Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w11 9/1 p. 16-17
  • Olee Otú I Nwere Ike Isi Bịaruo Chineke Nso?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú I Nwere Ike Isi Bịaruo Chineke Nso?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Otú Ị Ga-esi Bịaruo Chineke Nso?
    Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
  • Otú Ị Pụrụ Isi Bịaruo Chineke Nso
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Ịbịaru Chineke Nso n’Ekpere
    Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
  • Chineke Meere Anyị Ihe Ọma Kwe Ka Anyị Na-ekpegara Ya Ekpere
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
w11 9/1 p. 16-17

Mụta Ihe N’okwu Chineke

Olee Otú I Nwere Ike Isi Bịaruo Chineke Nso?

Isiokwu a jụrụ ajụjụ ndị o nwere ike ịbụ na ị jụọla, ọ ga-egosikwa gị ebe ndị i nwere ike ịgụ na Baịbụl gị ga-aza gị ajụjụ ndị ahụ. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ ịkọwara gị azịza ha.

1. Chineke ọ̀ na-anụ ekpere niile?

Jehova chọrọ ka mmadụ niile bịaruo ya nso. Otú ha ga-esi eme ya bụ ikpegara ya ekpere. (Abụ Ọma 65:2) Ma, ọ bụghị ekpere niile ka ọ na-anụ. Dị ka ihe atụ, mgbe ụmụ Izrel kpọchiri ntị na-eme ihe ọjọọ, Chineke egeghị ntị n’ekpere ha. (Aịzaya 1:15) Ọ bụrụ na nwoke na-emegbu nwunye ya, Chineke agaghị anụ ekpere ya. (1 Pita 3:7) Ma, Chineke na-anụ ekpere nke ndị mere mmehie dị oké njọ ma ha chegharịa.—Gụọ 2 Ihe E Mere 33:9-13.

2. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ekpe ekpere?

Ekpere bụ ihe ùgwù, ọ bụkwa otu ụzọ anyị si efe Chineke, n’ihi ya, ọ bụ naanị Jehova ka anyị kwesịrị ikpegara ekpere. (Matiu 4:10; 6:9) Ebe anyị bụ ndị na-ezughị okè, anyị enweghị ike ịbịakwute Chineke n’onwe anyị. N’ihi ya, anyị kwesịrị ikpegara Chineke ekpere n’aha Jizọs ebe Jizọs bụ “ụzọ” Chineke gwara anyị ka anyị si na-abịakwute ya. (Jọn 14:6) Jehova achọghị ka ekpere anyị bụrụ nke anyị bu n’isi ma ọ bụ nke e dere n’akwụkwọ, kama ọ chọrọ ka anyị na-agwa ya ihe si anyị n’obi.—Gụọ Matiu 6:7; Ndị Filipaị 4:6, 7.

Onye kere anyị na-anụdị ekpere anyị kpere n’ime obi. (1 Samuel 1:12, 13) Ọ gwara anyị ka anyị na-ekpe ekpere mgbe niile, dị ka mgbe anyị tetara n’ụra, mgbe anyị chọrọ ịlaba, mgbe anyị chọrọ iri nri, nakwa mgbe nsogbu bịaara anyị.—Gụọ Abụ Ọma 55:22; Matiu 15:36.

3. Gịnị mere Ndị Kraịst ji ezukọta n’ụlọ nzukọ ha?

Ịbịaru Chineke nso adịghị mfe n’ihi na anyị bi n’ụwa ebe ọtụtụ ndị na-ekweghị na Chineke. A gwa ha na Chineke kwere nkwa iweta udo n’ụwa, ha na-ewere ya mere ihe ọchị. (2 Timoti 3:1, 4; 2 Pita 3:3, 13) N’ihi ya, ọ dị mkpa ka Ndị Kraịst na-ezukọ ka ha wee na-agba ibe ha ume.—Gụọ Ndị Hibru 10:24, 25.

I nwere ike ịbịaru Chineke nso ma i meta ndị hụrụ Chineke n’anya enyi. Ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova ga-eme ka okwukwe gị sikwuo ike n’ihi na ị ga-ahụ ndị ọzọ nwere okwukwe na Jehova ma ị gaa ya.—Gụọ Ndị Rom 1:11, 12.

4. Olee otú anyị nwere ike isi bịaruo Chineke nso?

Ihe ga-enyere gị aka ịbịaru Jehova nso bụ ichebara ihe ndị ị na-amụta n’Okwu Chineke echiche. Ihe ndị ị ga-echebara echiche bụ ihe ndị ọ na-eme, ntụziaka ndị ọ na-enye, na nkwa ndị o kwere. Ikpe ekpere ma chebara ihe ndị a echiche ga-eme ka i jiri obi gị niile hụ Chineke n’anya, meekwa ka ị mata na i kwesịrị ige ya ntị.—Gụọ Jọshụa 1:8; Abụ Ọma 1:1-3.

Ị ga-abịaru Chineke nso ma ọ bụrụ na ị tụkwasị ya obi ma nwee okwukwe n’ebe ọ nọ. Ma, okwukwe yiri ihe dị ndụ nke e kwesịrị ilekọta anya. I kwesịrị ịna-echebara ihe ndị i kweere echiche, nke a ga-eme ka okwukwe gị na-esikwu ike.—Gụọ 1 Ndị Tesalọnaịka 5:21; Ndị Hibru 11:1, 6.

5. Olee uru ịbịaru Chineke nso ga-abara gị?

Jehova ejighị ndị hụrụ ya n’anya egwuri egwu. Ọ na-echebe ha ka ha ghara ịdaba n’ihe ọ bụla nwere ike imebi okwukwe ha ma mee ka ha ghara inweta ndụ ebighị ebi. (Abụ Ọma 91:1, 2, 7-10) Ọ na-adọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara ibi ụdị ndụ nwere ike ịkpatara anyị ọrịa ma ọ bụ nke ga-eme ka anyị ghara inwe obi ụtọ ná ndụ. Jehova na-akụziri anyị ụzọ kacha mma isi bie ndụ.—Gụọ Abụ Ọma 73:27, 28; Jems 4:4, 8.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere ihe a kọrọ n’isiokwu a, gụọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? isi nke 17 nke akwụkwọ a Ndịàmà Jehova bipụtara.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya