Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w11 9/1 p. 4-6
  • Ọ̀ Bụ Onye n’Eziokwu Na-achị Ụwa A?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ̀ Bụ Onye n’Eziokwu Na-achị Ụwa A?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ònye n’Eziokwu Na-achị Ụwa A?
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ekwensu Ọ̀ Dị Adị n’Eziokwu?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ekwensu—Ọ Bụghị Nkwenkwe Ụgha Nkịtị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
w11 9/1 p. 4-6

Ọ̀ Bụ Onye n’Eziokwu Na-achị Ụwa A?

Ọ BỤRỤ na ị hụtụbeghị onyeisi ndị òtù ọjọọ, ọ̀ ga-eme ka i kwuo na e nweghị onye dị otú ahụ? Ndị isi òtù ọjọọ na-eme ihe niile ha nwere ike ime ka a ghara ịmata ndị ha bụ. Ụfọdụ n’ime ha na-anọdị n’ụlọ mkpọrọ na-eziga ndị òtù ha ka ha na-akpa arụ n’obodo. Ma, ihe ndị a na-agụta n’akwụkwọ akụkọ banyere ndị na-ere ọgwụ ike, ndị na-akpọga ndị mmadụ ebe ha ga-aga gbawa akwụna, na ndị na-ere ndị mmadụ na-egosi nsogbu òtù ọjọọ dị iche iche na-akpata. Arụ ndị ha na-akpa n’ebe dị iche iche na-egosikwa na ha nwere ndị isi.

Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, kwuru na Setan dị adị, nakwa na ọ na-eme ka onyeisi ndị òtù ọjọọ n’ihi na ọ na-eji “ihe ịrịba ama ụgha” na “ajọ aghụghọ” emezu ihe ọ chọrọ ime. N’eziokwu, Baịbụl kwuru na ọ “na-eme onwe ya ka o yie mmụọ ozi nke ìhè.” (2 Ndị Tesalonaịka 2:9, 10, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik; 2 Ndị Kọrịnt 11:14) Arụ dị iche iche Ekwensu na-akpa na-egosikwa na ọ dị adị. Ma, ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ikweta na e nwere onye ọjọọ a na-anaghị ahụ anya dị otú ahụ. Tupu anyị elebawa anya n’ihe Baịbụl kwuru banyere Ekwensu, ka anyị lebagodị anya n’ihe ụfọdụ na-abụghị eziokwu ndị mmadụ kweere, bụ́ ndị na-eme ka ọtụtụ ndị ghara ikweta na Ekwensu dị.

◼ “Gịnị mere Chineke nke hụrụ ụmụ mmadụ n’anya ji kee Ekwensu?” Ebe ọ bụ na Baịbụl kwuru na Chineke zuru okè, na-emekwa naanị ihe dị mma, ọ na-esiri ndị mmadụ ike ịghọta otú o si bụrụ na o kere onye ọjọọ obi fere azụ. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na Baịbụl ekwughị na Chineke kere onye dị otú ahụ. Kama nke ahụ, o kwuru banyere Chineke, sị: “Oké Nkume ahụ, ihe zuru okè ka ọrụ ya bụ, n’ihi na ụzọ ya niile bụ ikpe ziri ezi. Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi, onye ikpe na-ezighị ezi na-adịghị n’ebe ọ nọ; onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ.”—Diuterọnọmi 32:4; Abụ Ọma 5:4.

Ajụjụ bụzi, Onye zuru okè nke Chineke kere ò nwere ike ịga mewe ihe ọjọọ? Chineke ekeghị ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi ka ha dị ka robọt. Chineke kere ha niile ka ha nwee ike ikpebiri onwe ha ihe ha ga-eme. N’ihi ya, onye zuru okè, ma ọ̀ bụ mmụọ ma ọ bụ mmadụ, nwere ike ikpebi ime ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ. Ọ bụrụ na ha enweghị ike iji aka ha kpebie ihe ha chọrọ ime, a gaghị asị na ihe ha mere bụ ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ.

N’ihi ya, o nweghị otú Chineke ga-esi nye ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi ikike ikpebiri onwe ha ihe ha chọrọ ime ma gbochie ha ime ihe ọjọọ ma ha chọọ ime ya. Jizọs gosiri na mmadụ ma ọ bụ mmụọ nwere ike iji aka ya kpebie ime ihe ọjọọ mgbe o kwuru banyere Ekwensu, sị: “O guzosighịkwa ike n’eziokwu.” (Jọn 8:44) Ihe a Jizọs kwuru gosiri na onye ahụ ghọrọ Ekwensu bụbu mmụọ ozi zuru okè, o nwekwara mgbe o ‘guzosiri ike n’eziokwu.’a Ihe mere Jehova Chineke ji kee ndị mmụọ ozi na ụmụ mmadụ ka ha jiri aka ha na-ekpebi ihe ha chọrọ ime bụ na ọ hụrụ ha n’anya, obi sikwara ya ike na ha ga-eme ihe dị mma.—Gụọ igbe bụ́ “Onye Zuru Okè Ò Nwere Ike Ịghọ Onye Na-ezughị Okè?” nke dị na peeji nke 6.

◼ “Ekwensu na-arụrụ Chineke ọrụ” Ụfọdụ ndị weere na ihe a kọrọ n’akwụkwọ Job gosiri na nke a bụ eziokwu. Otu akwụkwọ na-akọwa Baịbụl sịrị na ihe ahụ e kwuru n’akwụkwọ Job, nke bụ́ na Ekwensu ‘na-awagharị n’ụwa,’ yiri ọrụ ndị nledo mba Peshia oge ochie na-arụ. Ndị eze Peshia na-ezipụ ndị nledo ka ha gaa ledooro ha ala, ha gachaa, ha ewetara ha ozi. (Job 1:7) Ma, ọ bụrụ na ọ bụ Chineke dunyere Ekwensu ozi, gịnị mere Chineke ga-eji jụwa ya ebe o si, ya azaa na ya ‘si n’ịwagharị n’ụwa’? O nweghị otú akwụkwọ Job si gosi na Ekwensu na-arụrụ Chineke ọrụ, kama nke ahụ, ihe ọ kpọrọ Ekwensu bụ Setan, nke pụtara “Onye Mmegide.” Nke a na-egosi na Ekwensu bụ onyeisi ndị iro Chineke. (Job 1:6) Oleezi otú e si malite ikwu na Ekwensu na-arụrụ Chineke ọrụ?

Ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, e nwere akwụkwọ ndị Juu ndị kọrọ na Ekwensu na Chineke na-arụrịta ụka, ma, na ọ bụ ihe Chineke chọrọ ka Ekwensu mee ka ọ na-eme. Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme nke aha ya bụ J. B. Russell kọrọ n’otu akwụkwọ ya na Martin Luther, bụ́ onye so ná ndị mere e ji nwee chọọchị Protestant, kwuru na Ekwensu bụ ngwá ọrụ Chineke ji arụ ọrụ, na ọ “dị ka mma ogè Chineke ji egbuchapụ ihe ma ọ bụ ọ́gụ̀ o ji abọ ahịhịa n’ubi ya.” Ọkọ akụkọ ahụ kwuru na nke a pụtara na “obi na-atọ ọ́gụ̀ ahụ ụtọ mgbe ọ na-abọ ahịhịa ahụ,” ma ebe ọ bụ na ọ́gụ̀ ahụ dị n’aka Chineke, ọ bụ uche Chineke ka ọ na-eme. Onye Frans bụ́ ọkà mmụta okpukpe, nke aha ya bụ John Calvin, mechara kwere ihe ahụ Luther kụziri, ma ọtụtụ ndị kwere na Chineke weere na ihe ahụ o kwuru adịghị mma. Ha sịrị, Olee otú Chineke nke hụrụ ụmụ mmadụ n’anya ga-esi ekwe ka ihe ọjọọ na-eme ma jirikwa aka ya na-akpata ya? (Jems 1:13) Nkụzi a nakwa ihe ọjọọ niile mere kemgbe ihe dị ka otu narị afọ gara aga na-eme ka ọtụtụ ndị kwere na Chineke na Ekwensu adịghị.

◼ “Ekwensu bụ ihe ọjọọ dị n’obi mmadụ” Ọ bụrụ na anyị ekwere na Ekwensu bụ ihe ọjọọ dị n’obi mmadụ, ọ ga-esiri anyị ike ịghọta amaokwu ụfọdụ dị na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, n’ihe a kọrọ na Job 2:3-6, ònye ka ya na Chineke nọ na-ekwu okwu? Ọ̀ bụ ihe ọjọọ dị Job n’obi ka Chineke na-agwa okwu, ka ọ̀ bụ onwe ya ka ọ na-agwa? Ihe ọzọkwa bụ, Chineke ọ̀ ga-ekwucha na Job bụ ezigbo mmadụ ma hapụ Job ka ihe ọjọọ dị ya n’obi bịa nwaa ya ọnwụnwa? Ịsị na Chineke na-eme ihe dị otú ahụ bụ ikwu na Chineke bụ Onye arụrụala, ọ bụghị onye “na-adịghị eme ajọ omume.” (Abụ Ọma 92:15) Chineke gosiri na ọ bụghị onye ajọ omume n’ihi na ọ jụrụ ‘ịmatị aka ya’ mee Job ihe ọjọọ. N’eziokwu, Ekwensu abụghị ihe ọjọọ dị n’obi mmadụ ma ọ bụ ihe ọjọọ dị n’obi Chineke, kama ọ bụ mmụọ ozi nke mechara mee onwe ya Onye iro Chineke.

Ònye n’Eziokwu Na-achị Ụwa A?

Taa, ọ bụrụ na mmadụ kweere na Ekwensu dị, ọtụtụ ndị na-ewere na onye ahụ amaghị nke a na-akọ. Ma n’ime ndị niile na-ekwu na Ekwensu adịghị, o nwebeghị onye kọwara ihe doro anya banyere ihe mere ihe ọjọọ ji ju n’ụwa. Nke bụ́ eziokwu bụ na ikwu na Ekwensu adịghị emeela ka ndị mmadụ werezie na Chineke adịghị ma kpawa àgwà otú sọrọ ha.

Otu nwoke na-ede uri, nke aha ya bụ Charles-Pierre Baudelaire, dere, sị: “Ụzọ kacha njọ Ekwensu si aghọgbu anyị bụ ime ka anyị chewe na ya adịghị.” Otú a Ekwensu si mee ka ndị mmadụ chee na ya adịghị emeela ka ndị mmadụ chewe na Chineke adịghịkwa. Ọ bụrụ na Ekwensu adịghị, ihe ọ pụtara bụ na ọ bụ Chineke na-akpata ihe ọjọọ niile na-emenụ. Ihe a ọ́ bụghị ihe Ekwensu chọrọ?

Ekwensu na-eme ka onyeisi ndị òtù ọjọọ, ọ na-ezochi onye ọ bụ ka ndị mmadụ ghara ịmata ya. Ihe mere o ji eme ya bụ ka o nwee ike mezuo ihe ọ chọrọ. Gịnị bụ ihe ahụ ọ chọrọ? Baịbụl sịrị: ‘Chi nke usoro ihe a emewo ka uche ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì, ka ìhè nke ozi ọma ahụ dị ebube banyere Kraịst, onye bụ́ onyinyo Chineke, wee ghara inwukwasị ha.’—2 Ndị Kọrịnt 4:4.

A ka nwere otu ajụjụ dị mkpa. Gịnị ka Chineke ga-eme onye ahụ na-ezoro ezoro akpata nsogbu na ahụhụ niile? Anyị ga-eleba nke a anya n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọta ihe mere na Chineke egbughị Ekwensu ozugbo o nupụụrụ ya isi, gụọ isi nke 11 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

Ekwensu ọ̀ na-arụrụ Chineke ọrụ ka ọ̀ bụ onye iro Chineke?

[Igbe/​Foto dị na peeji nke 6]

Onye Zuru Okè Ò Nwere Ike Ịghọ Onye Na-ezughị Okè?

Na Chineke kere ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi ka ha zuo okè apụtaghị na o nweghị iwu ji ha. N’agbanyeghị na Adam zuru okè, o nwere iwu ụfọdụ o kwesịrị idebe. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na Adam ataa ájá ma ọ bụ okwute ma ọ bụ osisi, ọ ga-enyerịrị ya nsogbu n’ahụ́. Ọ maara na ọ bụrụ na ya esi n’ugwu dị elu wụpụ, na ya ga-anwụ ma ọ bụkwanụ merụọ ezigbo ahụ́ n’ihi na ihe ọ bụla si n’elu na-ada ga-erurịrị ala.

Otú ahụ ka ọ dịkwa iwu ndị ọzọ Chineke nyere. Ọ bụrụ na onye zuru okè, ma mmadụ ma mmụọ ozi, emee omume ọjọọ ọ bụla, ọ ga-ebutere onwe ya nsogbu. N’ihi ya, ọ bụrụ na mmadụ ma ọ bụ mmụọ ozi zuru okè ekpebie ime ihe ọ na-ekwesịghị ime, ọ na-aghọ onye mmehie.—Jenesis 1:29; Matiu 4:4.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya