Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w13 5/1 p. 15
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chineke Ọ̀ Ga-agbaghara M?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Chineke nke “Dị Njikere Ịgbaghara Mmehie”
    Bịaruo Jehova Nso
  • Ọ Bụrụ na Chineke Agbaghara Mmadụ Mmehie, Ọ̀ Na-echefu Mmehie Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Jehova, Chineke nke “Na-agbaghara Mmehie”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
w13 5/1 p. 15

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Chineke ò nwere ike ịgbaghara anyị mmehie anyị?

Anyị nwere ike imeli ihe dị Chineke mma

Baịbụl kwuru na mmadụ niile bụ ndị mmehie. Anyị si n’aka nwoke mbụ bụ́ Adam keta mmehie. Ọ bụ ya mere anyị ji eme ihe ọjọọ mgbe ụfọdụ. Ọ na-abụkwa anyị mee mmehie, e mechaa, anyị akwawa mmakwaara. Ma, Ọkpara Chineke bụ́ Jizọs Kraịst nwụrụ ma si otú ahụ kwụọ ụgwọ mmehie anyị. Ọ bụ àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ mere Chineke ji na-agbaghara anyị mmehie anyị. Àjà ahụ Jizọs ji ndụ ya chụọ bụ onyinye si n’aka Chineke.—Gụọ Ndị Rom 3:23, 24.

Ụfọdụ emeela mmehie dị oké njọ, ha amaghịkwa ma Chineke ọ̀ ga-agbaghara ha. Ma, anyị nwere obi ụtọ na Baịbụl kwuru, sị: “Ọbara Jizọs bụ́ Ọkpara ya na-asachapụ anyị mmehie niile.” (1 Jọn 1:7) Jehova ga-agbaghadịrị anyị mmehie dị oké njọ anyị mere ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile chegharịa.—Gụọ Aịzaya 1:18.

Olee ihe ndị ọzọ anyị ga-eme ka Chineke gbaghara anyị mmehie anyị?

Ọ bụrụ na anyị chọro ka Jehova Chineke gbaghara anyị mmehie anyị, anyị kwesịrị ịmụ banyere ya. Ihe ọ pụtara bụ na anyị ga-aghọta otú o si eme ihe, ndụmọdụ ndị ọ na-enye anyị, na ihe ndị ọ chọrọ ka anyị na-eme. (Jọn 17:3) Jehova na-eji obiọma agbaghara ndị mere mmehie ma chegharịa ná mmehie ha.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 3:19.

Anyị nwere ike imeli ihe dị Chineke mma. Jehova ghọtara na anyị ezughị okè. Ọ na-eme ebere, dịrịkwa obiọma. Ọ̀ bụ na nke a ekwesịghị ime ka ị gbalịa mata otú i nwere ike isi na-eme uche ya?—Gụọ Abụ Ọma 103:13, 14.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya