Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w12 1/1 p. 5-6
  • Ebreham Nwoke Nwere Okwukwe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ebreham Nwoke Nwere Okwukwe
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ònye Bụ Ebreham?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Jehova Kpọrọ Ya “Enyi M”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Chineke Elee Okwukwe Ebreham Ule
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Ebreham na Sera Rubeere Chineke Isi
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
w12 1/1 p. 5-6

Ebreham Nwoke Nwere Okwukwe

Otu abalị, Ebreham guzo n’èzí lelie anya elu, na-ele kpakpando juru eluigwe ma na-eche banyere nkwa Chineke kwere ya nke bụ́ na mkpụrụ ya ga-adị ọtụtụ ka kpakpando ndị ahụ. (Jenesis 15:5) Kpakpando ndị ahụ na-echetara ya nkwa Jehova kwere ya. Ha na-emekwa ka obi sie ya ike na Jehova ga-emezu nkwa ya. A sị ka e kwuwe, ebe ọ bụ Jehova kere eluigwe na ụwa na ihe niile dị n’ime ha, ọ̀ bụ na ọ gaghị emeli ka ya na nwunye ya, bụ́ Sera, mụta nwa? N’eziokwu, Ebreham kwenyesiri ike na Chineke ga-emezu nkwa ya.

GỊNỊ BỤ OKWUKWE? Na Baịbụl, okwukwe pụtara mmadụ ikwere n’ihe ọ na-anaghị ahụ anya n’ihi na e nwere ezigbo ihe mere o ji kwere n’ihe ahụ. Onye nwere okwukwe na Chineke na-elekwasị anya n’otú Chineke ga-esi emezu nkwa ndị o kwere, obi na-esikwa ya ike na Chineke ga-emezurịrị ha.

OLEE OTÚ EBREHAM SI GOSI NA YA NWERE OKWUKWE? Ebreham gosiri na ya kweere na Chineke ga-emezu nkwa ya. N’ihi okwukwe Ebreham nwere, ọ hapụrụ obodo a mụrụ ya, obi sikwara ya ike na Jehova ga-emezu nkwa Ya nke bụ́ igosi ya ala ebe ọ ga-akwaga. Ọ bụ okwukwe Ebreham mere o ji gagharịa n’ala Kenan, obi esiekwa ya ike na ụmụ ya ga-emecha biri n’ala ahụ. Ọ bụkwa okwukwe ya mere o ji chọọ ịchụ nwa ya n’àjà mgbe Jehova gwara ya mee otú ahụ, obi sikwara ya ike na Jehova ga-akpọlite Aịzik n’ọnwụ ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa.—Ndị Hibru 11:8, 9, 17-19.

Ebreham lekwasịrị anya n’ihe ndị dị n’ihu, ọ bụghị n’ihe ndị ọ hapụrụ. O nwere ike ịbụ na ihe dịịrị Ebreham na Sera mma na Ọọ karịa ka ọ dịịrị ha na Kenan, ma ha anọghị “na-echeta ebe ahụ ha si pụọ.” (Ndị Hibru 11:15) Kama nke ahụ, ha nọ na-echeta otú Chineke ga-esi gọzie ha na ụmụ ha n’ọdịnihu.—Ndị Hibru 11:16.

Okwukwe ahụ Ebreham nwere na Chineke ọ̀ ghọrọ ya ahịa? Mbanụ! Jehova mezuru nkwa niile o kwere Ebreham. Ụmụ Ebreham mechara mụbaa ghọọ mba a na-akpọ Izrel. Ndị Izrel mechara biri na Kenan, bụ́ ala Jehova kwere Ebreham nkwa na ọ ga-enye ya.—Jọshụa 11:23.

GỊNỊ KA ANYỊ NA-AMỤTA N’AKA YA? Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-emezu nkwa niile o kwere. Ọ bụrụgodị na ụfọdụ n’ime nkwa ndị ahụ yiri ihe na-agaghị ekwe omume, anyị kwesịrị icheta na “n’ebe Chineke nọ, ihe niile kwere omume.”—Matiu 19:26.

Ihe ọzọ anyị nwere ike ịmụta n’aka Ebreham bụ na anyị ekwesịghị ịnọ na-eche banyere otú ihe si dịrị anyị mma na mbụ, kama anyị kwesịrị ịna-echeta ihe ọma ndị anyị ga-enweta n’ọdịnihu. Ọ bụ ihe a ka otu nwoke aha ya bụ Jason mụtara. Jason na-arịa ọrịa nke mere ka ahụ́ ya kpọnwụọ. Ọ sịrị: “N’eziokwu, o nwere mgbe m na-echeta mgbe ahụ́ dị m mma. Ihe kacha ewute m bụ ụmụ obere ihe ndị m na-anaghị enwezi ike ime ugbu a, dị ka ịmakụ nwunye m bụ́ Amanda.”

Ma, Jason nwere nnọọ okwukwe na Jehova ga-emezu nkwa niile o kwere, ma nkwa ya nke bụ́ ime ka ụwa bụrụ paradaịs ebe ndị ezi omume ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi, mgbe a na-agaghị enwekwa onye ga-arịa ọrịa.a (Abụ Ọma 37:10, 11, 29; Aịzaya 35:5, 6; Mkpughe 21:3, 4) Jason sịrị: “M na-echetara onwe m na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu.” O kwukwara, sị: “Nsogbu m niile ga-akwụsị n’oge na-adịghị anya, . . . . ha niile ga-aghọ ihe akụkọ.” Jason nwere nnọọ okwukwe yiri nke Ebreham!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu otú ụwa ga-esi ghọọ paradaịs n’ọdịnihu, gụọ isi nke 3, nke 7, na nke 8 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya