Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w11 12/1 p. 16-17
  • Olee Otú Anyị Nwere Ike Isi Mete Ezigbo Ndị Enyi?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú Anyị Nwere Ike Isi Mete Ezigbo Ndị Enyi?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Saa Anya ná Mmiri ma A Bịa n’Ụdị Ndị Ị Na-emete Enyi
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Ị Ga-abụli Enyi Jehova
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Hụ Ndị Chineke Hụrụ n’Anya n’Anya
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Olee Otú M Ga-esi Emeta Ezigbo Ndị Enyi?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
w11 12/1 p. 16-17

Mụta Ihe N’okwu Chineke

Olee Otú Anyị Nwere Ike Isi Mete Ezigbo Ndị Enyi?

Isiokwu a jụrụ ajụjụ ndị o nwere ike ịbụ na ị jụọla, ọ ga-egosikwa gị ebe ndị i nwere ike ịgụ na Baịbụl gị ga-aza gị ajụjụ ndị ahụ. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ ịkọwara gị azịza ha.

1. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị saa anya ná mmiri mgbe anyị na-ahọrọ ndị ga-abụ enyi anyị?

Ọtụtụ n’ime anyị na-achọ ka ha na ndị ọzọ dịrị ná mma. Nke a na-emekarị ka anyị na-achọ ịdị ka ndị ibe anyị. Ọ na-abụkarịkwa otú ndị enyi anyị si akpa àgwà ka anyị si akpa. N’ihi ya, ụdị ndị anyị na-emete enyi nwere ike ikpebi ụdị ndị anyị ga-abụ.—Gụọ Ilu 4:23; 13:20.

Devid, bụ́ onye so dee Baịbụl, sara anya ná mmiri họrọ ndị enyi ya. Ndị o metere enyi bụ ndị nyeere ya aka ịnọgide na-erubere Chineke isi. (Abụ Ọma 26:4, 5, 11, 12) Dị ka ihe atụ, Devid na Jọnatan bụ enyi n’ihi na Jọnatan nyeere ya aka ịtụkwasị Jehova obi.—Gụọ 1 Samuel 23:16-18.

2. Olee otú ị ga-esi bụrụ enyi Chineke?

Ọ bụ eziokwu na Jehova bụ onye kacha ihe niile elu, anyị nwere ike ịbụ enyi ya. Dị ka ihe atụ, Ebreham ghọrọ enyi Chineke. Ebreham tụkwasịrị Jehova obi ma rubere ya isi, n’ihi ya, Jehova kpọrọ ya enyi ya. (Jenesis 22:2, 9-12; Jems 2:21-23) Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi ma na-eme ihe o kwuru, anyị ga-aghọkwa ndị enyi Chineke.—Gụọ Abụ Ọma 15:1, 2.

3. Olee otú ezigbo ndị enyi ga-esi abara gị uru?

Ndị bụ́ ezigbo ndị enyi gị ga na-enyere gị aka ime ihe dị mma, ha agaghịkwa ahapụ gị mgbe ị nọ ná nsogbu. (Ilu 17:17; 18:24) Dị ka ihe atụ, n’agbanyeghị na Jọnatan ji ihe dị ka afọ iri atọ tọọ Devid, n’agbanyeghịkwa na ọ bụ ya kwesịrị ịbụ eze Izrel ma nna ya chịchaa, o ji obi ya niile kwadoo Devid, bụ́ onye Chineke họpụtara ka ọ bụrụ eze. Ndị bụ́ ezigbo ndị enyi gị ga-akata obi gwa gị na ihe ị na-eme adịghị mma ma ha hụ ka ị na-eme ihe ọjọọ. (Abụ Ọma 141:5) Ọ bụrụ na ndị enyi gị hụrụ Chineke n’anya, ha ga-enyere gị aka ka ị kpawa àgwà ọma.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:33.

Ị gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova, ị ga-ahụ ndị na-agbalị ime ihe ọma otú ahụ ị na-agbalị ime. Ị ga-enwetakwa ndị enyi ndị ga-enyere gị aka ime ihe dị Chineke mma.—Gụọ Ndị Hibru 10:24, 25.

Ma mgbe ụfọdụ, ndị enyi gị ndị hụrụ Chineke n’anya nwere ike ime ihe ga-ewute gị. Ekwela ka nke ahụ kpasuo gị iwe. (Ekliziastis 7:9, 20-22) Cheta na o nweghị onye n’ime ha zuru okè, ma ebe ọ bụ na ha hụrụ Chineke n’anya, ha baara gị uru. Baịbụl gwara anyị ka anyị na-agbaghara Ndị Kraịst ibe anyị ma ha mejọọ anyị.—Gụọ Ndị Kọlọsi 3:13.

4. Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ndị sịrị na ha bụ ndị enyi gị ebido imegide gị?

Mgbe ọtụtụ ndị malitere ịmụ Okwu Chineke, ndị bụ́bu ndị enyi ha bidoro imegide ha. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, o nwere ike ịbụ na ndị enyi gị ahụ amaghị uru ihe ndị ị na-amụta na Baịbụl na-abara gị, ma ọ bụkwanụ na ha amaghị nkwa ndị Chineke kwere na Baịbụl bụ́ ndị ga-emezu n’oge na-adịghị anya. Ma, i nwere ike inyere ha aka.—Gụọ Ndị Kọlọsi 4:6.

Ndị sịrị na ha bụ ndị enyi gị nwekwara ike iji ihe ndị e dere na Baịbụl na-eme ihe ọchị. (2 Pita 3:3, 4) Ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịna-achị gị ọchị maka na ị na-agbalị ime ihe dị mma. (1 Pita 4:4) Ọ bụrụ na nke a emee, ọ ga-adị mkpa ka i kpebie ma ọ̀ bụ Chineke ka ị ga-achọ ka ọ bụrụ enyi gị ka ọ̀ bụ ndị ahụ sịrị na ha bụ ndị enyi gị. Ọ bụrụ na ọ bụ Chineke ka ị họọrọ ka ọ bụrụ enyi gị, mara na i nwetala enyi kacha mma mmadụ nwere ike inwe.—Gụọ Jems 4:4, 8.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere ihe a kọrọ n’isiokwu a, gụọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? isi nke 12 na nke 19 nke akwụkwọ a Ndịàmà Jehova bipụtara.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya