Ndị Kraịst Taa Hà Kwesịrị Itinye Aka na Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị?
EZIGBO Ndị Kraịst taa anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha na-eṅomi Jizọs. Jizọs kwuru na ya “abụghị nke ụwa.” O kwukwara banyere ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu abụghị nke ụwa.” (Jọn 15:19; 17:14) Ka anyị tụlee ihe ụfọdụ mere na Ndị Kraịst ekwesịghị itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
1. E nwere ihe ụmụ mmadụ na-agaghị emeli. Baịbụl kwuru na ụmụ mmadụ agaghị achịli onwe ha, nakwa na e keghị ha ka ha na-achị onwe ha. Jeremaya onye amụma dere, sị: “Ọ dịrịghị mmadụ nke na-eje ije ọbụna iduzi nzọụkwụ ya.”—Jeremaya 10:23.
Otú ahụ Chineke na-ekeghị ndị mmadụ ka ha na-efe efe ka nnụnụ, ọ bụkwa otú ahụ ka ọ na-ekeghị ha ka ha na-achị ibe ha. N’akwụkwọ bụ́ The Question of Government, ọkọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ David Fromkin kwuru ihe ọchịchị ụmụ mmadụ na-agaghị emeli. Ọ sịrị: “Ndị ọchịchị bụ mmadụ nkịtị; ha nwere ike imehie ihe, e kwesịghịkwa ịtụkwasị ha obi na ha ga-eme ihe niile ha kwere nkwa na ha ga-eme n’ọdịnihu. Ha nwetụrụ ikike, ma ikike ha enweghị ebe o ruru.” Ọ bụ ya mere Baịbụl ji gwa anyị ka anyị ghara ịtụkwasị mmadụ obi!—Ọma 146:3.
2. Ndị mmụọ ọjọọ na-atụrụ ndị ọchịchị ihe ndị ha na-eme. Mgbe Setan gwara Jizọs na ya ga-enye ya alaeze niile nke ụwa, Jizọs ma na Ekwensu ga-emeli ya. Jizọs mechara kpọọ Setan “onye na-achị ụwa.” Mgbe afọ ole na ole gafere, Pọl onyeozi kpọrọ Setan “chi nke usoro ihe a.” (Jọn 14:30; 2 Ndị Kọrịnt 4:4) N’akwụkwọ ozi Pọl degaara Ndị Kraịst ibe ya, ọ sịrị ha: “Anyị nwere mgba . . . megide ndị na-achị ụwa nke ọchịchịrị a, megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ n’ebe ndị dị n’eluigwe.” (Ndị Efesọs 6:12) Ndị mmadụ amaghị na ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ na-achị ụwa a. Ugbu a anyị matara na ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ na-achị ụwa, ànyị kwesịrị itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị?
Were dị ka ihe atụ: Oké ifufe na-eburu obere ụgbọ gawa ebe masịrị ya n’oké osimiri. Otú ahụ ka ọ dịkwa ọchịchị ụmụ mmadụ. Ndị mmụọ ọjọọ, bụ́ ndị dị ike, na-ebugharị ha ka ebe ifufe na-ebugharị obere ụgbọ mmiri, na-atụrụ ha ihe ha ga-eme. Otú ahụ ndị na-akwọ ụgbọ mmiri na-agaghị akwụsịli oké ifufe na-ebugharị ụgbọ ha, ndị ọchịchị enweghị ike ịkwụsili ndị mmụọ ọjọọ ịtụrụ ha ihe ha na-eme. Ndị mmụọ ọjọọ kpebisiri ike ime ka ụmụ mmadụ na-eme naanị ihe ọjọọ, ha kpebisikwara ike ịkpatara ‘ụwa ahụhụ.’ (Mkpughe 12:12) N’ihi ya, ọ bụ naanị onye ka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ike ga-anapụta ụmụ mmadụ. Onye ahụ bụ Jehova Chineke.—Abụ Ọma 83:18; Jeremaya 10:7, 10.
3. Ezigbo Ndị Kraịst na-akwado naanị Alaeze Chineke. Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya ma na Chineke nwere oge o bu n’obi ọ ga-abụ ya ruo ọchịchị ya amalite n’eluigwe. Ọ ga-esi n’ebe ahụ na-achị ụwa niile. Baịbụl kpọrọ ọchịchị a Alaeze Chineke. O kwukwara na Chineke họpụtara Jizọs Kraịst ka ọ bụrụ Eze nke Alaeze ahụ. (Mkpughe 11:15) Ebe ọ bụ na Alaeze ahụ ga-abara ụmụ mmadụ uru, ihe Jizọs kacha zie ndị mmadụ bụ “ozi ọma alaeze Chineke.” (Luk 4:43) Ọ kụzikwaara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa.” Ọ̀ bụ maka gị? Ọ bụ maka na ọ bụrụ na Alaeze Chineke abịa, uche Chineke ga na-eme ma n’eluigwe ma n’ụwa.—Matiu 6:9, 10.
Oleezi ihe ga-eme ọchịchị ụmụ mmadụ? Baịbụl kwuru na a ga-ebibi ọchịchị niile e nwere ‘n’elu ụwa dum mmadụ bi.’ (Mkpughe 16:14; 19:19-21) Ọ bụrụ na mmadụ kwetara n’eziokwu na Alaeze Chineke ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ n’oge na-adịghị anya, o kwesịghị itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ bụrụ na onye ahụ na-akwado ọchịchị ụmụ mmadụ nke a ga-ebibi n’oge na-adịghị anya, ọ pụtara na ọ na-emegide Chineke.
Ebe ọ bụ na ezigbo Ndị Kraịst anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọ̀ pụtara na ha anaghị eme ihe ga-abara ndị obodo ha uru? Anyị ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 7]
Ndịàmà Jehova na-eme ihe ndị na-egosi na ha na-akwado Alaeze Chineke, ọ bụghị ịgbawa mbọ ka a gbanwee ihe n’ọchịchị