Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w13 11/1 p. 4
  • Ụgha nke Mbụ: Chineke Enweghị Aha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụgha nke Mbụ: Chineke Enweghị Aha
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Aha Chineke
    Teta!—2017
  • Gịnị Bụ Aha Chineke?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2019
  • Otú Ị Pụrụ Isi Mara Aha Chineke
    Teta!—2004
  • Gịnị Mere O Ji Dị Mkpa Ka Anyị Na-akpọ Aha Chineke?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
w13 11/1 p. 4

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | GỊNỊ MERE O JI ESIRI ỤFỌDỤ NDỊ IKE ỊHỤ CHINEKE N’ANYA?

Ụgha nke Mbụ: Chineke Enweghị Aha

IHE ỌTỤTỤ NDỊ KWEERE

“Anyị ekwekọrịtabeghị ma ànyị kwesịrị ịkpọ Chineke aha, ma ya fọdụzie aha a ga-akpọ ya.”—Ọkachamara aha ya bụ David Cunningham kwuru ihe a n’akwụkwọ bụ́ Theological Studies.

IHE BAỊBỤL KWURU

Chineke sịrị: “Abụ m Jehova. Ọ bụ ya bụ aha m.” (Aịzaya 42:8) Aha a bụ́ Jehova bụ okwu Hibru. Ihe ọ pụtara bụ “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ.”—Jenesis 2:4.

Jehova chọrọ ka anyị na-akpọ ya aha ya. Baịbụl gwara anyị, sị: “Kpọkuonụ aha ya. Meenụ ka a mara ọrụ ya n’etiti ndị dị iche iche. Kpọsaanụ na aha ya dị elu.”—Aịzaya 12:4.

Jizọs kpọrọ aha Chineke. Mgbe Jizọs na-ekpegara Jehova ekpere, ọ sịrị ya: “Emewokwa m ka ha [ya bụ, ndị na-eso ụzọ Jizọs] mara aha gị, m ga-emekwa ka a mara ya.” Gịnị mere Jizọs ji mee ka ndị na-eso ụzọ ya mara aha Chineke? Jizọs sịrị na ọ bụ “ka ịhụnanya i [ya bụ, Chineke] nwere n’ebe m nọ wee dịrị n’ime ha, mụ na ha adịkwa n’otu.”—Jọn 17:26.

IHE MERE AHA CHINEKE JI DỊ MKPA

Otu ọkà mmụta n’ihe gbasara okpukpe, onye aha ya bụ Walter Lowrie, dere n’akwụkwọ ya, sị: “Onye na-amaghị aha Chineke amaghị onye Chineke bụ. Onye ahụ enweghịkwa ike ịhụ Chineke n’anya ma ọ bụrụ na o weere Chineke ka onye na-adịghị adị.”

Ịhapụ ịkpọ aha Chineke ma ọ bụ iwere aha ọzọ dochie ya yiri ebe mmadụ ji ihe na-achapụ aha ahụ na Baịbụl

Otu nwoke aha ya bụ Victor na-aga chọọchị kwa izu, ma ọ na-adị ya ka ya amatabeghị onye Chineke bụ. Ọ sịrị: “Ma mgbe m mụtara na aha Chineke bụ Jehova, ọ bịara dị m ka m̀ matala Chineke ahụ m nụrụla ọtụtụ ihe gbasara ya. Ọ bịara doo m anya na Chineke dị adị, mụ na ya ghọkwara enyi.”

Ọ bụrụ na anyị na-akpọ aha Jehova, anyị na ya ga-adị ná mma. O nwere nkwa Chineke kwere “ndị na-echebara aha ya echiche.” Ọ sịrị na ya ga-enwere “ha ọmịiko, dị nnọọ ka mmadụ na-enwere nwa ya nke na-ejere ya ozi ọmịiko.” (Malakaị 3:16, 17) Chineke na-agọzikwa ndị na-akpọku aha ya. Baịbụl sịrị: “Onye ọ bụla nke na-akpọku aha Jehova ka a ga-azọpụta.”—Ndị Rom 10:13.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya