Ihe Ndị A Kọrọ na Ya Mere Eme, Ha Abụghị Akụkọ Ifo
“Esi m ná mmalite nyochaa ihe niile n’ụzọ ziri ezi.” —LUK 1:3.
IHE MERE BAỊBỤL JI DỊ ICHE: Mgbe ọ bụla a na-akọ akụkọ ifo, ihe a na-ekwukarị bụ ‘O nwere otu mgbe.’ A naghị ekwu ebe ihe a na-akọ akụkọ ya mere, oge o mere, na ndị nọ mgbe o mere. Ma, ihe ndị a kọrọ na Baịbụl dị iche n’ihi na e kwuru ebe ha mere, oge ha mere, na ndị nọ mgbe ha mere. Nke a na-eme ka obi sie ndị na-agụ Baịbụl ike na ‘ihe niile e kwuru na ya bụ eziokwu.’—Abụ Ọma 119:160.
IHE GOSIRI NA IHE A KỌRỌ NA BAỊBỤL ABỤGHỊ AKỤKỌ IFO: Baịbụl kwuru na ‘Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn dọọrọ Jehoyakin bụ́ eze Juda n’agha laa Babịlọn.’ Baịbụl kwukwara na ‘n’afọ Ivil-merodak ghọrọ eze Babịlọn, ọ kpọpụtara Jehoyakin eze Juda wee mee ka o si n’ụlọ mkpọrọ pụta.’ A na-esikwa “n’ihe eze nwere enye [Jehoyakin] ihe mgbe niile, kwa ụbọchị dị ka o kwesịrị, n’ụbọchị niile nke ndụ ya.”—2 Ndị Eze 24:11, 15; 25:27-30.
IHE NDỊ NA-AMỤ BANYERE IHE NDỊ MGBE OCHIE CHỌPỤTARA: Ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie egwupụtala ihe ndị e dere ede bụ́ ndị kọrọ banyere ọchịchị Babịlọn. Ọ bụ ihe ndị mere n’oge Nebukadneza nke Abụọ na-achị Babịlọn ka e dere n’ihe ndị ahụ. E gwupụtara ha n’ebe obodo Babịlọn oge ochie dịbu. Ụfọdụ ihe ndị e dere na ha bụ otú e si enye ndị mkpọrọ nakwa ndị ọzọ eze na-akpa afọ ha nri. E dekwara na “Yaukin [ya bụ, Jehoyakin],” bụ́ “eze obodo Yahud (ya bụ, Juda),” na ezinụlọ ya so ná ndị ahụ eze na-enye nri. Ma ọ̀ bụ eziokwu na e nwere onye a kpọrọ Ivil-merodak, bụ́ onye nọchiri Nebukadneza? Ihe e dere n’ite a hụrụ n’ebe dị nso n’obodo Susa kwuru banyere Ivil-merodak. Ihe e dere na ya bụ: “Obí Amil-Maduk [ya bụ, Ivil-merodak], Eze Babịlọn, nwa Nebukadneza bụ́ Eze Babịlọn.”
GỊNỊ KA I CHERE? E wezụga Baịbụl, è nwere akwụkwọ ọzọ e weere na ọ bụ akwụkwọ dị nsọ nke kọrọ ihe ndị mere n’oge ochie, e mechaa chọpụta na ihe ndị ahụ ọ kọrọ mere otú ahụ o si kọọ ha? Ka ì chere na Baịbụl dị iche?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]
“N’ime akwụkwọ niile kọrọ ihe ndị mere n’oge ochie, ọ bụ Baịbụl kacha kọọ nke bụ́ eziokwu.”—AKWỤKWỌ BỤ́ A SCIENTIFIC INVESTIGATION OF THE OLD TESTAMENT, NKE ROBERT D. WILSON DERE
[Foto dị na peeji nke 5]
Ihe ndị Babịlọn dere nke kpọrọ aha Jehoyakin bụ́ eze Juda
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 5]
© bpk, Berlin/Vorderasiatisches Museum, SMB/Olaf M. Tessmer/Art Resource, NY