Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w11 3/15 p. 17-20
  • E Nwere Ọtụtụ Ihe Mere I Kwesịrị Iji Na-enwe Ọṅụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • E Nwere Ọtụtụ Ihe Mere I Kwesịrị Iji Na-enwe Ọṅụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Kọọ Ihe Ndị Mere “n’Oge Dị Anya Gara Aga”
  • Tụleenụ Otú ‘Akụkụ nke Ọ Bụla Si Arụ Ọrụ Ya’
  • “Leruonụ Ụlọ Elu Ya Niile Anya”
  • Nyere Ndị Na-eto Eto Aka Ịma Otú Ihe Si Aga n’Ọgbakọ Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Nọrọ ná Nchebe Dị Ka Akụkụ nke Nzukọ Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ì So Nzukọ Jehova Na-aga Ụkwụ na Ụkwụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • “Chọpụta Ihe Ndị Ka Mkpa”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
w11 3/15 p. 17-20

E Nwere Ọtụtụ Ihe Mere I Kwesịrị Iji Na-enwe Ọṅụ

JEHOVA kere ihe niile ka ha dịrị n’usoro. Ihe na-egosi na nke a bụ eziokwu bụ otú o si hazie mkpụrụ ndụ ndị pere mpe, nakwa otú o si hazie kpakpando n’ụyọkọ n’ụyọkọ, ma ndị hiri nne n’ụyọkọ ha ma ndị dị ole na ole. Nke a ekwesịghị iju anyị anya n’ihi na Onye Okike “abụghị Chineke nke aghara.” (1 Kọr. 14:33) Otú Chineke si hazie ndị ya ka ha na-efe ya ofufe magbukwara onwe ya. Tụlee ihe Jehova merela. O meela ka ọtụtụ narị nde ndị mmụọ ozi na ụmụ mmadụ, bụ́ ndị nweere onwe ha ịhọrọ ihe ha ga-eme, nọrọ n’otu nzukọ ma na-efe ya ofufe dị ọcha. Nke a magburu onwe ya!

N’Izrel oge ochie, Jeruselem, bụ́ ebe ụlọ nsọ Jehova dị, nọchiri anya nzukọ Chineke nke a na-ahụ anya. Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka eze ọ họpụtara na-anọ achị. Otu onye Izrel a dọọrọ n’agha gaa Babịlọn gosiri otú obi dị ya banyere obodo nsọ ahụ. Ọ sịrị: “Ka ire m rapara n’okpo ọnụ m, ma ọ bụrụ na mụ echetaghị gị, ma ọ bụrụ na mụ emeghị ka Jeruselem dị elu.”—Ọma 137:6.

Ọ̀ bụ otú ahụ ka obi dị gị maka nzukọ Chineke taa? Ọ̀ na-enye gị ọṅụ karịa ihe ọ bụla ọzọ? Ụmụ gị hà ma otú nzukọ Chineke nke a na-ahụ anya si malite nakwa ọrụ ọ na-arụ? Hà ghọtara na ha so n’ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova? Obi ọ̀ dị ha ụtọ maka nke a? (1 Pita 2:17) Gbalịa mee ihe ndị na-esonụ mgbe unu na-enwe Ofufe Ezinụlọ ka i wee nyere ezinụlọ gị aka ịma otú nzukọ Jehova si arụ ọrụ, nyekwara ha aka igosi na obi dị ha ụtọ maka ya.

Kọọ Ihe Ndị Mere “n’Oge Dị Anya Gara Aga”

Kwa afọ, ezinụlọ dị iche iche n’Izrel na-ezukọ eme Ememme Ngabiga. Mgbe e hiwere ememme ahụ, Mozis gwara ụmụ Izrel, sị: “Ọ bụrụ na nwa gị mesịa jụọ gị, sị, ‘Gịnị ka ihe a pụtara?’ ị ga-asị ya, ‘Jehova ji ike aka ya kpọpụta anyị n’Ijipt, n’ụlọ ndị ohu.’” (Ọpụ. 13:14) Ụmụ Izrel ekwesịghị ichefu ihe Jehova meere ha. N’eziokwu, ọtụtụ ndị bụ́ nna n’Izrel mere ihe a Mozis sịrị ha mee. Mgbe ọtụtụ ọgbọ gachara, otu onye Izrel kpere ekpere, sị: “Chineke, anyị ejiriwo ntị anyị nụ, nna nna anyị hà akọworo anyị Ihe i mere n’oge ha, n’oge dị anya gara aga.”—Ọma 44:1.

Taa, ihe Ndịàmà Jehova mere kemgbe ihe dị ka otu narị afọ gara aga nwere ike ịdị onye na-eto eto ka ihe mere “n’oge dị anya gara aga.” Olee otú i nwere ike isi mee ka ụmụ gị ghọta ihe ndị a nke ọma? Ihe ndị nne na nna ụfọdụ ji eme nke a bụ akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom, Yearbook, akụkọ ndụ ndị a kọrọ n’akwụkwọ anyị, na akụkọ ndị ọzọ a kọrọ banyere nzukọ Jehova, tinyere diiviidi ọhụrụ anyị nke kwuru banyere ndị Chineke nke oge a. Vidio ndị e gosiri otú e si kpagbuo ụmụnna anyị n’ebe bụbu Sọviet Yuniọn nakwa na Nazi Jamanị na-akụziri ezinụlọ dị iche iche na ha kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi mgbe a na-akpagbu ha. Tụleenụ ihe ndị a mgbe unu na-enwe Ofufe Ezinụlọ. Ọ ga-eme ka okwukwe ụmụ unu sie ike ma ọnwụnwa bịara ha.

Ịkọrọ ụmụaka ihe ndị mere n’oge gara aga n’ekweghị ha tinye ọnụ nwere ike ịgwụ ha ike. N’ihi ya, mee ka ụmụ gị na-etinye ọnụ mgbe ị na-akọrọ ha ihe ndị a. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịgwa otu nwa gị ka ọ họrọ otu mba masịrị ya, mee nchọnchọ banyere otú ọrụ anyị si aga ná mba ahụ ma kọọrọ ezinụlọ unu ụfọdụ ihe ndị ọ chọpụtara. N’ọgbakọ unu, i nwere ike ịgwa ụfọdụ ụmụnna ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi kemgbe ọtụtụ afọ ka ha bịa soro unu nwee ofufe ezinụlọ n’otu mgbede. Otu n’ime ụmụ gị nwere ike ịjụ ha ajụjụ ụfọdụ ka ha kọọ ahụmahụ ndị ha nwere. I nwekwara ike ịgwa nwa gị ọzọ ka o see ihe ụfọdụ dị mkpa e merela ná nzukọ Jehova, dị ka alaka ụlọ ọrụ e wuru ọhụrụ, mgbakọ mba niile e nwere n’oge gara aga, ma ọ bụkwanụ ebe e ji gramafon na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ.

Tụleenụ Otú ‘Akụkụ nke Ọ Bụla Si Arụ Ọrụ Ya’

Pọl onyeozi ji ọgbakọ Ndị Kraịst tụnyere ‘anụ ahụ niile e jikọrọ ka ha bụrụ otu. Akụkụ niile ọ bụla na-arụ ọrụ ya nke ọma, na-esite n’ụzọ ahụ e nyere akụkụ ndị ọzọ aka, ime ka ha too, na iwuli ha elu site n’ịhụnanya.’ (Efe. 4:16, Baịbụl Nsọ nke International Bible Society) Anyị ga-ahụkwu Onye kere anyị n’anya ma kwanyekwuoro ya ùgwù ma ọ bụrụ na anyị amụọ banyere otú ahụ́ mmadụ si arụ ọrụ. Ọ bụrụkwa na anyị amụọ otú ọgbakọ anyị n’ụwa niile si arụ ọrụ, anyị ga-ahụ “amamihe dịgasị iche iche nke Chineke.”—Efe. 3:10.

Jehova kwuru otú ọgbakọ ya nke a na-ahụ anya na nke a na-anaghị ahụ anya si arụ ọrụ. Dị ka ihe atụ, ọ gwara anyị na ya bu ụzọ kpugheere Jizọs Kraịst ihe, Jizọs ‘ezigazie mmụọ ozi ya ma site n’aka ya gosi ya ohu ya bụ́ Jọn n’ụzọ ihe atụ, bụ́ onye gbara àmà banyere okwu Chineke.’ (Mkpu. 1:1, 2) Ọ bụrụ na Chineke gwara anyị otú nzukọ ya nke a na-anaghị ahụ anya si arụ ọrụ, í cheghị na ọ ga-achọ ka anyị mara otú ‘akụkụ nke ọ bụla’ si arụ ọrụ n’ụwa?

Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye nlekọta sekit ga-eleta ọgbakọ unu n’oge na-adịghị anya, gị na ezinụlọ gị nwere ike ịtụle ọrụ ndị nlekọta sekit na-arụ nakwa otú e si na-agọzi ha n’ọrụ ha. Unu nwekwara ike ịtụle otú ha si enyere onye ọ bụla n’ime anyị aka. Ajụjụ ndị unu nwekwara ike ịtụle bụ: Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-enye akụkọ ozi? Olee otú e si enweta ego e ji arụ ọrụ ná nzukọ Chineke? Olee kọmitii ndị e nwere n’Òtù Na-achị Isi, oleekwa otú Òtù Na-achị Isi si enye anyị nri ime mmụọ?

Ọ bụrụ na anyị atụlee otú ihe si aga n’etiti ndị Jehova, anyị ga-erite uru atọ, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ: Anyị ga na-akwanyere ndị na-arụsi ọrụ ike n’etiti anyị ùgwù. (1 Tesa. 5:12, 13) Anyị ga na-akwado ndokwa ndị e mere n’ọgbakọ. (Ọrụ 16:4, 5) Nke ikpeazụ bụ na anyị ga-atụkwasịkwu ndị na-edu ndú n’etiti anyị obi ma anyị chọpụta na mkpebi na ndokwa ndị ha mere si n’Akwụkwọ Nsọ.—Hib. 13:7.

“Leruonụ Ụlọ Elu Ya Niile Anya”

Otu ọbụ abụ dere, sị: “Gaanụ gburugburu Zayọn, gaakwanụ ya okirikiri, gụọnụ ụlọ elu ya ọnụ. Chebaranụ ékpè ya echiche. Leruonụ ụlọ elu ya niile anya, ka unu wee kọọrọ ya ọgbọ dị n’ihu.” (Ọma 48:12, 13) Ọbụ abụ a gbara ụmụ Izrel ume ka ha leruo Jeruselem anya. Chegodị otú obi na-adị ezinụlọ ọ bụla dị n’Izrel nke gara obodo nsọ ahụ maka ememme a na-eme kwa afọ ma hụ ụlọ nsọ ya nke mara ezigbo mma? Ọ ga-abụrịrị na ihe ha hụrụ mere ka ha “kọọrọ ya ọgbọ dị n’ihu.”

Chegodị banyere eze nwaanyị Shiba, bụ́ onye nweburu obi abụọ mgbe ọ nụrụ banyere ọchịchị ọma Sọlọmọn na amamihe ya dị ukwuu. Gịnị mere ka o kweta na ihe ndị ọ nụrụ bụ eziokwu? O kwuru, sị: “Ekwetaghị m ihe e kwuru ruo mgbe m bịara ka m jiri anya m hụ.” (2 Ihe 9:6) N’eziokwu, ihe anyị ji “anya” anyị hụ nwere ike ịbara anyị uru nke ukwuu.

