Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w12 10/1 p. 3-4
  • Ò Nwere Ebe Nrụrụ Aka Na-adịghị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ò Nwere Ebe Nrụrụ Aka Na-adịghị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nkwa nke Ụwa Omume Rụrụ Arụ Na-adịghị Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Iji Mma Agha nke Mmụọ Nsọ Alụso Nrụrụ Aka Ọgụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • N’ihi Gịnị Ka E Ji Nwee Nnọọ Oké Nrụrụ Aka?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Otú Ndị Ọchịchị Si Arụrụ Aka Na-akpa Ụwa Aka Ọjọọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
w12 10/1 p. 3-4

Ò Nwere Ebe Nrụrụ Aka Na-adịghị?

“Ụlọ ọrụ anyị na-arụrụ otu ụlọ ọrụ gọọmenti ime obodo ọrụ. Ọtụtụ mgbe, anyị na-echere ruo ọnwa abụọ ma ọ bụ atọ tupu ha akwụọ anyị ụgwọ ihe ndị anyị rụụrụ ha. Ma na nso nso a, otu onye na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ gọọmenti ahụ kpọrọ m n’ekwentị. Ọ gwara m na ya ga-eme ka a kwụọ anyị ụgwọ ahụ ọsọ ọsọ ma ọ bụrụ na anyị ga-esi na ya nye ya ego aka azụ.”—JOHN.a

ÒNWETỤLA mgbe mmadụ ibe gị rigburu gị? O nwere ike ịbụ na otú onye ahụ si rigbuo gị dị iche na nke a e kwuru n’elu. Ma, o doro anya na mmegbu ndị mmadụ na-emegbu ibe ha akpatatụrụla gị nsogbu.

N’afọ 2011, Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Igbochi Nrụrụ Aka n’Ụwa bipụtara otu akwụkwọ nke gosiri ihe ndị ha chọpụtara n’otu narị mba na iri asatọ na atọ. Akwụkwọ ahụ kwuru na “nrụrụ aka akpaala ọtụtụ mba ndị ahụ aka ọjọọ.” N’akwụkwọ nke ha bipụtara n’afọ 2009, ha kwuru, sị: “O doro anya na o nweghị mba ị gara n’ụwa nrụrụ aka na-adịghị.”

Mgbe ụfọdụ, nrụrụ aka na-akpatara ndị mmadụ nsogbu dị oké njọ. Dị ka ihe atụ, magazin a na-akpọ Time kwuru na ihe so mee ka ọtụtụ ndị nwụọ mgbe ala ọma jijiji mere ná mba Heiti n’afọ 2010 bụ “nrụrụ aka na ejighị ihe kpọrọ ihe.” Magazin ahụ kwukwara, sị: “Ndị mmadụ na-ewu ụlọ aghara aghara. Ha anaghị ajụta ndị ọkachamara n’iwu ụlọ otú ha kwesịrị isi wuo ụlọ ha ha adị mma, o nwekwanụghị onye na-enye ha nsogbu maka na ha na-eji ego emechi ndị ọrụ gọọmenti ọnụ.”

Ò nwere ihe ga-eme ka nrụrụ aka a juru ebe niile kwụsị? Tupu anyị azaa ajụjụ a, ka anyị burugodị ụzọ leba anya n’ihe ndị mere nrụrụ aka ji ju ebe niile. Anyị ga-eleba ha anya n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Aha a a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]

“Nrụrụ aka bụ mmadụ iji ọkwá e nyere ya na-achọ ihe ga-abara naanị ya uru. Nrụrụ aka jọgburu onwe ya, o nweghị ụdị nsogbu ọ na-anaghị akpatara ndị mmadụ.”​—Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Igbochi Nrụrụ Aka n’Ụwa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya