọ unu.” (Jems 5:16) Oleezi ihe a chọrọ ka Ndị Kraịst na-ekwupụta, ònyekwa ka ha ga-ekwupụtara ya?
Olee Ihe E Kwesịrị Ikwupụta?
Kwa ụbọchị, anyị bụ́ ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-enwe ọchịchọ ime omume n’echeghị echiche ma ọ bụ ikwu okwu na-adịghị mma, sikwa otú ahụ na-emehie ibe anyị. (Ndị Rom 3:23) Nke a ọ̀ pụtara na anyị ga-ekwupụtarịrị mmejọ ọ bụla dị otú ahụ n’ihu onyeisi ma ọ bụ otu onye a họpụtara ahọpụta?
N’agbanyeghị na mmehie ọ bụla dị njọ n’anya Chineke, n’ihi obi ebere ya, ọ na-aghọta na anyị na-eme mmehie n’ihi ezughị okè anyị ketara eketa. N’ezie, ọbụ abụ ahụ kwetara, sị: “A sị na ọ bụ njehie ka ị na-ele, Jaa, Jehova, ònye pụrụ iguzo? N’ihi na ezi mgbaghara dị n’aka gị, ka e wee na-atụ egwu gị.” (Abụ Ọma 130:3, 4) Ya mere, olee ihe anyị kwesịrị ime mgbe anyị mere ihe ọjọọ ma mehie ndị ọzọ, ikekwe, n’amaghị ama? Cheta na n’ekpere nlereanya ahụ Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya, e nwere arịrịọ bụ́: “Gbaghara anyị mmehie anyị, n’ihi na anyị onwe anyị na-agbagharakwa onye ọ bụla nke mehiere anyị.” (Luk 11:4) N’ezie, Chineke ga-agbaghara anyị mmehie anyị ma ọ bụrụ na anyị ekpegara ya ekpere ma rịọ ya mgbaghara n’aha Jizọs.—Jọn 14:13, 14.
Ị̀ hụrụ na Jizọs kwukwara na ihe ga-eme ka a gbaghara anyị bụ anyị ịgbagharakwa “onye ọ bụla nke mehiere anyị?” Pọl onyeozi chetaara ndị kwere ekwe ibe ya, sị: “Nweenụ obiọma n’ebe ibe unu nọ, na-enwekwanụ obi ọmịiko, na-agbagharanụ ibe unu kpamkpam dị nnọọ ka Chineke sikwa n’aka Kraịst gbaghara unu kpamkpam.” (Ndị Efesọs 4:32) Ọ bụrụ na anyị agbaghara ndị ọzọ mmehie ha, obi ga-esi anyị ike na Chineke ga-agbaghara anyị mmehie anyị.
Oleekwanụ maka mmehie ndị dị oké njọ ndị dị ka izu ohi, ilezi anya agha ụgha, ịkwa iko, ịṅụbiga mmanya ókè, na ndị ọzọ? Onye ọ bụla na-eme ụdị mmehie ndị ahụ na-ada iwu Chineke, sikwa otú ahụ na-emehie Chineke. Olee ihe e kwesịrị ime?
Olee Onye E Kwesịrị Ikwupụtara Mmehie?
Chineke enyeghị ụmụ mmadụ ikike ịgbaghara mmehie e mehiere ya; ọ bụ naanị ya nwere ike ime otú ahụ. Baịbụl gwara anyị hoo haa, sị: “Ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, [Chineke] kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa onye ezi omume, nke mere na ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị, sachapụkwa anyị ajọ omume niile.” (1 Jọn 1:9) Ma, ònye ka e kwesịrị ikwupụtara ụdị mmehie ndị ahụ?
Ebe ọ bụ naanị Chineke nwere ike ịgbaghara mmadụ mmehie, ọ bụ ya ka a na-aghaghị ikwupụtara mmehie. Ọ bụ ihe Devid mere, dị ka anyị kwurula. Ma, olee ihe ga-eme ka a gbaghara mmadụ mmehie ya? Baịbụl gwara anyị, sị: “Ya mere, chegharịanụ, chigharịakwanụ ka e wee hichapụ mmehie unu, ka oge inweta ume wee si n’ihu Jehova bịa.” (Ọrụ 3:19) N’ezie, ihe ga-eme ka a gbaghara mmadụ mmehie ya abụghị naanị onye ahụ ikweta mmehie ya na ikwupụta ya kamakwa onye ahụ ịdị njikere izere ihe ọjọọ ahụ. Ime nke a na-esikarị ike. Ma, e nwere ihe ga-enyere mmadụ aka ime ya.
Cheta ihe a onye na-eso ụzọ Jizọs bụ́ Jems kwuru, nke anyị kwuru banyere ya na mbụ: “Na-ekwupụtanụ mmehie unu gwa ibe unu, na-ekpekwaranụ ibe unu ekpere, ka e wee gwọọ unu.” Mgbe Jems kwuchara nke ahụ, ọ sịrị: “Ekpere nke onye ezi omume na-ekpesi ike dị ike nke ukwuu mgbe ọ na-akpa ike.” (Jems 5:16) “Onye ezi omume” ahụ nwere ike ịbụ otu n’ime “ndị okenye nke ọgbakọ,” bụ́ ndị Jems kwuru okwu ha n’amaokwu nke 14. N’ọgbakọ Ndị Kraịst, e nwere “ndị okenye” ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, bụ́ ndị a họpụtara inyere ndị chọrọ ka Chineke gbaghara ha mmehie ha aka. “Ndị okenye” ahụ enweghị ike ịgbaghara onye ọ bụla mmehie ya, n’ihi na ọ dịghị mmadụ e nyere ikike ịgbaghara mmadụ ibe ya mmejọ o mejọrọ Chineke.a Ma, ha ruru eru n’ụzọ ime mmụọ ịdọ onye mere mmehie dị oké njọ aka ná ntị na ịgbazi ya, nyere ya aka ịghọta otú mmehie ya jọruru ná njọ na mkpa ọ dị ya ichegharị.—Ndị Galeshia 6:1.
Olee Ihe Mere Mmadụ Ga-eji Kwupụta Mmehie Ya?
Ma mmehie ọ̀ dị oké njọ ma ọ bụ na ọ dịghị, onye mere ya emebiela mmekọrịta ya na mmadụ ibe ya na Chineke. N’ihi ya, o nwere ike iwute ya ma ọ bụ ahụ́ aghara iru ya ala. Ihe na-akpata ya bụ akọ na uche, bụ́ nke Onye Okike anyị nyere anyị. (Ndị Rom 2:14, 15) Olee ihe e nwere ike ime banyere ya?
Ka anyị gaghachi n’ihe e dere n’akwụkwọ Jems, bụ́ ebe e kwuru okwu a na-agba ume: “È nwere onye ọ bụla na-arịa ọrịa [ime mmụọ] n’etiti unu? Ka ọ kpọọ ndị okenye nke ọgbakọ, ka ha kpeekwara ya ekpere, teekwa ya mmanụ n’aha Jehova. Ekpere e ji okwukwe kpee ga-emekwa ka ahụ́ dị onye ahụ nke ahụ́ na-adịghị ike mma, Jehova ga-emekwa ka o bilie. Ọ bụrụkwa na o mewo mmehie, a ga-agbaghara ya.”—Jems 5:14, 15.
N’amaokwu ndị a, a gwakwara ndị okenye ka ha gbooro ìgwè atụrụ Chineke mkpa ha. Olee otú ha ga-esi mee ya? Ọ bụghị naanị site n’ige ntị mgbe mmadụ na-ekwupụta mmehie ya. Kama nke ahụ, ebe ọ bụ na onye ahụ na-arịa ọrịa ime mmụọ, ọ dị mkpa ka ha mee ihe iji mee ka “ahụ́ dị onye ahụ nke ahụ́ na-adịghị ike mma.” Jems kwuru ihe abụọ e nwere ike ime.
Nke mbụ, ha ‘ga-ete onye ahụ mmanụ.’ Nke a pụtara ikike Okwu Chineke nwere ịgwọ mmadụ. Pọl onyeozi kọwara na “okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike, . . . o nwekwara ike ịchọpụta echiche na ihe mmadụ bu n’obi,” na-eru n’ime ime uche na obi mmadụ. (Ndị Hibru 4:12) Ọ bụrụ na ndị okenye ejiri nkà were Baịbụl gwa onye ahụ na-arịa ọrịa ime mmụọ okwu, ha nwere ike inyere ya aka ịhụ ihe kpatara nsogbu ya na ime ihe ndị o kwesịrị ime iji dozie nsogbu ahụ n’ihu Chineke.
Nke ọzọ bụ “ekpere e ji okwukwe kpee.” Ọ bụ ezie na ekpere ndị okenye ahụ ga-ekpe agaghị egbochi Chineke ikpe ikpe ziri ezi, ekpere ahụ dị Chineke mkpa, bụ́ onye ọ na-agụ agụụ ịgbaghara mmehie n’ihi àjà mgbapụta Kraịst. (1 Jọn 2:2) Chineke dị njikere inyere onye mmehie ọ bụla ji obi ya niile chegharịa ma na-arụ “ọrụ kwesịrị nchegharị” aka—Ọrụ 26:20.
Isi ihe mere mmadụ ga-eji kwupụta mmehie ya—nke o mehiere mmadụ ibe ya ma ọ bụ Chineke—bụ ka ya na Chineke dịrị ná mma. Jizọs Kraịst gosiri na anyị ga-eburịrị ụzọ dozie nsogbu ọ bụla anyị na mmadụ ibe anyị nwere, anyị na ya emeekwa udo tupu anyị enwee ike iji akọ na uche dị ọcha fee Chineke. (Matiu 5:23, 24) Ilu 28:13 kwuru, sị: “Onye na-ezochi ajọ omume ya agaghị enwe ihe ịga nke ọma, ma onye na-ekwupụta ya ma na-ahapụ ya ka a ga-emere ebere.” Ọ bụrụ na anyị eweda onwe anyị ala n’anya Jehova Chineke ma rịọ ya mgbaghara, ọ ga-emere anyị amara ma bulie anyị elu mgbe oge ruru.—1 Pita 5:6.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ụfọdụ ndị chere na ihe Jizọs kwuru na Jọn 20:22, 23 na-egosi na e kwesịrị inwe ụmụ mmadụ ndị a ga na-ekwupụtara mmehie. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịhụ ebe a kọwara ya nke ọma, gụọ Ụlọ Nche, April 15, 1996, peeji nke 28-29.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 23]
Chineke ga-eleghara mmejọ anyị anya ma gbaghara anyị ma ọ bụrụ na anyị ekpegara ya ekpere ma rịọ ya mgbaghara n’aha Jizọs
[Foto dị na peeji nke 24]
Isi ihe mere mmadụ ga-eji kwupụta mmehie ya bụ ka ya na Chineke dịrị ná mma