Olee otú i nwere ike isi nyere ụmụ gị aka ka ha jiri “anya” ha hụ ọrụ ndị magburu onwe ha nzukọ Jehova na-arụ? Ọ bụrụ na e nwere alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị nso n’ebe unu bi, gbalịanụ gaa hụ otú ebe ahụ dị. Were Mandy na Bethany dị ka ihe atụ. Ọ na-ewe ha ihe dị ka otu puku kilomita na narị ise ma ha si n’ebe ha bi gaa Betel dị n’obodo ha. Ma, papa ha na mama ha na-akpọrọ ha aga ebe ahụ ọtụtụ mgbe, karịchaa mgbe ha ka na-eto eto. Ha kwuru, sị: “Tupu anyị agaa hụ Betel, anyị chere na a naghị ekwe mmadụ megharịa ahụ́ ebe ahụ nakwa na Betel bụ naanị maka ndị agadi. Ma, anyị hụrụ ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa ndị ji ọṅụ na-arụsi ọrụ Jehova ike! Anyị chọpụtara na nzukọ Jehova buru ibu karịa nwa obere ebe a anyị bi, ihe anyị na-ahụkwa mgbe ọ bụla anyị gara Betel na-agba anyị ume.” Ịbịaru nzukọ Chineke nso mere ka Mandy na Bethany ghoọ ndị ọsụ ụzọ, ha mechakwara gaa rụtụ ọrụ na Betel ọnwa ole na ole.

Anyị nwere ihe ọzọ ga-eme ka anyị “hụ” otú nzukọ Jehova si arụ ọrụ, bụ́kwanụ ihe ụmụ Izrel na-enweghị n’oge ochie. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, e mepụtarala ndị Chineke vidio na diiviidi ndị gosiri ụzọ dị iche iche nzukọ Chineke si arụ ọrụ. Ụfọdụ n’ime ha bụ: Jehovah’s Witnesses—Organized to Share the Good News, Our Whole Association of Brothers, To the Ends of the Earth, na United by Divine Teaching. Ọ bụrụ na gị na ezinụlọ gị ahụ otú ndị na-eje ozi na Betel, ndị na-enyere ndị nwere ọdachi aka, ndị ozi ala ọzọ, na ụmụnna ndị na-akwadebe ma na-ahazi mgbakọ dị iche iche si arụsi ọrụ ike, unu ga-ejikwu ụmụnna anyị n’ụwa niile kpọrọ ihe.

Ọgbakọ ọ bụla na-arụ ọrụ dị mkpa mgbe ọ na-ekwusa ozi ọma ma na-enyere ụmụnna nọ ebe ọ dị aka. Wepụta oge ka gị na ezinụlọ gị na-echeta “òtù ụmụnna unu niile ndị nọ n’ụwa.” Nke a ga-eme ka gị na ụmụ gị ‘sie ike n’okwukwe,’ meekwa ka unu nwee ihe ga-eme ka unu na-enwe ọṅụ.—1 Pita 5:9.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 18]

Nzukọ Chineke Ihe E Kwesịrị Ịmụ Banyere Ya n’Ofufe Ezinụlọ

E nwere ọtụtụ ihe ga-enyere anyị aka ịmatakwụ otú nzukọ Jehova si malite na otú o si arụ ọrụ. Ajụjụ ndị a ga-eme ka ị matakwuo banyere ya:

☞ Olee otú ọrụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị nke oge a si malite?—Ụlọ Nche, November 15, 1996, peeji nke 10-15.

☞ Olee ihe pụrụ iche mere ‘n’Ụbọchị Ụmụaka’ ná Mgbakọ e nwere n’afọ 1941?—Ụlọ Nche, July 15, 2001, peeji nke 8.

☞ Olee otú Òtù Na-achị Isi si eme mkpebi?—‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke,’ peeji nke 108-114.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya